Aha E Ji Akwanyere Mmadụ Ùgwù
Ndị Kraịst hà kwesịrị ịna-etu ndị ndú okpukpe aha e ji akwanyere ha ùgwù?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Luk 18:18, 19—Ọ bụ eziokwu na Jizọs bụ ezigbo onye, ma, o kweghị ka e tuo ya “Ezigbo Onye Ozizi.” O kwuru na ọ bụ naanị Jehova bụ ezigbo onye
-
Gịnị mere na Ndị Kraịst ekwesịghị ịna-etu ndị ndú okpukpe aha, ndị dị ka, “Nna” ma ọ bụ “Onye Ndú”?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Mat. 23:9-12—Jizọs gwara anyị ka anyị ghara itu mmadụ aha ndị dị ka, “Nna” ma ọ bụ “Onye Ndú”
-
1 Kọr. 4:14-17—Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị weere Pọl onyeozi ka nna ha, ma, o nweghị ebe anyị gụtara a kpọrọ ya Fada Pọl ma ọ bụ ihe yiri ya
-
Olee ihe mere o ji dị mma ka Ndị Kraịst na-akpọ ibe ha ụmụnna ma na-emeso ha ka ụmụnne ha?
I nwekwara ike ịgụ Ọrụ 12:17; 18:18; Rom 16:1
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Mat. 12:46-50—Jizọs kwuru na ya weere ndị na-efe Chineke ka ụmụnne ya
-
Gịnị mere o ji dị mma ka Ndị Kraịst na-etu ndị ọchịchị, ndị okàikpe, na ndị ọzọ na-arụrụ ndị ọchịchị ọrụ aha e ji akwanyere ha ùgwù?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ọrụ 26:1, 2, 25—Mgbe Pọl onyeozi gwara ndị ọchịchị, dị ka Agrịpa na Festọs, okwu, o turu ha aha e ji akwanyere ha ùgwù
-