Ịhụ Akụnụba n’Anya
Baịbụl ò kwuru na ọ dị njọ mmadụ inwe ego ma ọ bụ akụnụba?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
1 Eze 3:11-14—Jehova gọziri Eze Solomọn ma nye ya ọtụtụ akụnụba n’ihi na ọ dị umeala n’obi
-
Job 1:1-3, 8-10—Job bara ezigbo ọgaranya, ma ihe kacha ya mkpa bụ adịm ná mma ya na Jehova
-
Gịnị mere na ịkpakọba ego na akụnụba anaghị eme ka mmadụ na-enwe ezigbo obi ụtọ?
Olee oge akụnụba na-anaghị abara anyị uru?
Olee nsogbu kachanụ akụnụba na ego nwere ike ịkpata?
Olee otú akụnụba nwere ike isi ghọgbuo mmadụ?
Ilu 11:4, 18, 28; 18:11; Mat. 13:22
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ọrụ 8:18-24—Saịmọn dị iberiibe, o chere na ọ ga-eji ego zụta ọkwá n’ọgbakọ
-
Gịnị nwere ike ifunahụ anyị ma anyị hụ ego n’anya?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Mak 10:17-23—Otú nwa okorobịa nke bara ọgaranya ekweghị eso Jizọs maka na ọ hụrụ ego ya na akụnụba ya n’anya nke ukwuu
-
1 Tim. 6:17-19—Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst bara ọgaranya ka ha ghara ịdị mpako maka na ọ ga-eme ka ha na Chineke ghara ịdị ná mma
-
Olee otú ịhụ akụnụba n’anya nwere ike isi mee ka okwukwe mmadụ jụọ oyi ma mee ka onye ahụ na Chineke gharazie ịdị ná mma?
Diut. 8:10-14; Ilu 28:20; 1 Jọn 2:15-17
I nwekwara ike ịgụ Ọma 52:6, 7; Emọs 3:12, 15; 6:4-8
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Job 31:24, 25, 28—Job ghọtara na o kwesịghị ịtụkwasị akụnụba obi n’ihi na ọ ga-apụta na ọ naghị atụkwasị Chineke obi
-
Luk 12:15-21—Mgbe Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị banyere ịhụ akụnụba n’anya, o kwuru banyere otu nwoke nke na-abụghị ọgaranya n’anya Chineke
-
Olee otú ihe ndị anyị nwere ga-esi na-eju anyị afọ?
Olee ụdị akụnụba nke kacha mkpa? Maka gịnị?
Ilu 3:11, 13-18; 10:22; Mat. 6:19-21
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Hag. 1:3-11—Jehova si n’ọnụ Hagaị onye amụma gwa ndị ya na ọ gaghị agọzi ha maka na ha nọ na-agbasi mbọ ike na-arụ ụlọ nke ha, na-emekwa ka obi ruo ha ala ma ha anaghị akwado ofufe Jehova
-
Mkpu. 3:14-19—Jizọs baara ọgbakọ dị na Leodisia ezigbo mba maka na akụnụba dị ha mkpa karịa ijere Chineke ozi
-
Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na Jehova ga-enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa?