Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

SIERA LION NA GINI

‘Ime Ka Ọtụtụ Mmadụ Bụrụ Ndị Ezi Omume’ n’Afọ 1945 Ruo n’Afọ 1990​—⁠Dan. 12:⁠3. (Agba nke Mbụ)

‘Ime Ka Ọtụtụ Mmadụ Bụrụ Ndị Ezi Omume’ n’Afọ 1945 Ruo n’Afọ 1990​—⁠Dan. 12:⁠3. (Agba nke Mbụ)

Ndị Gụchara Akwụkwọ na Gilied Awụchaa na Fritaụn

N’ọnwa Jun afọ 1947, e nwere ụmụnna atọ e zigara Fritaụn ka ha kwusawa ozi ọma. Ụmụnna ndị a gụrụ akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ha bụ Charles Fitzpatrick, George Richardson, na Hubert Gresham. Ụmụnna ndị a bụ ndị ozi ala ọzọ mbụ e zigara Siera Lion.

Ụmụnna ndị a chọpụtara na ịga ozi ọma na-atọ ụmụnna nọ na Fritaụn ụtọ. Ma, ha amachaghị otú e si ezi mmadụ ozi ọma ya eruo onye ahụ n’obi. (Mat. 28:20) N’ihi ya, ha bidoro ịkụziri ha otú ha ga-esi na-eme nletaghachi na otú ha ga-esi na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl. Ha kụzikwaara ha ihe nzukọ Jehova kwuru gbasara otú a ga-esi na-enwe ọmụmụ ihe na otú a ga-esi na-eme ihe ndị ọzọ n’ọgbakọ. Ha kwuru okwu ihu ọha n’ụlọ ezumezu a na-akpọ Wilberforce Memorial Hall. Narị mmadụ anọ na iri ise bịara gere okwu ahụ. Obi tọkwara ndị ozi ala ọzọ ahụ ụtọ. Ha mechakwara kwuo ụbọchị a ga na-eji ekesa Ụlọ Nche na Teta! n’izu. Ihe ndị a ha kụziri nyeere ụmụnna niile ezigbo aka. O mekwara ka ọtụtụ ndị bata n’ọgbakọ.

Ma, oge ọkọchị na udu mmiri nyere ndị ozi ala ọzọ ahụ nsogbu n’ahụ́. Lekwa ihe otu n’ime alaka ụlọ ọrụ anyị kọrọ n’afọ 1948: “Ọkọchị na udu mmiri na-akpa ike dị egwu na Siera Lion. N’udu mmiri, mmiri na-ezogide ruo ọnwa isii. Mmiri ya na-ezosi ike. Ọ na-ezogide mgbe ụfọdụ ruo izu abụọ, si n’ụtụtụ ruo n’abalị. Okpomọkụ na-akarịkwa akarị n’ọkọchị.” Ọ bụ ya mere ndị ọcha mbụ bịara Siera Lion ji sị na ebe ahụ na-ata isi ndị ọcha. Ndị obodo ahụ na-arịakarị ịba, ịba anya odo, na ọrịa ndị ọzọ na-anaghị ekwe ndị mmadụ ṅụrụ mmiri tọgbọ iko. Ọ bụ ya mere ndị ozi ala ọzọ ahụ ji malite ịrịa ọrịa otu otu ma mechaa laa.

O doro anya na ihe a merenụ wutere ụmụnna anyị ndị Siera Lion. Ma ike agwụghị ha ikwusara ndị mmadụ ozi ọma. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1947, ndị nkwusa e nwere dị iri atọ na asatọ. Ma, ka ọ na-erule n’afọ 1952, ha dịzi iri asaa na atọ. E hiwere ọgbakọ ọhụrụ n’obodo a na-akpọ Wọtaluu, nke dị nso na Fritaụn. Ọ bụ ndị ọsụ ụzọ ji ozi ha kpọrọ ihe kụziiri ndị nọ n’ọgbakọ ọhụrụ a ihe ha abata n’ọgbakọ. A malitekwara inwe ebe ndị a ga-anọ na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl n’obodo Kisi nakwa na Welintịn. Obodo abụọ a dị n’ebe na-emepeghị emepe na Fritaụn. Ihe niile a gosiri na ọtụtụ ndị nwere ike ịbata n’ọgbakọ na Siera Lion. Ma, olee otú e nwere ike isi nyere ha aka?

Otu Nwanna Ziri Ụmụnna Ozi Tọrọ Ha Ụtọ

Na Nọvemba 1952, otu nwa okorobịa onye Amerịka gaferela afọ iri atọ, gbara ụgbọ mmiri bịa Fritaụn. Aha nwa okorobịa ahụ bụ Milton G. Henschel. O si n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’Amerịka bịa. Mgbe ọ banyere n’ime Fritaụn, o kwuru, sị: “Amaghị m na obodo a mara ezigbo mma otú a. Ọ dị ọcha karịa ọtụtụ obodo ndị mepere emepe e nwere n’ụwa. . . . O nwere ụzọ ndị e tere korota. O nwekwara ụlọ ahịa ndị na-ekwo ekwo, nakwa ọtụtụ ụgbọala ọhụrụ. Okporo ámá ya na-ekwokwa ekwo.”

Nwanna Henschel si ebe ahụ banye n’ụlọ ndị ozi ala ọzọ dị na Fritaụn. Ị gafee ụlọ a, gafee ụlọ abụọ ọzọ, gị enweta Osisi Apụ ahụ ndị ohu nọ n’okpuru ya mee ememme ha ji gosi na ha enwerela onwe ha. Tupu Nwanna Henschel erute n’ụlọ ndị ozi ala ọzọ ahụ, ọtụtụ ụmụnna nọ na-eche ya eche. Mgbe o rutere, ọ gwara ha na e nwere ọtụtụ ihe a ga-emere ha. Na Sọnde ọzọ, narị mmadụ abụọ na iri mmadụ ise na atọ gbakọrọ n’ụlọ ezumezu Wilberforce Memorial Hall ka ha nụ ihe ndị ahụ ọ sị na a ga-emere ụmụnna nọ na Siera Lion. Nwanna Henschel kwuru na a ga-enwe alaka ụlọ ọrụ na Siera Lion, nwee onye nlekọta sekit, nweekwa mgbakọ sekit. O kwukwara na a ga-enwe ọgbakọ ọhụrụ na Kisi. Ihe ọzọ o kwuru bụ na a ga-ekwusa ozi ọma n’obodo ndị ọzọ na-abụghị Fritaụn. Ihe a niile o kwuru tọrọ ndị niile bịaranụ ụtọ.

Nwanna Henschel sịrị: “Ha niile nọ na-asị m kusheh, kusheh, ya bụ, ‘I meela, i meela!’ Obi tọrọ ụmụnna ndị a ezigbo ụtọ. Tupu ha esi ebe ahụ lawa, chi ejiela . . . ụfọdụ n’ime ha bụụrụ abụ na-ala.”

A họpụtara otu onye ozi ala ọzọ bịara ọhụrụ ka ọ na-elekọta alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ e mechara nwee na Siera Lion. Aha ya bụ William Nushy. Nwanna a na-eresịbu ọtụtụ ụlọ ọrụ na-agba chaa chaa n’Amerịka ihe ndị ha ji agba chaa chaa. Ma, mgbe ọ ghọrọ Onyeàmà Jehova, ọ hapụrụ ahịa a ọ na-ere. Ihe a o mere mechara mee ka ụmụnna hụ ya n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù.