Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

SIERA LION NA GINI

‘Ime Ka Ọtụtụ Mmadụ Bụrụ Ndị Ezi Omume’ n’Afọ 1945 Ruo n’Afọ 1990​—⁠Dan. 12:⁠3. (Agba nke Anọ)

‘Ime Ka Ọtụtụ Mmadụ Bụrụ Ndị Ezi Omume’ n’Afọ 1945 Ruo n’Afọ 1990​—⁠Dan. 12:⁠3. (Agba nke Anọ)

Ịkụziri Ndị Mmadụ Otú E Si Agụ na Otú E Si Ede

Ná mbido afọ 1963, Nwanna Milton Henschel letara alaka ụlọ ọrụ Siera Lion. Nke a bụ nke ugboro abụọ ọ na-eleta ha. O lebara anya ná nsogbu alaka ụlọ ọrụ ahụ nọ na-achọ ihe ha ga-eme maka ya. Ọ gwara ha ka ha gbasie mbọ ike nyere ndị mmadụ aka ịmụta otú e si agụ na otú e si ede.

Ọgbakọ ụfọdụ nwere klas a na-amụ otú e si ede na otú e si agụ Bekee. Ma mgbe Nwanna Henschel lara, ụmụnna malitere ịkụziri ndị nkwusa otú e si agụ na otú e si ede asụsụ ha. Ọgbakọ ụfọdụ na-enwe klas a n’asụsụ abụọ ma ọ bụ atọ. Ọtụtụ ndị chọsiri ike ịmụta otú e si agụ na otú e si ede. Ọ bụ ya mere ha ji deba aha ha na klas ndị ahụ.

N’afọ 1966, ụfọdụ ụmụnna nọ na Laịberịa dere otu akwụkwọ n’asụsụ Kisi. Ha dere akwụkwọ a ka e jiri ya na-akụziri ndị nkwusa otú e si agụ asụsụ Kisi. Mgbe ha gosiri ndị ọchịchị Laịberịa akwụkwọ a, ha jara ha mma. Ndị ọchịchị a kpebikwara ibipụta akwụkwọ ahụ ma kesaara ya ọhaneze n’efu. E kesara akwụkwọ ahụ na Gini, Laịberịa, na Siera Lion. Akwụkwọ a nyekwaara ọtụtụ ndị Kisi aka ịmụta otú e si agụ na otú e si ede asụsụ ha. E mechara bipụta akwụkwọ a n’asụsụ ndị ọzọ. O nyekwaara ọtụtụ ndị aka ịmụta otú e si agụ na otú e si ede asụsụ ha.

Nwanna Nwaanyị Sia nwere eriri ojii na eriri na-acha ọbara ọbara ọ na-eji amata ihe ọ rụtara n’ozi ọma

Klas a nyekwaara ọtụtụ ndị aka ịna-eme nke ọma n’ọgbakọ. Otu n’ime ndị o nyeere aka bụ Nwanna Nwaanyị Sia Ngallah, onye dị afọ iri ise mgbe ahụ. Ọ bụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim. O nwere eriri ojii na eriri na-acha ọbara ọbara ọ na-eji amata ihe ọ rụtara n’ozi ọma. Ọ na-abụ ya kwusaa ozi ọma otu awa, ya amaa eriri ojii ahụ akpụ. Ya gachaa otu nletaghachi, ya amaa eriri nke ọbara ọbara ahụ akpụ. Ma, mgbe ọ malitere bịawa klas a, ọ mụtara otú e si ede ihe. O nyekwaara ya aka ịna-ede ihe ndị ọ rụtara n’ozi. Ugbu a ọ mụtarala otú e si agụ na otú e si ede, ọ na-ezizi ndị mmadụ ozi ọma ya edoo ha anya, na-akụzikwara ha ihe nke ọma. E mechakwara mee ya baptizim.

