Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

SIERA LION NA GINI

Ha Na-akpọ Ya “Bible” Brown

William R. Brown

Ha Na-akpọ Ya “Bible” Brown
  • MGBE A MỤRỤ YA n’Afọ 1879

  • MGBE O MERE BAPTIZIM n’Afọ 1908

  • ONYE Ọ BỤ O so ná ndị mbụ kwusara ozi ọma n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka.

MGBE Brown na-arụ ọrụ n’Ọwa Mmiri Panama n’afọ 1907, ọ nụrụ okwu ihu ọha otu nwoke Onye Mmụta Baịbụl nọ n’akụkụ otu okporo ámá na-ekwu. Ihe a na-akpọ Onyeàmà Jehova n’oge ahụ bụ Onye Mmụta Baịbụl. Onye Mmụta Baịbụl ahụ bụ Nwanna Isaiah Richards. Nwanna Richards ji chaatị e ji kọwaa ihe dị iche iche Chineke zubere ime kwuo okwu ihu ọha ahụ. O teghị aka Brown gechara okwu ihu ọha ahụ, ya aghọọ Onye Mmụta Baịbụl. Ọ laghachiri Jameika zie mama ya na nwanne ya nwaanyị ozi ọma. Obere oge, ha aghọọkwa Ndị Mmụta Baịbụl.

Nwanna Brown nọtụrụ na Panama Siti, dị na Panama kwusaa ozi ọma. Ebe ahụ ka ọ nọ hụ Nwanna Evander J. Coward. Nwanna Coward bụ otu n’ime ndị nnọchianya Ndị Mmụta Baịbụl. Ọ bịara ikwu okwu ihu ọha n’obodo Panama. Ọ ma otú e si ekwu okwu ya eruo ndị mmadụ n’obi. Ọtụtụ ndị na-abịakwa ege okwu ya. Mgbe ọ chọpụtara na Nwanna Brown ji ofufe Chineke kpọrọ ihe, ọ gwara ya ka ya na ya soro gaa kwusaa ozi ọma n’obodo Trinidad.

Nwanna Brown kwusara ozi ọma na West Indiiz niile ihe karịrị afọ iri. Ọ bụ onye ọsụ ụzọ, o nyekwaara ụmụnna nọ n’ebe ahụ aka ịkwụsị ike. Ọ lụrụ nwaanyị n’afọ 1920. Aha nwunye ya bụ Antonia. Ọ bụ nwanna nwaanyị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe. Abalị abụọ Nwanna Brown na nwunye ya Antonia lụchara, ha gara Mọnserat, nke dị n’Agwaetiti Liwọd. Ha gosiri ndị ebe ahụ otu fim a na-akpọ “Foto Ihe Nkiri nke Okike.” Na fim a, e gosiri foto ndị e ji kọwaa otú Chineke si kee ihe. Ha kwusakwaara ndị bi n’agwaetiti Babedọs, Dọminika, na Greneda ozi ọma. Ozi a ha jeere Jehova ngwa ngwa ha lụchara tọrọ ha ụtọ.

Mgbe ihe dị ka afọ abụọ gachara, Nwanna Brown degaara Nwanna Joseph F. Rutherford akwụkwọ. Ọ bụ Nwanna Rutherford na-elekọta ozi ọma ndị Jehova na-ekwusa n’ụwa niile n’oge ahụ. Nwanna Brown dere, sị: “Jehova enyerela m aka mụ agaa ọtụtụ ebe n’agwaetiti Karịbian kwusaa ozi ọma. Ọtụtụ ndị m ziri ozi ọma aghọọkwala Ndị Kraịst. Ọ̀ bụ m gaghachikwa ebe ahụ kwusaa ozi ọma?” N’ime abalị ole na ole o zipụchara akwụkwọ ozi a, Nwanna Rutherford detaara ya akwụkwọ ozi. Ọ gwara ya, sị: “Kpọrọ nwunye gị na nwa unu gaa kwusaa ozi ọma na Siera Lion, dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka.”

Nwanna Brown jere ozi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka ruo iri afọ abụọ na asaa. N’ime iri afọ abụọ na ise a, ọ chọghị ịnọ n’ọfis na-arụ ọrụ ya. Kama, ọ chọrọ ịga na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma. Ọ na-abụ Nwanna Brown na-ezi ndị mmadụ ozi ọma, ya ana-asị lekwa ihe Baịbụl kwuru. Ọ bụ ya mere ndị mmadụ ji kpọwa ya “Bible” Brown.

Nwanna William Brown na nwunye ya laghachiri Jameika n’afọ 1950 mgbe ọ dị iri afọ asaa na otu. Ha malitere ịsụ ụzọ mgbe ha ruru. Nwanna Brown sụgidere ụzọ ruo mgbe o jechara ozi ya n’ụwa n’afọ 1967. O nweghị ihe tọrọ ya ụtọ ka ịsụ ụzọ. O kweere na o nweghị ihe karịrị mmadụ iji ndụ ya jeere Jehova ozi.