Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IKWUSA OZI ỌMA NA ỊKỤZI IHE N’ỤWA NIILE

Mba Ndị Dị n’Oké Osimiri Pasifik

Mba Ndị Dị n’Oké Osimiri Pasifik
  • MBA OLE DỊ NA YA 29

  • MMADỤ OLE BI NA HA 39,508,267

  • NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA HA 96,088

  • MMADỤ OLE A MỤỤRỤ BAỊBỤL 63,333

“Ọ Bụ Ugbu A Ka M Ghọtawara Ihe A Na-eme”

Na Papiuwa Niu Gini, e nwere otu nwaanyị onye ogbi aha ya bụ Freda, o nwekwara nwanna nwaanyị na-amụrụ ya Baịbụl. Obi tọgburu ya atọgbu mgbe a gwara ya na ya na nwanna nwaanyị ahụ na-amụrụ ya ihe ga na-agazi n’ọgbakọ ndị ogbi mbụ e hiwere n’ebe ahụ. E hiwere ọgbakọ a n’abalị mbụ n’ọnwa Mach afọ 2013. Freda chọpụtara na ya dowe akwụkwọ ya, na-ele onye ji asụsụ ndị ogbi na-eme ihe omume anya, na ya na-aka aghọta ihe a na-amụ. Ọ tụrụ ya n’anya na ihe a emeela ka ihere ịza ajụjụ gharazie ịna-eme ya. Ọ na-azazi ajụjụ ọtụtụ ugboro n’ọmụmụ ihe. Ọ ghọkwara onye nkwusa a na-emebeghị baptizim n’ọnwa Eprel afọ 2013. Ọ na-agwazi ndị ogbi ndị ọzọ ka ha bịa ọmụmụ ihe, ha na-esokwa ya abịa. Ọ na-abụ ya bịa ọmụmụ ihe, anya mmiri ana-agba ya. Mgbe a jụrụ ya ihe mere anya mmiri ji agba ya ma ọ bịa ọmụmụ ihe, ọ sịrị: “Ọ bụ maka na ọ bụ ugbu a ka m ghọtawara ihe a na-eme.”

Ọ Banyere n’Ụgbọala Ọ Na-ekwesịghị Ịbanye

N’Ọstrelia, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Barbara ji ụgbọala ya na-aga oziọma ma kwụsị n’akụkụ ụzọ, ka o lee ma ò jikwa akwụkwọ ebe o dere aha ndị ọ ga-agara nletaghachi. Ozugbo ọ kwụsịrị, otu nwaanyị mepere ụgbọala ya, chọwa ịbata.

Barbara sịrị ya: “Biko ewela iwe, ọ bụghị gị ka m kwụsịịrị.

Nwaanyị ahụ sịrị ya, “Ewela iwe, eche m ma ọ̀ bụ gị bụ nwaanyị na-abịa iburu m.” Mgbe ọ hụrụ Ụlọ Nche na Teta! Barbara ji, ọ sịrị ya, “Ụmụ nwaanyị abụọ na-amụburu m Baịbụl ọtụtụ afọ gara aga na-ewetaburu m akwụkwọ ndị a.” Barbara nyeziri ya magazin ndị ahụ, mechaakwa malite ịmụrụ ya Baịbụl.

“Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Chineke”

Niu Ziland: Nwanna Nwaanyị Violet na-eji akwụkwọ ozi ndị ọ na-ede ezi ọtụtụ ndị ozi ọma

