Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezi Omume

Ezi Omume

Olee naanị onye nwere ike ikpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe bụ́ ihe ọjọọ?

Diut. 32:4; Ezik. 33:17-20

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 18:23-33​—Jehova gosiri Ebreham na ọ bụ Onyeikpe na-eme ihe ziri ezi

    • Ọma 72:1-4, 12-14​—N’abụ ọma a e si n’ike mmụọ nsọ dee, e toro Eze Bụ́ Mezaya, onye na-eme nnọọ ezi omume ka Jehova

Olee otú ime ihe otú Jehova kwuru si abara anyị uru?

Ọma 37:25, 29; Jems 5:16; 1 Pita 3:12

I nwekwara ike ịgụ Ọma 35:24; Aịza. 26:9; Rom 1:17

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Job 37:22-24​—Elaịhu toro Jehova maka ihe dị mma ọ na-eme. Otú Jehova si dị ukwuu na-eme ka ndị ohu ya na-akwanyere ya ùgwù

    • Ọma 89:13-17​—Ọbụ abụ toro Jehova maka na o ji ezi omume tọọ ntọala ocheeze ya

Gịnị ka ịchọ ezi omume Chineke pụtara?

Ezik. 18:25-31; Mat. 6:33; Rom 12:1, 2; Efe. 4:23, 24

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 6:9, 22; 7:1​—Noa leziri anya mee ihe niile Jehova gwara ya mee. Ihe a gosiri na ọ bụ onye ezi omume

    • Rom 4:1-3, 9​—Ebreham bụ onye ezi omume n’anya Jehova maka na o nwere okwukwe na Jehova

Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-eme ezi omume maka na anyị hụrụ Jehova n’anya ọ bụghị maka na anyị chọrọ ka ndị ọzọ hụ anyị?

Mat. 6:1; 23:27, 28; Luk 16:14, 15; Rom 10:10

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Mat. 5:20; 15:7-9​—Jizọs gwara ndị mmadụ ka ha na-eme ezi omume, ma ọ gwara ha ka ha ghara ịna-eme ya ka ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ, bụ́ ndị ihu abụọ

    • Luk 18:9-14​—Jizọs mere otu ihe atụ iji gbazie ndị na-achọ igosi na ha bụ ndị ezi omume karịa ndị ọzọ

Gịnị mere ime ihe dị mma ji ka ime ezi omume mma?

Gịnị mere anyị ga-eji ghara ịbụ ndị ezi omume n’anya onwe anyị? Gịnịkwa mere anyị ga-eji ghara ịna-agba mbọ ka anyị gosi na anyị ka ndị ọzọ bụrụ ndị ezi omume?