Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịdọ Aka ná Ntị

Ịdọ Aka ná Ntị

Gịnị mere Baịbụl ji bụrụ ihe kacha mma iji adọ mmadụ aka ná ntị?

Gịnị mere e kwesịrị iji na-eduzi anyị niile ma na-agbazi anyị?

Ilu 16:2, 25; Jere. 10:23

I nwekwara ike ịgụ Jere. 17:9

Gịnị ka aka ná ntị Jehova na-adọ anyị na-egosi?

Ilu 3:11, 12; Hib. 12:7-9

I nwekwara ike ịgụ Diut. 8:5; Ilu 13:24; Mkpu. 3:19

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Sam. 12:9-13; 1 Eze 15:5; Ọrụ 13:22​—N’agbanyeghị na Eze Devid mere mmehie ndị jọrọ ezigbo njọ, Jehova ji ịhụnanya dọọ ya aka ná ntị, gbagharakwa ya

    • Jona 1:1-4, 15-17; 3:1-3​—Mgbe Jona onye amụma gbara ọsọ n’ihi ozi Jehova dunyere ya, Jehova dọrọ ya aka ná ntị ma hapụ ya ka ọ gaa ozi ahụ

Gịnị mere na anyị ekwesịghị iji aka ná ntị Chineke na-adọ anyị egwu egwu?

Mmadụ jụ ịnabata aka ná ntị Chineke na-adọ ya, gịnị ka o nwere ike ịkpatara ya?

Ilu 1:24-26; 13:18; 15:32; 29:1

I nwekwara ike ịgụ Jere. 7:27, 28, 32-34

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jere. 5:3-7​—Chineke dọrọ ndị ya aka ná ntị, ma ha anabataghị ya, n’ihi ya, ọ tara ha ahụhụ iji dọkwuo ha aka ná ntị

    • Zef. 3:1-8​—Ọdachi dakwasịrị ndị bi na Jeruselem maka na ha ekweghị anabata aka ná ntị Jehova dọrọ ha

Olee uru ịnabata aka ná ntị Jehova na-adọ anyị ga-abara anyị?

Ilu 4:13; 1 Kọr. 11:32; Taị. 1:13; Hib. 12:10, 11

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Diut. 30:1-6​—Mosis onye amụma kwuru otú Jehova ga-esi agọzi ndị nabatara aka ná ntị ọ dọrọ ndị ya

    • 2 Ihe 7:13, 14​—Jehova gwara Eze Solomọn uru ndị mmadụ ga-erite ma ha nabata aka ná ntị ọ na-adọ ha

Olee otú aka ná ntị a dọrọ ndị ọzọ nwere ike isi baara anyị uru?

Gịnị mere anyị ekwesịghị ịṅụrị ọṅụ ma a dọọ ndị ọzọ aka ná ntị?

Gịnị ka anyị ga-eme ka aka ná ntị Chineke na-adọ anyị baara anyị uru?

Josh. 1:8; Jems 1:25

I nwekwara ike ịgụ Diut. 17:18, 19; Ọma 119:97

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Ihe 22:11-13​—Eze Devid gwara Solomọn nwa ya na Jehova ga-agọzi ya ma ọ bụrụhaala na o lezie anya na-eme ihe Jehova kwuru

    • Ọma 1:1-6​—Jehova kwere ndị niile na-agụ iwu ya ma na-atụgharị uche na ya nkwa na ọ ga-agọzi ha

Gịnị mere ndị nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya ji adọ ha aka ná ntị?

Gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Nne na Nna

Gịnị ka ụmụaka kwesịrị ime ma ndị mụrụ ha dọọ ha aka ná ntị?