Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IKWUSA OZI ỌMA NA ỊKỤZI IHE N’ỤWA NIILE

Amerịka na Mba Ndị Gbara Ya Gburugburu

Amerịka na Mba Ndị Gbara Ya Gburugburu
  • MBA OLE HA DỊ 57

  • MMADỤ OLE BI NA HA 970,234,987

  • NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA HA 3,943,337

  • MMADỤ OLE A MỤỤRỤ BAỊBỤL 4,341,698

Ha Gwara Otu Di na Nwunye Ka Ha Bịa Nọrọ n’Ụlọ Ha

N’obodo Las Vegas nke dị na Nevada, e nwere otu di na nwunye na-abụghị Ndịàmà Jehova. Ha chọrọ ịkwaga ebe ahụ́ ga-aka eru ha ala. N’ihi ya, ha rere ụlọ ha ka ha kwagazie n’obodo Dọminikan Ripọblik. Ma, ha kwesịrị ịkwapụ n’ụlọ ahụ abalị iri tupu ụbọchị ha ga-agawa. Ndị agbata obi ha, bụ́ Ndịàmà Jehova, gwara ha ka ha bịa nọrọ n’ụlọ ha. Otu ụbọchị, di na nwunye ahụ so ha gaa ọmụmụ ihe, nụ ka e kwuru banyere afọ 1914. Ọ tụrụ ha n’anya n’ihi na ha ma na nnukwu ihe mere n’afọ ahụ. Ozugbo ha ruru Dọminikan Ripọblik, ha gwara Ndịàmà Jehova mbụ bịara na nke ha ka ha mụwara ha Baịbụl. Mgbe otu afọ na ọnwa abụọ gachara, ha abụọ nyefere Chineke onwe ha, e meekwa ha baptizim.

O Nwetara Nnọọ Ihe Ọ Chọrọ

N’obodo Panama, n’afọ 2012, a haziri ka ndị si mba dị iche iche buru akwụkwọ ha bịa na Panama Siti, kpọsa ya ka ndị chọrọnụ zụrụ. Ụmụnna anyị kpọsakwara akwụkwọ anyị n’ebe ahụ. E nwere ụmụ agbọghọ abụọ bịara ebe ahụ a kpọsara akwụkwọ anyị. Ha bụ ụmụ akwụkwọ. Otu n’ime ha gwara nwanna nwaanyị nọ ebe ahụ na obi adịghị ya mma. Ọ sị na ọgwụ ike eriela papa ya ahụ́, na ya amaghịkwanụ otú ya ga-esi enyere ya aka. Nwanna nwaanyị ahụ nyere ya akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè nke 2 ma gosi ya isiokwu nke iri abụọ na atọ. Isiokwu ahụ sịrị: “Gịnị Ka M Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Ọgwụ Ike Ma Ọ Bụ Mmanya Eriela Papa M Ma Ọ Bụ Mama M Ahụ́?” Nwa akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “Ihe a bụ nnọọ ihe m chọrọ!” Ha makụrụ nwanna nwaanyị ahụ lawa, otu awa agaa, ha alọghachikwa kelee ya ọzọ. N’ime abalị ise e mere ihe ahụ, ụmụnna anyị nyere ndị mmadụ akwụkwọ ruru otu puku na iri anọ na isii, magazin dị otu puku na otu narị na iri na isii, na broshọ dị narị anọ na iri anọ na itoolu. Mmadụ iri ise na isii gwara ụmụnna ndị ahụ ebe ha bi ka ha nwee ike ịchọ ha bịa.

