Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Alụmdi na Nwunye

Alụmdi na Nwunye

Olee otú alụmdi na nwunye si malite?

Olee ụdị onye Onye Kraịst kwesịrị ịlụ?

Gịnị mere na ezigbo Onye Kraịst agaghị ekwe ka nwa ya merela baptizim lụọ onye na-enyefebeghị Jehova onwe ya, meekwa baptizim?

1 Kọr. 7:39; 2 Kọr. 6:14, 15

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 24:1-4, 7​—Mgbe Ebreham mere agadi, o kpebiri na ya ga-aga na nke ndị na-efe Jehova chọtara Aịzik nwa ya nwaanyị, ọ bụghị na nke ndị Kenan, bụ́ ndị na-efe chi dị iche iche

    • Jen. 28:1-4​—Aịzik gwara Jekọb nwa ya ka ọ ghara ịlụ nwaanyị Kenan, kama ka ọ gaa na nke ndị na-efe Jehova chọrọ nwaanyị

Olee otú obi na-adị Jehova ma onye na-efe ya gaa lụrụ onye na-anaghị efe ya?

Diut. 7:3, 4

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Eze 11:1-6, 9-11​—Eze Solomọn leghaara iwu Chineke nyere anya, gaa lụọ ụmụ nwaanyị ndị mba ọzọ. Ụmụ nwaanyị ndị a mekwara ka Solomọn kpeere arụsị. Ihe a Solomọn mere mere ka Jehova wesa ya iwe

    • Nehe. 13:23-27​—Nehemaya mere ka Jehova. O wesara ndị Izrel lụrụ ụmụ nwaanyị ndị mba ọzọ na-anaghị efe Jehova ezigbo iwe. Ọ dọkwara ha aka ná ntị

Gịnị mere o ji dị mma ka onye mmadụ ga-alụ bụrụ onye ji obi ya niile na-efe Jehova, bụrụkwa onye nwere ezi aha?

Ilu 18:22; 31:10, 28

I nwekwara ike ịgụ Efe. 5:28-31, 33

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Sam. 25:2, 3, 14-17​—Nebal di Abigel bụ ọgaranya, ma ọ dị aka ike, na-akparịkwa mmadụ. Ihe a mere ka ọ ghara ịbụ ezigbo di

    • Ilu 21:9​—Ọ bụrụ na anyị akpachaghị anya họrọ onye anyị ga-alụ, anyị nwere ike ghara ịna-enwe obi ụtọ n’ezinụlọ anyị, obi agharakwa iru anyị ala

    • Rom 7:2​—Pọl onyeozi kwuru na nwaanyị lụọ di, ọ ga na-edebe iwu di ya bụ́ onye na-ezughị okè. N’ihi ya, nwaanyị ma ihe ga-asa anya ná mmiri tupu o kweta mmadụ di

Ịkwadebe maka alụmdi na nwunye

Tupu nwoke echewe echiche ịlụ nwaanyị, gịnị mere o ji kwesị ido ya anya na ọ ga-elekọtali nwunye ya na ụmụaka?

1 Tim. 5:8

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ilu 24:27​—Tupu nwoke alụọ nwaanyị ma mụta ụmụ, o kwesịrị ịna-arụsi ọrụ ike iji na-akpata ihe ọ ga-eji lekọta ezinụlọ ya

Gịnị mere na ihe kwesịrị ịbụ mkpa nwoke na nwaanyị na-akpa maka ọlụlụ bụ inweta ezigbo ndụmọdụ na ịmata ibe ha nke ọma, ọ bụghị otú ha dị n’elu ahụ́?

Ilu 13:10; 1 Pita 3:3-6

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Rut 2:4-7, 10-12​—Boaz chọpụtara ụdị mmadụ Rut bụ. Otú o si mee ya bụ na o leruru otú Rut si arụ ọrụ anya, chọpụta otú o si elekọta Naomi, jụọ ndị mmadụ ajụjụ banyere ya, hụkwa otú o si hụ Jehova n’anya

    • Rut 2:8, 9, 20​—Rut hụrụ na Boaz dị obiọma, na-emesapụ aka, hụkwa Jehova n’anya

Gịnị mere Jehova ji chọọ ka nwoke na nwaanyị ghara ime omume rụrụ arụ mgbe ha na-akpa maka ọlụlụ?

Gal. 5:19; Kọl. 3:5; 1 Tesa. 4:4

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ilu 5:18, 19​—Ọ bụ naanị ndị bụ́ di na nwunye kwesịrị ịna-eme ihe ụfọdụ iji gosi na ha hụrụ ibe ha n’anya

    • Abụ Solo. 1:2; 2:6​—Mgbe nwa agbọghọ Shulem na nwa okorobịa na-azụ atụrụ na-akpa, ha si otú kwesịrị ekwesị gosi na ha hụrụ ibe ha n’anya

    • Abụ Solo. 4:12; 8:8-10​—Nwa agbọghọ Shulem jidere onwe ya, o meghịkwa omume rụrụ arụ. E ji ya tụnyere ubi a gbara ogige

Gịnị mere nwoke na nwaanyị ji kwesị ịlụ alụ otú iwu obodo kwuru?

Ọrụ onye bụ́ di

Gịnị ka Jehova chọrọ ka di na-eme?

Olee onye Onye Kraịst bụ́ di kwesịrị iṅomi?