Ọtụtụ ọgbakọ na Siera Lion nakwa na Gini ka na-akụziri ndị nkwusa otú e si agụ na otú e si ede. Otu onye gbagotere n’ọchịchị na Siera Lion gwara ụfọdụ ụmụnna okwu mgbe o letara alaka ụlọ ọrụ anyị. Ọ sịrị: “Unu na-agbalị n’otú unu si akụziri ndị mmadụ Baịbụl. Ma ihe ọzọ magburu onwe ya unu na-eme bụ ịkụziri ndị obodo anyị otú e si agụ na otú e si ede.”

“Nkume” Etie Mkpu

Ugbu a ọtụtụ ndị mụtarala otú e si agụ na otú e si ede asụsụ ha, nsogbu ha bụzi na e nweghị ma akwụkwọ anyị ma akwụkwọ ndị ụwa n’asụsụ ha. Ndi Siera Lion gụrụ akwụkwọ na-agụ akwụkwọ ndị e dere n’asụsụ Bekee. Ndị Gini gụrụ akwụkwọ na-agụ ndị nke e dere n’asụsụ French. Oleezi ihe a ga-eme ka e nwee akwụkwọ e ji amụ Baịbụl n’asụsụ ha?

N’afọ 1959, ụmụnna abụọ gụrụ akwụkwọ na Gilied sụgharịrị otu traktị na otu akwụkwọ nta n’asụsụ Mende. Ma, ọ bụ mmadụ ole na ole nwetara akwụkwọ ndị a. Mgbe afọ iri gachara, a sụgharịrị akwụkwọ a na-akpọ “This Good News of the Kingdom” na nke a na-akpọ Living in Hope of a Righteous New World n’asụsụ Kisi. E kesara ihe dị ka puku iri atọ, e jikwa ha na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl.

N’afọ 1975, alaka ụlọ ọrụ bidoro ibipụta isiokwu ndị a na-amụ amụ n’Ụlọ Nche n’asụsụ Kisi. Obi tọrọ ụmụnna ndị Kisi ezigbo ụtọ mgbe ha nwetara ya. Otu nwanna nwoke detara akwụkwọ, sị: “Ihe a Jehova meere anyị amaka. O nweghị onye n’ime anyị gbajiri chọọkụ. N’oge mbụ, anyị niile dị ka nkume na-anaghị ekwu okwu. Ma ugbu a anyị nwerela Ụlọ Nche n’asụsụ Kisi, anyị nweziri ike ịkọrọ ndị mmadụ ihe ndị dị ebube Jehova na-arụrụ anyị.” (Luk 19:40) A sụgharịkwara akwụkwọ anyị ndị ọzọ n’asụsụ Kisi.

Ọtụtụ ụmụnna anyị na Siera Lion na Gini ka na-agụkwa akwụkwọ anyị ndị dị n’asụsụ Bekee ma ọ bụ n’asụsụ French. Ha ji asụsụ abụọ a amụ ihe n’ọmụmụ ihe. Ma n’oge na-adịbeghị anya, enweela ọtụtụ ọgbakọ ndị na-amụ ihe n’asụsụ ndị a na-asụ n’obodo ndị a. E nweekwala akwụkwọ anyị n’asụsụ Guez, Kisi, Krio, Maninkakan, Mende, Pula, na Susu. Broshọ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi na Gee Chineke Ntị dịcha n’asụsụ ndị a. Ọ na-adị mfe iji akwụkwọ ndị a kụziere ndị mmadụ Baịbụl. E jikwa ha na-enyere ọtụtụ ndị na-amaghị akwụkwọ aka ịmụta ihe ndị magburu onwe ha dị na Baịbụl.

Ịrụ Alaka Ụlọ Ọrụ

N’agbata afọ 1961 na afọ 1964, ụmụnna anyị nọ na Fritaụn nọ na-achọ ala ebe a ga-arụ alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ. Ha mechara chọta ya n’afọ 1965 n’okporo ámá a na-akpọ Wilkịnsịn. Ala a dị nso n’oké osimiri. Ọ dịkwa n’ebe kacha mma na Fritaụn.

