Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

SIERA LION NA GINI

Ekpebisiri M Ike Ife Jehova

Philip Tengbeh

Ekpebisiri M Ike Ife Jehova
  • MGBE A MỤRỤ YA n’Afọ 1966

  • MGBE O MERE BAPTIZIM n’Afọ 1997

  • ONYE Ọ BỤ Ọ gbara ọsọ ndụ mgbe a na-alụ agha. O nyekwara aka rụọ Ụlọ Nzukọ Alaeze ise.

ABỤ m onye Koindu, nke dị na Siera Lion. Mgbe ndị agha nnupụisi batara obodo anyị n’afọ 1991, mụ na nwunye m Satta gbara ọsọ ndụ. Ọsọ ndụ a anyị gbara kpọgara anyị ebe dị iche iche ndị gbara ọsọ ndụ bi. Anyị biri ebe ndị ahụ afọ asatọ. Ụkọ nri na ọrịa kpara anyị aka ọjọọ. Ọtụtụ ndị anyị na ha bi n’ebe ndị ahụ na-akpa àgwà ọjọọ dị iche iche.

O nwere otu ihe anyị na-eme n’ebe ọ bụla anyị gbagara ọsọ ndụ. Ọ na-abụ anyị rute, anyị agwa ndị ọchịchị ka ha nye anyị ala anyị ga-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. O nwere ebe ndị ha na-ekwe enye anyị ala, nweekwa ebe ndị ha na-anaghị ekwe. Ma, anyị na-ahazi ebe anyị na-anọ amụ ihe n’ebe ọ bụla anyị gara. Anyị kpebisiri ike ijere Jehova ozi. Anyị mechara rụọ Ụlọ Nzukọ Alaeze anọ n’ebe dị iche iche ndị gbara ọsọ ndụ bi.

Mgbe agha ahụ biri, anyị bigidere ebe ahụ anyị gbagara ọsọ ndụ. Agha ahụ a lụrụ ọtụtụ afọ na Koindu mebiri ọtụtụ ihe. N’ihi ya, a kpọgara anyị n’ebe ọzọ ndị gbara ọsọ ndụ bi. Ebe a dị nso na Bo. Alaka ụlọ ọrụ nyere anyị ego anyị arụọ Ụlọ Nzukọ Alaeze nke ise ebe ahụ.