Gịnị mere di ji kwesị ịna-egosi na ọ hụrụ nwunye ya n’anya ma na-aghọta otú obi dị ya nakwa ihe ndị na-akpa ya?

Kọl. 3:19; 1 Pita 3:7

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 21:8-12​—Jehova gwara Ebreham ka o gee Sera nwunye ya ntị n’agbanyeghị na aro ọ tụrụ amasịghị Ebreham

    • Ilu 31:10, 11, 16, 28​—A kọwara ezigbo nwaanyị n’amaokwu ndị a. Di ma ihe anaghị emegbu ụdị ezigbo nwaanyị a ma ọ bụ na-akọcha ya, kama, ọ na-atụkwasị ya obi, na-etokwa ya

    • Efe. 5:33​—Ihe Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ dee gosiri na nwunye kwesịrị ịma na di ya hụrụ ya n’anya

Ọrụ onye bụ́ nwunye

Olee ọrụ dị mkpa Jehova nyere onye bụ́ nwunye?

Ọrụ onye bụ́ nwunye ọ̀ bụ ọrụ a ga-eleda anya?

Jen. 1:26-28, 31; 2:18

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ilu 1:8; 1 Kọr. 7:4​—Chineke nyere ndị nwunye na ndị nne ikike ụfọdụ n’ezinụlọ

    • 1 Kọr. 11:3​—Pọl onyeozi kwuru na Jehova haziri ka onye ọ bụla nwee onye bụ́ onyeisi ya ma e wepụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile

    • Hib. 13:7, 17​—N’ọgbakọ, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị kwesịrị ịna-erubere ndị na-eduzi ọgbakọ isi ma na-akwado ha

Olee otú nwanna nwaanyị di ya na-anaghị efe Jehova ga-esi na-eme Jehova obi ụtọ?

Gịnị mere Onye Kraịst bụ́ nwunye ga-eji na-akwanyere di ya ùgwù?

Efe. 5:33

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

Olee ụdị nwunye Baịbụl toro?

Ilu 19:14; 31:10, 13-31

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 24:62-67​—Mgbe mama Aịzik nwụchara, Ribekah nyeere di ya bụ́ Aịzik aka, kasiekwa ya obi

    • 1 Sam. 25:14-24, 32-38​—Abigel chebere di ya bụ́ onye nzuzu, zọpụtakwa ndị ezinụlọ ya mgbe o weturu obi rịọ Devid ka o meere ha ebere

    • Esta 4:6-17; 5:1-8; 7:1-6; 8:3-6​—Esta nwunye eze gakwuuru di ya bụ́ eze ma rịọ ya ka o chebe ndị Chineke. Ihe a Esta mere gaara ata isi ya ebe ọ bụ na di ya agwaghị ya bịa

Idozi Esemokwu

Olee ihe Baịbụl kwuru ndị nwere ike inyere di na nwunye aka idozi nsogbu n’ezinụlọ ha?

Olee ihe Baịbụl kwuru ndị nwere ike inyere di na nwunye aka ime ezigbo mkpebi gbasara ego?

Luk 12:15; Fil. 4:5; 1 Tim. 6:9, 10; Hib. 13:5

Gụọkwa isiokwu bụ́ “Ego

Olee ihe Baịbụl kwuru ndị nwere ike inyere di na nwunye aka ikwekọrịta otú ha na ndị ezinụlọ nke nwoke na ndị ezinụlọ nke nwaanyị ga-esi na-emekọ ihe?

Olee ihe Baịbụl kwuru ndị nwere ike inyere di na nwunye aka n’okwu gbasara mmekọahụ?

Gịnị mere o ji dị mkpa ka di na nwunye lekwasị anya n’àgwà ọma ibe ha na-akpa kama ilekwasị anya n’ebe ha na-anaghị emeta?

Gịnị mere o ji dị mma ka di na nwunye dozie nsogbu ha ozugbo kama ibuwere ibe ha iwe n’obi?

Gịnị mere na n’agbanyeghị ihe merenụ, Ndị Kraịst anaghị ewe iwe ọkụ, ha anaghị eji olu ike ekwu okwu, ha anaghị akpọ iyi, ha anaghịkwa eti ibe ha ihe?

Gịnị kwesịrị ịbụ mkpa di na nwunye ma ọ bụrụ na ha ekwekọrịtaghị n’otu ihe?

Olee ngọzi di na nwunye ga-enweta ma ha mee Jehova onye mbụ n’ezinụlọ ha?

Iwu Chineke gbasara alụmdi na nwunye

Gịnị bụ iwu Jehova gbasara mmekọahụ na alụmdi na nwunye?

Onye Kraịst ò kwesịrị ịlụ karịa otu nwoke ma ọ bụ otu nwaanyị?

Olee otú anyị si mara na ọ bụ nwoke na nwaanyị kwesịrị ịbụ di na nwunye?

Gịnị mere na di na nwunye ekwesịghị ịhapụ ibe ha?

Gịnị ka Baịbụl kwuru na ọ bụ naanị ya nwere ike ime ka di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst gbaa alụkwaghịm?

Olee otú obi na-adị Jehova ma di na nwunye gbaa alụkwaghịm n’abụghị na e nwere onye kwara iko n’ime ha?

Ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye mmadụ anwụọ, onye ahụ ò nwere ike ịlụgharị di ma ọ bụ nwunye?