Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịṅụ Mmanya

Ịṅụ Mmanya

Baịbụl ò kwuru na anyị ekwesịghị ịṅụ mmanya na-aba n’anya?

Ọma 104:14, 15; Ekli. 9:7; 10:19; 1 Tim. 5:23

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jọn 2:1-11​—Ọrụ ebube mbụ Jizọs rụrụ bụ ime ka mmiri ghọọ mmanya dị mma n’ebe e nwere oriri agbamakwụkwọ. Ihe a mere ka ihere ghara ime di na nwunye ahụ

Olee nsogbu ịṅụ oké mmanya ma o bụ ịṅụbiga mmanya ókè nwere ike ịkpatara anyị?

Olee otú ndị ohu Chineke si ele ịṅụbiga mmanya ókè anya?

1 Kọr. 5:11; 6:9, 10; Efe. 5:18; 1 Tim. 3:2, 3

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 9:20-25​—Ọ bụ mmanya na-egbu Noa mere nwa nwa ya ji mee mmehie dị oké njọ

    • 1 Sam. 25:2, 3, 36​—Nebal bụ onye nzuzu dị aka ike. Ọ na-akpakwa àgwà ọjọọ ndị dị ka ịṅụbiga mmanya ókè

    • Dan. 5:1-6, 22, 23, 30, 31​—Eze Belshaza ṅụrọchara anya wee malite ịkparị Jehova Chineke. E gburu ya n’abalị ahụ

Gịnị mere anyị ji kwesị ịkpachara anya ka anyị ghara ịna-aṅụ oké mmanya, ọ bụrụgodị na anyị anaghị aṅụ ya ruo n’ókè igbu anyị egbu?

Olee otú anyị nwere ike isi nyere nwanna na-aṅụ oké mmanya aka?