Naanị Ya Kwusara Ozi Ọma Ruo Afọ Anọ

E nwere otu nwoke bi n’otu obodo dị n’otu ugwu dị na Kọsta Rika. Aha ya bụ Fredy. Ọ na-asụ asụsụ Kaweka. Ihe dị ka afọ anọ gara aga, mgbe ọ na-arụ ọrụ na San Họsee, bụ́ isi obodo Kọsta Rika, o nwetara akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? na broshọ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? Nwanna nyere ya akwụkwọ ndị ahụ gwara ya ka ọ laghachi obodo ya kwusawara ndị ebe ahụ ozi ọma. Ọ laghachiri obodo ya, mụọ akwụkwọ Bible Na-akụzi, ma malite ime ihe ndị ọ mụtara. Otu ihe o mere bụ ịga deba alụmdi na nwunye ha n’akwụkwọ. O bidoziri na-akụziri ndị Kaweka eziokwu dị na Baịbụl otú o nwere ike.

Fredy hiwere ụlọ akwụkwọ nwere klas isii maka ndị ahụ ọ na-akụziri Baịbụl. Ọ na-enye ndị mmadụ ule ha ga-ele iji mara otú ha maruru Baịbụl. Otú onye nke ọ bụla si mee n’ule ahụ ga-enyere ya aka ịma klas nke ọ ga-etinye ya. Ọ haziri ka a na-enwe ọmụmụ ihe, haziekwa ka a na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ọ na-eji aka ya ede akwụkwọ ịkpọ òkù. Ihe ọ na-ede na ya bụ: “Ndịàmà Jehova na-akpọ gị ka ị bịa soro ha mgbe ha ga-echeta ọnwụ Kraịst.” Ọ nọ na-eme ihe a niile ruo afọ anọ n’ahụghị Ndịàmà Jehova ọzọ. Ma, ọ nọ na-arịọ Jehova ka o zitere ya ụmụnna ga-enyere ya aka.

Na nso nso a, Jehova zara ekpere Fredy. Ụfọdụ Ndịàmà Jehova gbalịrị gaa ebe ahụ, n’agbanyeghị na o siri ike ọgịga. O juru ha anya mgbe ha ruru, hụ mbọ niile Fredy gbarala. Ha sịrị, “Fredy na-eme nnọọ ka nwanna e merela baptizim n’agbanyeghị na e mebeghị ya.” Naanị ọnwa atọ ya na ụmụnna nọrọ, ya aghọọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim. O si obodo ha gaa mgbakọ mbụ ya ka e mee ya baptizim. Ọ kpọ mmadụ iri na itoolu n’ime ndị ọ na-amụrụ Baịbụl gaa. O hiwela ìgwè atọ na-eji asụsụ Kaweka amụ ihe n’ebe ndị kadị obodo nke ya dịrị n’ime.

Kọsta Rika: Fredy bụ ọsụ ụzọ oge niile ugbu a, ọ na-emekwa ogologo njem ka o nwee ike ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl

Ọ Katara Obi Gwa Ụmụ Akwụkwọ Ibe Ya Ihe O Kweere

O nwere otu nwata nwaanyị Onyeàmà Jehova aha ya bụ Anna. Ọ na-aga ụlọ akwụkwọ sekọndrị n’Amerịka. Otu ụbọchị, ụmụ akwụkwọ ibe ya wesawara ya iwe maka na o kweghị n’Atọ n’Ime Otu. Ọ sịrị: “Ha niile chịịrị ọnụ wụnye m n’ahụ́. Ma, agbara m ha nkịtị n’ihi na achọghị m ime ihe ga-eme ka ndị mmadụ chewe na Ndịàmà Jehova bụ ndị ọjọọ.” N’abalị ụbọchị ahụ, Anna rịọrọ Jehova ka o nyere ya aka ịkata obi kọwaara ụmụ akwụkwọ ibe ya ihe o kweere. O mekwara nchọnchọ gbasara Atọ n’Ime Otu. N’echi ya, o ji Baịbụl ya gaa akwụkwọ. Ụmụ akwụkwọ ibe ya gbara ya gburugburu, ụfọdụ ana-achị ya ọchị. Onye ọ kacha njọ n’isi bụ onyeisi klas ha. Ma, ọ katara obi gụọrọ ha ọtụtụ amaokwu Baịbụl, kọwaakwara ha ya. Mgbe ọ kọwachaara ha ya, o nyeghịzi ha ọnụ okwu. Onyeisi klas ha ahụ mechara kwuo na ya ga na-akwanyeziri Ndịàmà Jehova ùgwù. Malite mgbe ahụ ruokwa mgbe ha gụchara klas ahụ, ọ jụrụ Anna ọtụtụ ajụjụ banyere ihe Ndịàmà Jehova kweere.

