Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Meksiko: Ebe Nwanna Ángel na Ismael na-amụ ịgụ mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì

IKWUSA OZI ỌMA NA ỊKỤZI IHE N’ỤWA NIILE

Amerịka na Mba Ndị Gbara Ya Gburugburu

Amerịka na Mba Ndị Gbara Ya Gburugburu
  • MBA OLE DỊ NA YA 57

  • MMADỤ OLE BI NA HA 998,254,087

  • NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA HA 4,154,608

  • MMADỤ OLE A MỤỤRỤ BAỊBỤL 4,353,152

“Mụ na Gị Ga Na-amụ Ya”

E nwere otu nwoke bi na Meksiko. Aha ya bụ Ismael. O kpebiri ịgụcha Baịbụl. N’ime otu afọ, ọ gụchara ya ugboro abụọ. Ma, o mechara kpuo ìsì. Mgbe afọ ole na ole gachara, otu Onyeàmà Jehova aha ya bụ Ángel ziri ya ozi ọma. Ọ gwara ya banyere nkwa Chineke kwere anyị. Ismael chọsiri ike ịmụtakwu banyere Chineke. Ma ọ sịrị ya: “Abụ m onye ìsì, agaghị m agụli Baịbụl.”

Nwanna Ángel sịrị ya, “Enyela onwe gị nsogbu, m ga-akụziri gị otú e si agụ mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì.”

Ismael jụrụ ya, sị: “Ị̀ ma otú e si agụ mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì?”

Nwanna Ángel sịrị ya, “Mba. Ma, mụ na gị ga na-amụ ya.” O juru Ismael anya na Nwanna Ángel ga-emere ya ụdị ihe a. Nwanna Ángel lawara ma mee nchọnchọ gbasara otú e si agụ mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì. O mechara dee mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì n’ihe dị ka katọn. Ọ maliteziri ịkụziri Ismael otú e si agụ ya. O gbughị oge, Ismael amụta otú e si agụ mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì, gawa ọmụmụ ihe, na-agụkwa akwụkwọ anyị e ji mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì dee. Ugbu a, Nwanna Ángel nwere ndị ìsì anọ ọ na-amụrụ Baịbụl. Ọ na-atọgbu ndị ìsì ahụ atọgbu ikwu gbasara Paradaịs, bụ́ mgbe ha ga-ahụ ụzọ ọzọ.

Ọ Mataghịzi Onye Ọ Bụ

E nwere otu nwanna nwaanyị dị afọ iri na anọ n’Amerịka. Aha ya bụ Viannei. O kwuru, sị: “Otu ụbọchị, mgbe otu onye nkụzi anyị na-esi esi abịa na-akụziri anyị ihe na klas, ọ malitere ikwu gbasara okpukpe. Ọ gwara anyị kpọọ aha ụfọdụ okpukpe anyị ma, mụ akpọọ Ndịàmà Jehova. Mgbe m kpọrọ Ndịàmà Jehova, ụmụ klas anyị chịrị m ọchị ma sị na Ndịàmà Jehova na-egbu ndị mmadụ oge, na anyị enweghị ọrụ, nakwa na ọ na-abụ, ha nata akwụkwọ anyị, ha etufuo ya. Onye nkụzi ahụ sokwa ha na-akatọ anyị.

“N’ihi ya, m rịọrọ Jehova ka o mee ka m kata obi zie ha ozi ọma. M gwara ụmụ klas anyị na ihe mere anyị ji abịa n’ụlọ ha abụghị ka anyị gbuo ha oge, kama, ọ bụ n’ihi na Jehova gwara anyị ka anyị jiri Baịbụl gwa ha ihe ndị ga-abara ha uru ná ndụ. M sịrị ha etufuzila akwụkwọ ndị ahụ n’ihi na ihe ndị dị na ha nwere ike ịgbanwe ndụ ha ma zọọ ha ndụ. Onye nkụzi anyị rịọrọ m ka m gbaghara ya. O kwuru na mgbe ọzọ Ndịàmà Jehova bịara izi ya ozi ọma, na ya ga-anabata ha, gee ha ntị, ma gụọ akwụkwọ anyị. Amaghị m na ọ ga-eme ihe a o kwuru.

“Mgbe ọnwa anọ gachara, ọ tụrụ m n’anya ịhụ na ya na Ndịàmà Jehova amalitela ịmụ Baịbụl. Mgbe ọnwa isii ọzọ gachara, ọ bịara chọọ m n’ụlọ akwụkwọ anyị ka o kelee m maka ozi ọma ahụ m ziri ya. Amatadịghị m ya mgbe m hụrụ ya n’ihi na ọ kpụdala isi ya, kpụọkwa afụ ọnụ ya. Ọ bụzi onye nkwusa a na-emebeghị baptizim.”

Ikwusa Ozi Ọma n’Obodo Ndị Dị n’Amazọn

N’afọ gara aga, Ndịàmà Jehova nọ na Brazil gara n’ọtụtụ ebe ndị mmadụ bi n’Amazọn kwusaa ozi ọma. Ọtụtụ ndị bi n’obodo ndị ahụ anụtụbeghị ozi ọma. Ọ bụ ya mere Òtù Na-achị Isi ji hazie ka e mee mkpọsa pụrụ iche n’ime ime obodo ndị dị n’Amazọn. Mkpọsa a ga-ewe otu afọ. Nke a ga-eme ka e zie ọtụtụ puku mmadụ bi n’ụfọdụ ebe ndị ahụ ozi ọma.

