Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Àgwà Ndị Na-adịghị Mma

Àgwà Ndị Na-adịghị Mma

Olee àgwà ndị na-adịghị mma Ndị Kraịst kwesịrị izere?

Iwe

Ọma 37:8, 9; Ilu 29:22; Kọl. 3:8

I nwekwara ike ịgụ Ilu 14:17; 15:18

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 37:18, 19, 23, 24, 31-35​—Ụmụnne Josef kpụụrụ ya, ree ya ka ọ gaa gbawa ohu, ghọgbuokwa Jekọb, ya echee na nwa ya ọ hụrụ n’anya anwụọla

    • Jen. 49:5-7​—A mara Simiọn na Livaị ikpe maka na ha were iwe ma mee ihe jọgburu onwe ya

    • 1 Sam. 20:30-34​—Mgbe iwe were Eze Sọl, ọ kparịrị Jonatan nwa ya, chọọkwa igbu ya

    • 1 Sam. 25:14-17​—Nebal ji iwe kparịa ndị Devid ziri ozi. Ihe a Nebal mere fọrọ obere ka ọ taa isi ụmụ nwoke niile nọ n’ụlọ ya

Esemokwu

Ịtụ ụjọ

Obi ọjọọ

Diut. 15:7, 8; Mat. 19:8; 1 Jọn 3:17

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 42:21-24​—Ụmụnne Josef mechara kwuo na ihe ha ji obi ọjọọ mee Josef wutere ha

    • Mak 3:1-6​—Otú ndị Farisii si jiri obi ọjọọ na-emeso ndị mmadu ihe wutere Jizọs nke ukwuu

Akwanyereghị Ndị Ọzọ Ùgwù

Gụọ isiokwu bụ́ “Akwanyereghị Ndị Ọzọ Ùgwù

Onwe mmadụ ibu ya isi

Gal. 5:26; Fil. 2:3

I nwekwara ike ịgụ Ilu 3:7; 26:12; Rom 12:16

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Sam. 15:1-6​—Onwe Absalọm nọ na-ebu ya isi. O mekwara ka obi ndị mmadụ dịrị n’ebe yanwa nọ kama ịdị n’ebe nna ya bụ́ Eze Devid nọ

    • Dan. 4:29-32​—Jehova tara Eze Nebukadneza ahụhụ maka na ọ dị mpako

Anyaụfụ; anyaukwu

Rom 13:9; 1 Pita 2:1

I nwekwara ike ịgụ Gal. 5:26; Taị. 3:3

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 26:12-15​—Jehova gọziri Aịzik maka na ọ na-arụsi ọrụ ike, ma ndị Filistia malitere inwere Aịzik anyaụfụ

    • 1 Eze 21:1-19​—Anyaukwu mere ka ajọ Eze Ehab chọọ iweghara ubi vaịn Nebọt. Ihe a meziri ka ebo Nebọt ebubo ma gbuo ya

Ịtụ mmadụ egwu

Ọma 118:6; Ilu 29:25; Mat. 10:28

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọnụ Ọgụ. 13:25-33​—Mmadụ iri n’ime ndị Izrel ahụ gara inyopụta ala Kenan tụrụ ụjọ ndị iro ha. Ihe ha kwuru mekwara ka egwu tụwa ndị Izrel ndị ọzọ

    • Mat. 26:69-75​—Pita onyeozi gọnahụrụ Jizọs ugboro atọ maka na ọ tụrụ egwu ihe ndị mmadụ ga-eme ya

Anyaukwu

Gụọ isiokwu bụ́ “Anyaukwu

Ịkpọasị

Ihu abụọ

Gụọ isiokwu bụ́ “Ihu Abụọ

Anyaụfụ

Gụọ isiokwu bụ́ “Anyaụfụ

Umengwụ

Ịhụ ego n’anya; ịhụ akụnụba n’anya

Mat. 6:24; 1 Tim. 6:10; Hib. 13:5

I nwekwara ike ịgụ 1 Jọn 2:15, 16

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Job 31:24-28​—N’agbanyeghị na Job bara ọgaranya, ọ hụrụ Chineke n’anya karịa akụnụba

    • Mak 10:17-27​—Otu nwa okorobịa nke bara ọgaranya hụrụ akụnụba ya n’anya nke ukwuu nke mere na o kweghị ahapụ ya ka o nwee ike ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs

Obi ilu

1 Sam. 30:6; Efe. 4:31; Kọl. 3:19

I nwekwara ike ịgụ Jems 3:14

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Obed. 10-14​—Chineke tara ndị Ịdọm ahụhụ maka na ha ji iwe mesie ụmụnne ha bụ́ ndị Izrel ike

Mmadụ ime ihe ọ na-ekwesịghị ime

Gụọ isiokwu bụ́ “Mmadụ Ime Ihe Ọ Na-ekwesịghị Ime

Mpako; nganga

Gụọ isiokwu bụ́ “Mpako

Ịna-esekarị okwu

Ilu 26:20; 1 Tim. 3:2, 3; Taị. 3:2

I nwekwara ike ịgụ Ilu 15:18; 17:14; 27:15; Jems 3:17, 18

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 13:5-9​—Ndị na-azụrụ Ebreham anụ ụlọ na ndị na-azụrụ Lọt anụ ụlọ sere okwu, ma Ebreham mere ka udo dị

    • Ikpe 8:1-3​—Ndị Ifrem sesara Gidiọn Onyeikpe okwu, ma n’ihi na Gidiọn dị umeala n’obi, o mere ka obi jụrụ ha

Nnupụisi

Mmadụ ịbụ onye ezi omume n’anya onwe ya

Ekli. 7:16; Mat. 7:1-5; Rom 14:4, 10-13

I nwekwara ike ịgụ Aịza. 65:5; Luk 6:37

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Mat. 12:1-7​—Jizọs gbara ndị Farisii n’anwụ maka na ha bụ ndị ezi omume n’anya onwe ha

    • Luk 18:9-14​—Jizọs mere ihe atụ nke gosiri na Chineke anaghị anabata ndị bụ́ ndị ezi omume n’anya onwe ha

Isi ike

Jere. 13:10

I nwekwara ike ịgụ Jere. 7:23-27; Zek. 7:11, 12

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Ihe 36:11-17​—Zedekaya bụ ajọ eze, ọ dịkwa isi ike. Àgwà ọjọọ ya mere ka Chineke taa ndị obodo ya ahụhụ

    • Ọrụ 19:8, 9​—Mgbe ụfọdụ kpọchiri obi jụ ikwere ihe Pọl onyeozi na-akụzi gbasara Alaeze Chineke, ọ kwụsịrị izi ha ozi ọma

Ile ihe anya otú na-ekwesịghị ekwesị

Mak 7:21-23; Efe. 5:17

I nwekwara ike ịgụ 1 Pita 2:15

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Sam. 8:10-20​—Ndị Izrel jụrụ ige Samuel onye amụma ntị mgbe ọ na-agwa ha na ọ dịghị mma ka ha nwee eze bụ́ mmadụ

    • 1 Sam. 25:2-13, 34​—Ọ fọrọ obere ka e gbuo ụmụ nwoke niile nọ n’ụlọ Nebal maka na ọ jụrụ ime ihe Devid rịọrọ ya

Inyo mmadụ enyo na ibo mmadụ ebubo

Job 1:9-11; 1 Tim. 6:4

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Sam. 18:6-9; 20:30-34​—Eze Sọl chere na Devid anaghị akwado ya, ọ gbakwara mbọ ime ka Jonatan na Devid see okwu