Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

SIERA LION NA GINI

Òtù Nzuzo

Òtù Nzuzo

N’ỌTỤTỤ obodo ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka, e nwere òtù nzuzo dị iche iche. Ha na-atụrụ ndị òtù ha otú ha ga-esi ebi ndụ na ihe ha ga-eme ma a bịa n’okwu gbasara agụmakwụkwọ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ma, ihe ka ha mkpa bụ ime ihe ndị a chọrọ ka onye òtù ha ọ bụla na-eme. E nwere òtù nzuzo a na-akpọ Poro, nweekwa nke a na-akpọ Sande. Òtù abụọ a so n’òtù nzuzo ndị kachanụ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka. Ụmụ nwoke na-abanye na nke a na-akpọ Poro, ụmụ nwaanyị ana-abanye na nke a na-akpọ Sande. * Otu akwụkwọ e dere n’afọ 1986 kwuru ụfọdụ n’ime ihe ndị òtù Poro na-eme. O kwuru na ha na-agbalị “ịtụrụ ndị mmụọ ụka. Ha na-agwa ha ka ha na-eme ihe ga-abara ụmụ nwoke uru.”

A na-akụziri ndị ọhụrụ batara n’òtù ndị Poro gbasara ndị mmụọ. A na-akụzikwara ha gbasara ndị amusu. A na-akakwa ha akara e ji gbunye ha ọgwụ n’ahụ́. A na-emekwara ndị òtù Sande otu ihe ahụ. Ha na-ebi ụmụ nwaanyị ha úgwù. Ma, e nwere ebe ụfọdụ ha kwụsịrịla ibi ụmụ nwaanyị úgwù.

Ndị òtù nzuzo ndị ọzọ na-enye ndị òtù ha iwu gbasara inwe mmekọahụ. Ha na-anwakwa iji ike ndị mmụọ ọjọọ agwọ ndị ara ma ọ bụ ụdị ọrịa ndị ọzọ. N’oge a lụrụ agha na Siera Lion, otu òtù nzuzo kwuru na ihe ọ sọrọ mmadụ gbaa ndị òtù ha n’égbè, mgbọ enweghị ike ịtụ ha. Ma nke ahụ bụ okpookpo ụgha n’ihi na mgbọ tụrụ ha n’oge agha ahụ.

A na-agwa ndị òtù ha ka ha ghara ịkọrọ onye ọ bụla ihe ndị ha na-eme. A na-egbu onye òtù ha ọ bụla nwara anwa daa iwu ha.

^ para. 3 N’ebe ụfọdụ, ihe a na-akpọ òtù Sande bụ òtù Bondo.