Egwu
Egwu; ụjọ
Diut. 20:8; Ikpe 7:3; Ilu 29:25
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
Ọpụ. 32:1-4, 21-24—Erọn kpụụrụ ndị Izrel arụsị n’ihi egwu ihe ha nwere ike ime ya
Mak 14:50, 66-72—Mgbe e jidere Jizọs, ndịozi ya niile hapụrụ ya gbaa ọsọ n’ihi ụjọ. Otú ụjọ si jide Pita medịrị o ji gọnahụ Kraịst
Amaokwu Baịbụl ndị na-akasi obi:
I nwekwara ike ịgụ Mkpu. 2:10
Ihe e kwuru na Baịbụl nke na-akasi obi:
2 Ihe 20:1-17, 22-24—Eze Jehoshafat na ndị Juda ndị ọzọ tụrụ egwu ndị agha dị ọtụtụ ma dị ike bịara ịlụso ha agha, ma, Jehova mesiri ha obi ike ma napụta ha
Luk 12:4-12—Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ihe mere na ha ekwesịghị ịna-atụ mmadụ ụjọ ma ọ bụ na-echegbu onwe ha maka ihe ha ga-ekwu ma a kpụpụta ha n’ihu ndị ọchịchị