E nwere otu nwanna nwaanyị merela agadi aha ya bụ Violet. Ọ dị afọ iri asatọ na abụọ. O bi n’obodo Kraịstchọọchị dị na Niu Ziland. Ọtụtụ oge, ọ na-ezigara ndị bi n’ebe a na-elekọta ndị agadi na ndị nọ n’ụlọ ọgwụ e mere maka ndị na-anwụ anwụ akwụkwọ ozi na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Ndị nọọsụ o si n’aka ha eziga akwụkwọ ozi ndị a sị na ndị agadi a na-ezitere akwụkwọ ozi ndị a na-atụsi anya ha ike. Ha na-akpọ ya akwụkwọ ozi si n’aka Chineke. Ụfọdụ n’ime ha na-eme, ha gụchaa akwụkwọ ndị e ziteere ha, ha enye ndị ọzọ ka ha gụọ ma ọ bụkwanụ ha agụpụtara ya ndị anya na-anaghị ekwe ịgụ akwụkwọ. Ndị nọọsụ ahụ sịkwara na ndị na-agụ akwụkwọ ndị ahụ na-akpa àgwà ọma karịa ndị na-anaghị agụ ha. Obi na-aka eru ha ala, ha na-aka enwe obi ụtọ, ha na ndị mmadụ na-akakwa adị n’udo. Mgbe Violet na-ekwu banyere otú o si agbalị ekwusa ozi ọma, ọ sịrị: “Ama m na Jehova ka ji m na-enyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere ya. N’eziokwu, ịkụziri ndị ọzọ eziokwu ndị dị na Baịbụl na-eme obi ụtọ.”

Ọ Gụrụ Banyere Okooko Osisi Ros

N’otu ụtụtụ Satọdee, n’obodo Saịpan, ka otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Bernie nọ na-enye ndị mmadụ Ụlọ Nche ndị kacha ọhụrụ, o nwere ihe merenụ tụrụ ya n’anya. O rutere n’ụlọ otu nwa agbọghọ aha ya bụ Bernadette. Nwa agbọghọ a bụ nwa akwụkwọ mahadum. Nwanna nwaanyị a weere otu Ụlọ Nche nye ya, ya asị na ya agụọla ya. Nwanna nwaanyị a nọ na-eche otú ọ ga-esi bụrụ na nwa agbọghọ a agụọla Ụlọ Nche ahụ ebe ọ bụ Ụlọ Nche ọhụrụ. O wepụtakwara Ụlọ Nche ọzọ nye ya, Bernadette asịkwa ya na ya agụọla nke ahụ. Ihe a gbara nwanna nwaanyị a gharịị, ya ajụọ Bernadette ebe ọ gụrụ magazin ndị ahụ niile, jụọkwa ya ma ọ̀ bụ Onyeàmà Jehova ji oge ezumike ya bịa obodo ha. Bernadette gwara ya na ya abụghị Onyeàmà Jehova, mana na ya gụrụ magazin ndị ahụ na jw.org. Ihe merenụ bụ na otu ụbọchị ka Bernadette nọ n’Ịntanet na-eme nchọnchọ gbasara okooko osisi, o denyere okwu bụ́ “roses” n’ihe o ji na-achọ ihe n’Ịntanet. Otu n’ime ihe ndị ọ chọtaara ya bụ otu isiokwu gbara n’otu Teta! Bekee dị na jw.org. Isiokwu ahụ bụ: “Alluring Roses From Africa” (ya bụ, Ọmarịcha Okooko Osisi Ros Ndị Dị n’Afrịka). Bernadette gwara nwanna nwaanyị a na isiokwu ahụ tọrọ ya ezigbo ụtọ, nke mere ka ya legharịkwuo anya n’ihe ndị ọzọ dị na jw.org. N’oge ahụ, ihe ndị ọ na-agụkarị na jw.org bụ gbasara ụmụ anụmanụ na osisi. Ma, o mechara hụ ihe ndị masịrị ya e kwuru gbasara Baịbụl. Mgbe nwanna nwaanyị a chọpụtara na Bernadette nwere mmasị na Baịbụl, ya na ya kwekọrịtara na ọ ga na-abịa ka ha na-amụ Baịbụl. O mechara jiri Akwụkwọ Baịbụl Na-akụzi laghachi na nke Bernadette. Na nke ugbo atọ nwanna nwaanyị a gara, ha bidoro mụwa isi nke mbụ nke akwụkwọ ahụ. Mgbe ihe dị ka otu afọ gara, ya bụ, na Nọvemba 2012, Bernadette mere baptizim. Otú a o si mee baptizim ngwa ngwa mere ka ndị enyi ya na-ama ya njakịrị na “o ji ọsọ” gbaba n’eziokwu. O doro anya na ọ bụ adres Ịntanet anyị nyeere ya aka ịnata eziokwu ngwa ngwa.