Ịgha Ụgha
Olee otú Jehova si ele ndị na-anaghị emezu nkwa ha anya?
I nwekwara ike ịgụ Ọma 15:4; Mat. 5:37
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
Ọpụ. 9:27, 28, 34, 35—Fero kwetara na ọ ga-ahapụ ndị Chineke ka ha lawa, ma o meghị ihe o kwuru
Ezik. 17:11-15, 19, 20—Jehova tara Eze Zedekaya ahụhụ maka na o meghị ihe o kwere eze Babịlọn ná nkwa
Ọrụ 5:1-10—Ananayas na Safaịra ghara ụgha mgbe ha kwuru na ha nyere ọgbakọ ihe niile ha retere n’ala ha
Olee otú Jehova si ele ndị na-ekwutọ ndị ọzọ anya?
Ọma 15:1-3; Ilu 6:16-19; 16:28; Kọl. 3:9
I nwekwara ike ịgụ Ilu 11:13; 1 Tim. 3:11
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
2 Sam. 16:1-4; 19:24-30—Zaịba kwutọrọ Mefiboshet bụ́ nna ya ukwu
Mkpu. 12:9, 10—Ekwensu, ma ọ bụ Onye nkwutọ, na-ebo ndị na-efe Chineke ebubo mgbe niile