Akpụkpọ Ụkwụ Ya Dọbiri n’Oge Kwesịrị Ekwesi

Na Babedọs, o nwere otu ụbọchị otu nwaanyị nọ na-aga chọọchị n’ụbọchị Sọnde, akpụkpọ ụkwụ ya adọbie. Ọ banyere n’ụlọ dị nso ebe ahụ ka ọ nara ha ihe ọ ga-eji mezie ya. Ọ dabara na ụlọ ahụ ọ banyere bụ ụlọ otu nwanna nwaanyị na nwa ya. Ka nwaanyị ahụ nọ na-emezi akpụkpọ ụkwụ ya, nwanna nwaanyị ahụ kọwaara ya otú amụma ndị dị na Baịbụl si na-emezu. Nwa nwanna nwaanyị ahụ gwara ya ka o soro ha gaa ọmụmụ ihe n’ụtụtụ ahụ. O kwetara iso ha gaa maka na oge ha ji aga chọọchị agaala. Mgbe ha nọ n’ọmụmụ ihe, nwaanyị ahụ ji Baịbụl King James ya sapeta amaokwu Baịbụl niile a gụrụ. Ihe ndị e mere n’ọmụmụ ihe tọrọ ya ezigbo ụtọ. Ọ sị na ụda nkwa na ụzụ a na-eme na chọọchị agwụla ya ike, nakwa na o teela ọ gụwara ya agụụ ịmụ Baịbụl n’ebe dị jụụ. Ọ natara akwụkwọ Bible Na-akụzi, kwetakwa ka a mụwara ya Baịbụl. Ugbu a, ọ na-agazu ọmụmụ ihe anyị niile. Ọ na-atọkwa ya ụtọ ịza ajụjụ.

Naanị Otu Onye Ga-akwụsịli Ya Ikwusa Ozi Ọma

E nwere otu nwanna nwoke bi n’obodo Gayana: Ọ sịrị: “Ọ na-atọ m ụtọ izi ụmụ akwụkwọ ibe m ozi ọma. Ma, e nwere otu nwa klas anyị obi na-anaghị adị mma maka ihe ahụ m na-eme. Otu ụbọchị, ọ kwaara m kwagide n’ahụ́ ájá, ma sị m, ‘Kwụsị ozi ọma a ị na-ekwusa!’ Asịrị m ya na ọ bụ naanị Jehova ga-akwụsịli m ikwusa ozi ọma. Ebe ọ bụ na ekweghị m eme ihe o kwuru, ihe o meziri bụ iwere ihe chabie aka akpa akwụkwọ m, suokwa m ọkpọ n’ihu, kụbie m ọnụ. A kpọ anyị abụọ gaa n’ọfis nwaanyị na-elekọta ụlọ akwụkwọ anyị, ya ajụọ m ihe m mere ya o ji suo m ọkpọ. Asịrị m ya na ọ bụ maka na m na-ekwusa ozi ọma. Ọ jụrụ m ihe mere esugwaaraghị m ya, ọ sịdịrị m na ọ bụ ihe m gaara eme. Asịrị m ya na ọ bụ n’ihi ihe m mụtara na Baịbụl ná Ndị Rom 12:17, ebe sịrị ka Ndị Kraịst ghara iji ‘ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ.’ Ọ sịziri m gawa na ya ga-emesi nwa ahụ ike.”

Katamaka, dị n’Ajentina