Alaka ụlọ ọrụ a ga-enwe Ụlọ Nzukọ Alaeze, nwee ebe ndị ozi ala ọzọ ga-ebi, nweekwa ọfis dị iche iche. Mgbe a na-arụ ụlọ a, ndị na-akwọ ụgbọala na-eji nwayọọ nwayọọ agba n’okporo ámá Wilkịnsịn ka ha na ndị ha bu n’ụgbọala nwee ike ịhụ ihe a na-arụ. E nyefere Jehova ụlọ a n’abalị itoolu n’ọnwa asatọ n’afọ 1967. Ihe fọrọ obere ka o ruo narị mmadụ atọ bịara mgbe a na-enyefe Jehova ụlọ a. Ụfọdụ n’ime ndị bịaranụ bụ ndị ọnụ na-eru n’okwu n’obodo, nakwa ụfọdụ ụmụnna ndị jeerela Jehova ozi ọtụtụ afọ. Ọ bụ Nwanna “Bible” Brown mere ụmụnna ndị a baptizim n’afọ 1923.

Ebe a ka alaka ụlọ ọrụ na ụlọ ndị ozi ala ọzọ dị na Fritaụn dị malite n’afọ 1965 ruo afọ 1997

Mgbe a rụchara ụlọ ọhụrụ a, ọtụtụ ndị nwewere mmasị n’ozi ọma Ndịàmà Jehova na-ekwusa. O mekwara ka ndị na-ekwu na Ndịàmà Jehova enweghị ebe ha ji azụ eje na Siera Lion mechie ọnụ. Ụlọ ọhụrụ a mere ka o doo onye ọ bụla anya na Ndịàmà Jehova agbanyela mgbọrọgwụ na Siera Lion.

Ndị Ozi Ala Ọzọ Nyeere Ọtụtụ Ndị Aka Ha Abata n’Ọgbakọ

Ụmụnna ndị a nọ n’ozi ọma. Ha si n’ubi osikapa bụ́ apịtị apịtị na-agafe

Malite n’afọ 1975 gawa, ọtụtụ ndị ozi ala ọzọ e zitere na Siera Lion na Gini nyere aka ka ozi ọma biri ọkụ. Ụfọdụ n’ime ha ejeela ozi n’ọtụtụ mba ndị dị n’Afrịka. Ọ bụ ya mere ibi ebe ahụ enyeghị ha oké nsogbu. Ma, ndị ọzọ abịabeghị Afrịka mbụ. Hà ga-ebili n’obodo a a sị na ọ na-ata isi ndị ọcha? Legodị ihe ụfọdụ n’ime ha kwuru.

Hannelore Altmeyer kwuru, sị: “Ndị obodo a na-akwanyere mmadụ ibe ha ùgwù. Ha chọkwara ịmụ Baịbụl. Obi dị m ụtọ mgbe m hụrụ ka ụfọdụ n’ime ha malitere ibi ezigbo ndụ.”

Cheryl Ferguson kwuru na ihe nyere ya nsogbu ebe ahụ bụ ọrịa na oké okpomọkụ. Ma, ọ sị na ihe ndị ahụ enweghị ihe ha bụ ma e jiri ha tụnyere obi ụtọ o nwere mgbe ọ hụrụ ka ọtụtụ ndị obodo ahụ na-efe Jehova.

Christine Jones sịrị: “Ebe ahụ mere ka m mụtakwuo ịna-enwe ndidi. O nwere mgbe m jụrụ otu nwanna nwaanyị mgbe ndị ọbịa ya ga-abịa. Ihe ọ gwara m bụ, ‘ma ha abịaghị taa, ha abịa echi, ma ọ bụkwanụ nwanne echi.’ Ihe juru m anya bụ na ọ nọ na-agwa m na ‘ha ga-abịarịrị!’”