Brazil: Ebe ụmụnna na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’Amazọn

Alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Brazil họọrọ obodo iri ise na atọ dị n’ebe dị iche iche a na-esi ná mmiri Amazọn aga ka a gaa kwusaara ha ozi ọma. Naanị n’ime ọnwa anọ amalitere mkpọsa ahụ, ihe karịrị puku ụmụnna isii na narị ise wepụtara onwe ha gaa ebe ndị ahụ zie ozi ọma.

Ụmụnna iri nọrọ abalị iri na otu n’otu ime ime obodo a na-akpọ Anamã. E nweghị Onyeàmà Jehova ọ bụla bi ebe ahụ. Ụmụnna ndị a nyefere akwụkwọ karịrị puku iri na abụọ na narị ise, malitekwa ịmụrụ ihe ruru narị mmadụ abụọ Baịbụl. Ha na-ejizi ekwentị amụrụ ha Baịbụl. Mgbe ụmụnna ndị a nọ ebe ahụ, ha hazikwara ka e nwee ọmụmụ ihe. N’ọmụmụ ihe ikpeazụ ha nwere tupu ha alaa, mmadụ iri itoolu bịara. Obi tọrọ ụmụnna ndị a ezigbo ụtọ. Anyị ka ga-ahụkwu uru mkpọsa a e mere ebe ndị a ga-aba n’ọdịnihu.

Ọ Gwara Ya Gaa na jw.org

Jehizel na Mariana na-anọkọ n’otu klas kemgbe afọ isii na Venezuela. Jehizel bụ Onyeàmà Jehova. N’ihi ya, Mariana na-emekarị ya akaja. Mariana sịrị na Jehizel amaghị otú e si ekpori ndụ. Otu ụbọchị Mariana mechara ya akaja, Jehizel chetara ihe ọ ga-agwa ya. Ọ sịrị ya: “Mariana, gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org. Pịa ebe e dere ‘Vidio,’ pịzie ebe e dere ‘Ndị Na-eto Eto.’”

N’ehihie ụbọchị ahụ Mariana kpọrọ Jehizel n’ekwentị ma gwa ya, sị: “Ugbu a, amatala m ihe mere i ji akpa àgwà otú i si akpa.”

Ma, Jehizel aghọtaghị ihe mere o ji kwuo ihe ahụ, ya ajụọ ya sị, “Ị̀ chọwakwala iji m eme ihe ọchị ọzọ?”

Mariana sịrị ya: “Mba. Agaghịzi m na-eji gị eme ihe ọchị. I meela maka ebe ahụ i gosiri m na jw.org. Ugbu a, ahụla m na ihe m chere na ọ bụ ‘ikpori ndụ’ bụ ihe na-akpatara m ọtụtụ nsogbu m na-enwe.” Mariana na Ndịàmà Jehova na-amụchi Baịbụl anya, ọ na-abịachikwa ọmụmụ ihe anya ugbu a.

Ọ Jụrụ Pastọ Ajụjụ

Na Heiti, otu nwaanyị bụ́ odeakwụkwọ na chọọchị ha jụrụ Ndịàmà Jehova ajụjụ. Aha nwaanyị a bụ Gérole. Obi tọrọ ya ezigbo ụtọ mgbe Ndịàmà Jehova ji Baịbụl zaa ya ajụjụ niile ọ jụrụ ha. Ya na nwa ya nwaanyị na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. Ihe ha na-amụ ruru ha n’obi nke na ha kwuru ka a na-amụrụ ha ihe ugboro abụọ n’izu.

Mgbe ha mụrụ ihe ruo ọnwa atọ, ọ gakwuuru pastọ chọọchị ha ma jụọ ya ajụjụ anọ. Ajụjụ anọ ahụ bụ: “Olee mgbe e chiri Jizọs Eze? Olee ebe ndị ezi omume ga-aga ma ha nwụọ? Olee ebe ndị ajọ omume ga-aga ma ha nwụọ? À kpọgburu Jizọs n’obe ka ọ̀ bụ n’osisi?” Pastọ ha gwara ya na ọ bụ naanị ajụjụ nke abụọ na nke atọ ka ya ga-azali. Ọ zara ya, sị: “Ndịàmà Jehova sịrị na ọ bụ naanị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-aga eluigwe. Mụnwa na-akụzikwanụ na ndị niile na-eme ihe Chineke na-achọ ga-aga eluigwe. Ma, a ga-ata ndị ajọ omume ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ ruo mgbe ebighị ebi.” Mgbe m jụrụ ya ebe ihe ndị a o kwuru dị na Baịbụl, o nwelighị ike igosi m ebe ọ bụla. Ihe Gérole tụrụ anya ya abụghị ihe ọ hụrụ, ya emezie ka o kpebisie ike na ya agaghị akwụsị Baịbụl ya na Ndịàmà Jehova na-amụ. Gérole gwara ndị chọọchị ha na ya abụghịzi onye chọọchị ha. O kwuru na ihe ya mụtarala na Baịbụl kemgbe ọnwa atọ ya na Ndịàmà Jehova mụwara ihe karịrị ihe ya mụtara kemgbe afọ iri atọ ya kpewara chọọchị. E mere Gérole na nwa ya nwaanyị baptizim n’oge na-adịbeghị anya. Ha na-amụkwara mmadụ iri abụọ na atọ Baịbụl n’obodo ha ugbu a.

Heiti: Ebe Gérole na nwa ya nwaanyị na-amụrụ otu n’ime ndị ha na-amụrụ Baịbụl ihe