Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akọnuche

Akọnuche

Gịnị na-egosi na Jehova nyere mmadụ niile akọnuche?

Rom 2:14, 15

I nwekwara ike ịgụ 2 Kọr. 4:2

Gịnị nwere ike ime akọnuche onye nọgidere na-eme ihe ọjọọ?

1 Tim. 4:2; Taị. 1:15

I nwekwara ike ịgụ Hib. 10:22

Ọ bụrụ na obi siri anyị ike na ihe anyị na-eme dị mma, ọ̀ pụtara na ime ihe ahụ dị mma?

Jọn 16:2, 3; Rom 10:2, 3

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Ihe 18:1-3; 19:1, 2​—Jehova wesara Eze Jehoshafat iwe maka na o nyeere eze ọjọọ bụ́ Ehab aka

    • Ọrụ 22:19, 20; 26:9-11​—Pọl onyeozi kwuru otú o si chee na ya na-eme ihe dị mma mgbe ọ na-akpagbu ndị na-eso ụzọ Kraịst

Olee otú a ga-esi zụọ akọnuche nke ọma?

2 Tim. 3:16, 17; Hib. 5:14

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Sam. 24:2-7​—Akọnuche Eze Devid mere ka ọ kwanyere Eze Sọl, bụ́ onye Jehova tere mmanụ, ùgwù

Olee otú ụmụ mmadụ na-eme mmehie nwere ike isi nwee ezigbo akọnuche n’anya Chineke?

Efe. 1:7; Hib. 9:14; 1 Pita 3:21; 1 Jọn 1:7, 9; 2:1, 2

I nwekwara ike ịgụ Mkpu. 1:5

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Aịza. 6:1-8​—Jehova mere ka obi sie Aịzaya onye amụma ike na ya ga-agbaghara ya mmehie ya

    • Mkpu. 7:9-14​—Oké ìgwè mmadụ ahụ bụ ndị enyi Jehova n’ihi àjà Kraịst chụrụ nke o ji sachapụ mmehie ha

Gịnị mere anyị ji kwesị ime ihe akọnuche e ji Baịbụl zụọ gwara anyị?

Ọrụ 24:15, 16; 1 Tim. 1:5, 6, 19; 1 Pita 3:16

I nwekwara ike ịgụ Rom 13:5

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 2:25; 3:6-13​—Adam na Iv jụrụ ime ihe akọnuche ha gwara ha. Ihere mechakwara mee ha maka na ha nupụụrụ Chineke isi

    • Nehe. 5:1-13​—O nwere ndị Juu leghaara iwu Chineke anya ma na-ana ibe ha nnukwu ọmụrụ nwa ma ha binye ha ego. Gọvanọ bụ́ Nehemaya gwara ndị a okwu otú akọnuche ha ga-amaliteghachi ịrụ ọrụ

Gịnị mere anyị ji kwesị ịkpachara anya ka anyị ghara ime ka nwanna akọnuche ya na-esichabeghị ike zọhie ụkwụ?

Gịnị ka anyị kwesịrị ime gbasara akọnuche anyị?