Akwụkwọ Usoro Ihe Omume Mgbakọ Ukwu nke Afọ 2019
Akwụkwọ usoro ihe omume Mgbakọ Ukwu “Ịhụnanya Adịghị Ada Ada” nke Ndịàmà Jehova nke Afọ 2019.
Fraịdee
Isiokwu ihe omume ụbọchị Fraịdee si na 1 Tesalonaịka 4:9. Ọ sịrị: “Unu bụ ndị Chineke na-akụziri ịhụrịta ibe unu n’anya.”
Satọdee
Isiokwu ihe omume ụbọchị Satọdee si na Ndị Efesọs 5:2. Ọ sịrị: “Na-ejenụ ije n’ịhụnanya.”
Sọnde
Isiokwu ihe omume ụbọchị Sọnde si na Jud amaokwu nke 21. Ọ sịrị: “Nọrọnụ n’ịhụnanya Chineke.”
Ihe Ndị Bịara Mgbakọ Kwesịrị Ịma
Ihe ga-enyere ndị bịara mgbakọ aka, ha kwesịrị ịma.