Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Ezi Ụmụnna Anyị:

Obi dị anyị ụtọ idetara unu akwụkwọ ozi a ná mbido afọ a pụrụ iche. Jizọs Kraịst malitere ịchị n’etiti ndị iro ya n’afọ 1914. Ihe ọ pụtara bụ na ọ chịala otu narị afọ ma afọ 2014 gwụchaa.—Ọma 110:1, 2.

Kwa afọ, Watch Tower Bible and Tract Society na-enwe nnọkọ. Na nke ha nwere n’ọnwa Ọktoba afọ 2013, ndị sụgharịrị Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ wepụtara Baịbụl Bekee ọhụrụ ha sụgharịrị. Otú e si sụgharịa Baịbụl ahụ enweghị atụ. Ihe karịrị iri afọ isii gara aga, Jehova nyeere ụfọdụ n’ime ndị e tere mmanụ aka ha asụgharịa Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee. (Rom 8:15, 16) Ebe ọ bụ na Jehova nyere ha mmụọ nsọ ya, o doro anya na ma nke ahụ ma nke ọhụrụ a pụrụ iche.

Kemgbe ọtụtụ afọ, Kọmitii Ide Ihe ejighị ịsụgharị Baịbụl egwuri egwu. E nwere Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ugbu a, ma nke nwere Akwụkwọ Nsọ Hibru na Akwụkwọ Nsọ Grik ma nke bụ naanị Akwụkwọ Nsọ Grik, n’otu narị asụsụ na iri abụọ na otu. Na-agụ Baịbụl gị kwa ụbọchị, na-echebakwara ihe ị gụrụ echiche. Ime otú ahụ ga-egosi na obi dị gị ụtọ na Jehova nyere gị Baịbụl, ọ ga-emekwa ka ị bịarukwuo Jehova nso.—Jems 4:8.

Ọ na-ewute anyị ma anyị nụ banyere ahụhụ ụmụnna anyị na-ata. O doro anya na ọ bụghị mgbe niile ka ha na-eso ụmụnna ndị ọzọ enwe aṅụrị. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna nwaanyị malitere ịrịa strok n’oge na-adịbeghị anya n’Eshia. Ọrịa a na-akpakwa ezinụlọ ya aka ọjọọ. Nke ka njọ bụ na ọrịa ya a ekweghị ndị dọkịta ngwọta. Ọ bụzi di nwanna nwaanyị a na-emere ya ihe niile. Ụmụ ha na-agbakwa mbọ ilekọta nne ha na nna ha otú ahụ Ndị Kraịst kwesịrị ịna-eme. Otú ndị ezinụlọ a si edi nsogbu a na-eme ka okwukwe ha na-esi ike. Otú unu sikwa edi nsogbu ndị unu na ha na-alụ na-eme ka unu na-enwe ọṅụ n’ihi na ọ na-eme ka okwukwe unu sikwuo ike. (Jems 1:2-4) Jehova kwere ma ndị e tere mmanụ ma atụrụ ọzọ nkwa na anyị ga-enwe obi ụtọ ma anyị na-atachi obi n’ihi na ọ ga-eji ndụ ebighi ebi kwụọ anyị ụgwọ.—Jems 1:12.

N’afọ gara aga, ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs dị nde mmadụ iri na itoolu, narị puku abụọ na puku iri anọ na otu na narị abụọ na iri ise na abụọ. Obi dị anyị ụtọ na ọtụtụ ndị bịara nzukọ a dị oké mkpa anyị na-enwe kwa afọ. N’oge ahụ a na-echeta ọnwụ Jizọs, nde kwuru nde ụmụnna anyị sụrụ ụzọ inyeaka n’ọnwa Mach nakwa n’ọnwa Eprel. Anyị makwa na obi dị anyị ụtọ mgbe a gwara anyị na ndị na-asụ ụzọ inyeaka n’oge onye nlekọta sekit na-eleta ọgbakọ ga-anọ ná nnọkọ ahụ ya na ndị ọsụ ụzọ oge niile na-enwe ruo n’isi, ọ sọgodị ya ya bụrụ na ọ bụghị n’ọnwa Mach ma ọ bụ Eprel. Ndị ji ife Jehova kpọrọ ihe anaghị eji ma ikwusa ozi ọma ma ọrụ ndị ọzọ a na-arụ n’ọgbakọ egwu egwu. Ọ bụrụ na anyị akpọọ ọrụ Onyenwe anyị mkpa, anyị ga-eguzosi ike, mbọ niile Setan na-agba ka anyị daa mbà ga-akụkwa afọ n’ala.—1 Kọr. 15:58.

Obi anyị jupụtara n’aṅụrị maka na ọtụtụ ndị raara onwe ha nye Jehova, e meekwa ha baptizim n’afọ ije ozi gara aga. Ha dị narị puku mmadụ abụọ na puku iri asaa na asaa na narị atọ na iri anọ na anọ. Ha sozi ụmụnna ha n’ụwa niile na-eje ije n’okporo ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ. (Mat. 7:13, 14) Anyị kwesịrị inyere ndị a aka ka ha “gbasie ike n’okwukwe.” (Kọl. 2:7) Anyị kwesịrị ịna-agba ụmụnna ibe anyị ume ka anyị niile na-edi nsogbu ụwa a ruo ọgwụgwụ. (Mat. 24:13) “Na-agụgụnụ mkpụrụ obi dara mbà, na-akwadonụ ndị na-adịghị ike, na-enwenụ ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ niile nọ.” (1 Tesa. 5:14) Ka anyị niile ‘na-ekpe ekpere,’ ‘Ka alaeze Chineke bịa.’—1 Tesa. 5:17; Mat. 6:10.

Anyị na-agba gị ume ka ị gụọ Akwụkwọ Mgbaafọ a. Anyị hụrụ unu niile hụrụ Jehova n’anya n’anya.

Anyị bụ ụmụnna unu,

Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova