Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikpekọ Okpukpe Ọnụ

Ikpekọ Okpukpe Ọnụ

Ọ̀ bụ Chineke ka ndị nọ n’okpukpe niile na-efe?

Jehova ọ̀ na-anabata okpukpe niile n’agbanyeghị na ihe nke ọ bụla na-akụzi dị iche n’ihe ibe ya na-akụzi?

Mat. 7:13, 14; Jọn 17:3; Efe. 4:4-6

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Josh. 24:15​—Joshụa kwuru na anyị kwesịrị ikpebi ma ànyị chọrọ ịna-efe Jehova ka ànyị chọrọ ịna-efe chi ụgha dị iche iche

    • 1 Eze 18:19-40​—Jehova ji Ịlaịja onye amụma gosi na ndị na-efe ezi Chineke ekwesịghị ịna-efe chi ọzọ, dị ka, ịna-efe Bel

Olee otú Jehova si ele chi mba dị iche iche na ofufe a na-efe ha anya?

Olee otú obi na-adị Jehova ma ọ hụ ebe ndị sị na ha na-efe ya na-eme ihe ndị ọ kpọrọ asị?

Aịza. 1:13-15; 1 Kọr. 10:20-22; 2 Kọr. 6:14, 15, 17

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọpụ. 32:1-10​—Jehova were ezigbo iwe mgbe ndị Izrel gwara Erọn ka o meere ha chi, ya emeere ha chi nwa ehi ha sị na ha ‘ga-eji meere Jehova ememme’

    • 1 Eze 12:26-30​—Eze Jeroboam kpụrụ chi nwa ehi abụọ ma kwuo na ha na-anọchi anya Jehova. Ihe o ji kpụọ ha bụ ka ndị obodo ya ghara ịna-aga ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Ihe a o mere mere ka ndị obodo ya mehie

Olee otú Jehova si kụziere ndị Izrel na ha ekwesịghị iso ndị mba ọzọ na-efe chi ọzọ?

Olee ihe Jehova na-eme mgbe ọ bụla ndị Izrel fere chi ọzọ?

Ikpe 10:6, 7; Ọma 106:35-40; Jere. 44:2, 3

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Eze 11:1-9​—Eze Solomọn lụrụ ụmụ nwaanyị ndị mba ọzọ, ha emee ka ya na ndị ọzọ fewe arụsị. Ihe a were Jehova iwe

    • Ọma 78:40, 41, 55-62​—Esaf kwuru otú isi ndị Izrel nupụụrụ Jehova na arụsị ha fere si wute Jehova, ya ajụ ha

Jizọs ọ̀ nabatara ozizi ọ bụla ndị okpukpe na-ezi nke Okwu Chineke na-akwadoghị?

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Mat. 16:6, 12​—Jizọs ji ozizi ndị Farisii na ndị Sadusii tụnyere ihe iko achịcha n’ihi na ozizi ụgha nwere ike ịgbasa ngwa ngwa, meekwa ka mmadụ na Chineke gharazie ịdị ná mma

    • Mat. 23:5-7, 23-33​—Jizọs kwuru na àgwà ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii na-akpa jọgburu onwe ya maka na ha na-ezi ozizi ụgha, bụrụkwa ndị ihu abụọ

    • Mak 7:5-9​—Jizọs baara ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii mba maka na ha ji ọdịnala ụmụ mmadụ kpọrọ ihe karịa Okwu Chineke

Jizọs ọ̀ chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya nọrọ n’okpukpe dị iche iche?

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jọn 15:4, 5​—Jizọs ji osisi vaịn tụnyere otú ya na ndị na-eso ụzọ ya na ibe ha ga-esi adị n’otu

    • Jọn 17:1, 6, 11, 20-23​—N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, o kpere ekpere ka Jehova mee ka ndị niile na-eso ụzọ ya dịrị n’otu

Ọgbakọ Ndị Kraịst ndị e nwere n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga hà kweere ihe ibe ha kweere ma na-efe otu ụdị ofufe?

Ọrụ 16:4, 5; Rom 12:4, 5

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọrụ 11:20-23, 25, 26​—Ọgbakọ ndị dị n’Antiọk nakwa na Jeruselem rụkọrọ ọrụ ọnụ ma dị n’otu

    • Rom 15:25, 26; 2 Kọr. 8:1-7​—Ọgbakọ dị iche iche e nwere n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga gosiri na ha hụrụ ibe ha n’anya mgbe ha na-agbatara ha ọsọ enyemaka n’oge ọdachi. Ihe a gosiri na ha dị n’otu

Chineke ọ̀ na-anabata okpukpe naanị maka na ndị nọ na ya sị na ha nwere okwukwe na Kraịst?

Ọ bụrụ na ndị nọ n’okpukpe ana-akụzi ihe dị iche n’ihe Kraịst na ndịozi ya kụziri, Chineke ọ̀ ga-anabata ofufe ha?

Ọrụ 20:29, 30; 1 Tim. 4:1-3

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Mat. 13:24-30, 36-43​—Jizọs mere otu ihe atụ na-egosi na otú ahụ ahịhịa na-esi epulite ma tochie n’ubi ka ọtụtụ Ndị Kraịst adịgboroja ga-esi abata n’ọgbakọ Ndị Kraịst ma weghara ya

    • 1 Jọn 2:18, 19​—Mgbe Jọn onyeozi merela agadi, ka ọ na-erula ná ngwụcha oge ndịozi, o kwuru na e nweela ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst

Gịnị na-eme ma ọ bụrụ na a hapụ mmadụ ka ọ na-ezi ozizi ụgha ma ọ bụ na-akpa àgwà ọjọọ n’ọgbakọ?

Gịnị ka Ndị Kraịst ga-emerịrị ka ha wee dịrị n’otu?

Gịnị mere Ndị Kraịst ji kwesị izere okpukpe ụgha?

Gịnị mere o ji dị mma ka e mee ka ndị mmadụ mara banyere ozizi ụgha ndị okpukpe na-ezi?

Gịnị mere na o kwesịghị iju anyị anya ma ndị nọ n’okpukpe ụgha megidewe anyị?