Ememme
Ememme Ndị Kraịst na-eme
Gịnị bụ naanị otu ememme e nyere Ndị Kraịst iwu ka ha na-eme?
Obi na-adị ndị na-efe Chineke ụtọ izukọ fee ya ofufe
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
2 Ihe 30:1, 6, 13, 14, 18-27—Eze Hezekaya haziri Ememme Ngabiga pụrụ iche
-
Ememme Ndị Kraịst na-anaghị eme
Gịnị mere na Ndị Kraịst ekwesịghị iso ndị okpukpe ụgha na-eme ememme ha?
1 Kọr. 10:21; 2 Kọr. 6:14-18; Efe. 5:10, 11
Gụọkwa isiokwu bụ́ “Ikpekọ Okpukpe Ọnụ”
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ọpụ. 32:1-10—Ndị Izrel kpasuru Jehova iwe mgbe ha nọ na-efe Jehova, na-emekwa ihe ndị okpukpe ụgha na-eme
-
Ọnụ Ọgụ. 25:1-9—Jehova tara ndị Izrel ahụhụ maka na ha so ndị na-efe arụsị mee ememme ha, kwaakwa iko
-
Ndị Kraịst hà kwesịrị ịna-agba Krismas?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Luk 2:1-5—A mụrụ Jizọs n’oge a nọ na-edeba aha ndị mmadụ n’akwụkwọ. Ọ dịghị ka ndị Rom hà ga-agwa ndị Juu ha na-achị, ndị na-emere ha isi ike, ka ha gaa ebe dị iche iche ha kwesịrị ịnọ deba aha n’akwụkwọ n’oge udu mmiri oyi na-atụ ndị mmadụ
-
Luk 2:8, 12—N’oge a mụrụ Jizọs, ndị na-azụ atụrụ bi n’ọhịa na-azụ atụrụ. A sị na ọ bụ n’ọnwa Disemba, ọ gaara esi ike ha ibi n’ọhịa n’ihi na ọ bụ oge oyi
-
Ndị Kraịst hà kwesịrị ịna-eme ememme ụbọchị ọmụmụ?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Jen. 40:20-22—Fero, onye na-ekpere arụsị mere ememme ụbọchị a mụrụ ya. O gburu mmadụ ụbọchị ahụ
-
Mat. 14:6-11—Eze Herọd, nwoke obi tara mmiri, nke nọ na-emegide ụmụazụ Kraịst, mere ememme ụbọchị ọmụmụ ya. Ọ bụ ihe so ememme ahụ mere o ji gbuo Jọn Onye Na-eme Baptizim
-
Ememme dị iche iche Iwu Mosis kwuru ka a na-eme
Ndị Kraịst hà kwesịrị ịna-edebe Iwu Mosis ma ọ bụkwanụ ịna-eme ememme ndị Iwu Mosis kwuru ka a na-eme?
I nwekwara ike ịgụ Gal. 4:4, 5, 9-11; Hib. 8:7-13; 9:1-3, 9, 10, 24
Ndị Kraịst hà kwesịrị ịna-edebe Ụbọchị Izu Ike?
I nwekwara ike ịgụ Ọpụ. 31:16, 17
Ememme ndị e ji eto mba
Ndị Kraịst hà kwesịrị ịna-eme ememme mba ji echeta ike ọchịchị ha kpara?
Gụọkwa isiokwu bụ́ “Ọchịchị—Ndị Kraịst Anaghị Etinye Aka n’Ọchịchị Ụwa A”
Ndị Kraịst hà kwesịrị iso na-eme ememme e ji echeta agha mba lụrụ?
Gụọkwa isiokwu bụ́ “Ọchịchị—Ndị Kraịst Anaghị Etinye Aka n’Ọchịchị Ụwa A” nakwa isiokwu bụ́ “Agha”
Ndị Kraịst hà kwesịrị iso na-eme ememme e ji efe ndị a ma ama?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ọrụ 12:21-23—Ofufe ndị mmadụ fere Herọd Agrịpa nke Mbụ mere ka Chineke taa ya ahụhụ
-
Ọrụ 14:11-15—Banabas na Pọl ekweghị ka e fee ha
-
Mkpu. 22:8, 9—Mmụọ ozi Jehova jụrụ ka e fee ya
-