Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịmụ Ihe

Ịmụ Ihe

Gịnị mere Onye Kraịst ji kwesị ịna-amụchi Okwu Chineke anya?

Ọma 1:1-3; Ilu 18:15; 1 Tim. 4:6; 2 Tim. 2:15

I nwekwara ike ịgụ Ọrụ 17:11

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọma 119:97-101​—Ọbụ abụ kwuru na o ji iwu Chineke kpọrọ ihe nakwa na idebe ha na-abara ya uru

    • Dan. 9:1-3, na ihe e dere n’ala ala peeji amaokwu nke 2​—Mgbe Daniel onye amụma mụrụ Akwụkwọ Nsọ, ọ ghọtara na afọ iri asaa ndị Izrel kwesịrị ịnọ na Babịlọn agwụwala

Gịnị mere anyị ji kwesị ịnọgide na-amụ ihe?

Hib. 6:1-3; 2 Pita 3:18

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ilu 4:18​—Otú ahụ ìhè si enwusikwu ike ruo mgbe chi bọchara ka Jehova na-eme ka eziokwu Baịbụl na-edokwu ndị ji Okwu Chineke kpọrọ ihe anya

    • Mat. 24:45-47​—Jizọs buru amụma na ọ ga-ahọpụta “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” onye ga na-enye ndị na-efe Chineke ihe ndị ga-eme ka ha na Jehova dịrị ná mma n’oge ikpeazụ

Gịnị mere amamihe si na Baịbụl ji ka amamihe dị n’akwụkwọ ndị mmadụ dere mma?

Olee ihe Jehova kwere nkwa na ya ga-emere ndị ji obi ha niile na-amụ Baịbụl?

Gịnị ka anyị kwesịrị ịrịọ Chineke n’ekpere tupu anyị amụwa Baịbụl?

Gịnị mere anyị ji kwesị iji ihe niile “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ji akụziri anyị Okwu Chineke kpọrọ ihe?

Mat. 24:45-47

I nwekwara ike ịgụ Mat. 4:4; 1 Tim. 4:15

Gịnị mere anyị ga-eji na-agba mbọ ka anyị ghọta eziokwu Baịbụl na-akụzi?

Gịnị mere anyị ji kwesị inweta amamihe na nghọta?

Gịnị mere anyị ji kwesị iwetu obi mgbe anyị na-agụ Baịbụl ma na-echebara ihe anyị na-agụ echiche?

Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-eche banyere otú anyị ga-esi na-eme ihe Baịbụl kwuru eme?

Gịnị mere anyị ji kwesị ichebara otú anyị ga-esi na akọwara ndị ọzọ ihe anyị mụtara echiche?

Olee uru ọ ga-abara anyị ma ọ bụrụ na anyị na-amụchi eziokwu dị na Baịbụl anya?

2 Pita 1:13; 3:1, 2

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

Olee uru ndị nọ n’ezinụlọ ga-erite ma ha na-amụkọ Okwu Chineke ọnụ?

Efe. 6:4

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 18:17-19​—Jehova chọrọ ka Ebreham kụziere ndị ezinụlọ ya ka ha na-erubere Chineke isi ma na-eme ihe dị mma

    • Ọma 78:5-7​—Ndị Izrel na-adị akụziri ụmụ ha gbasara Jehova, ka ndị ga-anọchi ha, wee tụkwasị Jehova obi

Olee otú iso ụmụnna anyị amụ ihe n’ọgbakọ si enyere anyị aka?

Hib. 10:25

I nwekwara ike ịgụ Ilu 18:1