Robert Landis na nwunye ya Pauline sịrị: “Anyị dị ndị ozi ala ọzọ iri na anọ si n’obodo dị iche iche bịa biri n’ụlọ ndị ozi ala ọzọ dị na Fritaụn. Anyị nwere naanị ụlọ mposi abụọ, otu ebe a na-asa ahụ́, otu ígwè e ji asa ákwà, na otu usekwu. Nri anyị nwere anaghị ezuchara anyị. Nri ndị ahụ anachaghịkwa edozi ahụ́. Anyị anaghị ama mgbe a ga-ewere ọkụ na mgbe a ga-eweta ya. O nwedịrị mgbe anyị na-anọcha ụbọchị anọ ewetabeghị ọkụ. Ọtụtụ n’ime anyị rịara ịba na ọrịa ndị ọzọ a na-arịakarị n’obodo ahụ. Ihe a niile gaara eme ka ike gwụ anyị n’ozi. Ma, anyị mụtara ibi n’udo na ịgbaghara ibe anyị nakwa inwe obi ụtọ ma ihe siwe ike. Ozi ọma anyị na-aga na-atọ anyị ụtọ. Anyị niile na-eme ka ndị otu nne ji.”

Ebe Nwanna Nwaanyị Pauline Landis na-amụrụ mmadụ Baịbụl

Benjamin Martin na nwunye ya Monica kwuru na obodo Siera Lion so n’obodo ebe ahụ́ kacha ruo ha ala, nakwa na ha anaghị akwa mmakwaara na ha biri ebe ahụ. Ha kwukwara na naanị ihe na-ewute ha bụ na ha anọkwaghị ebe ahụ.

Frederick Morrisey na nwunye ya Barbara kwukwara, sị: “O nwere ụbọchị anyị hibọrọ chi n’ụlọ otu nwaanyị anyị na-amụrụ Baịbụl. Nwaanyị a bupụtaara anyị nri anyị na-eritụbeghị mbụ. Ọ gwara anyị na ihe ahụ ya bupụtaara anyị bụ ajụala. O kwukwara na ya ewepụchaala ezé ya. Ọ gwara anyị rie ya. Ma, anyị medara obi gwa ya na anyị agaghị eri. Ma o siri ọnwụ ka anyị rie ya. Ọ bụ eziokwu na ụjọ tụrụ anyị iri nri ahụ, anyị kelere ya maka otú o si jiri obi ya niile nye anyị nri ahụ. Otú ndị obodo ahụ si ele ọbịa mekwara ka anyị hụkwuo ha n’anya.”

Lynette Peters sịrị: “Abụ m onye ozi ala ọzọ ruo afọ iri anọ na atọ. Mụ na ndị ozi ala ọzọ karịrị otu narị ebiekwala. Obi dị m ụtọ na ozi a mere ka m mara ọtụtụ ndị. N’agbanyeghị na anyị niile na-akpa àgwà iche iche, anyị bu otu ihe n’obi na-eje ozi anyị. Obi dị m ụtọ na mụ na Chineke na-arụkọ ọrụ. Obi dịkwa m ụtọ na m so nyere ndị mmadụ aka ha amụta ihe Baịbụl na-akụzi!”

“Obi dị m ụtọ na mụ na Chineke na-arụkọ ọrụ. Obi dịkwa m ụtọ na m so nyere ndị mmadụ aka ha amụta ihe Baịbụl na-akụzi!”

Kemgbe afọ 1947, otu narị ndị ozi ala ọzọ na iri ise na anọ ejeela ozi na Siera Lion. Ndị ozi ala ọzọ iri asatọ na asatọ ejekwaala ozi na Gini. Ọtụtụ Ndịàmà Jehova ndị ọzọ abịakwala kwusaa ozi ọma ma na Siera Lion ma na Gini. A ka nwere ndị ozi ala ọzọ iri anọ na anọ na Siera Lion, nweekwa iri atọ na otu na Gini. Mbọ niile ha na-agba ikwusara ndị mmadụ ozi ọma na otú ha si eji obi ha niile eje ozi emeela ka ọtụtụ ndị fewe Chineke. Nwanna Alfred Gunn, onye so na Kọmitii Alaka kemgbe, sịrị: “Anyị anaghị echefu ndị ozi ala ọzọ ndị a echefu.”