Iru Uju
Olee akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl ndị na-egosi na iru uju ma mmadụ nwụọ adịghị njọ?
Jen. 23:2; 24:67; 37:34, 35; 42:36; Jọn 11:19, 31, 33-36
I nwekwara ike ịgụ 2 Sam. 1:17-27; Ọrụ 9:36-39
Olee ihe na-egosi na ịkasi ndị na-eru uju obi na-agụsi Jehova agụụ ike?
Olee otú ịmata ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ nwere ike isi kasie anyị obi?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Luk 20:37, 38—Obi siri Jizọs ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ nke na o kwuru na ha dị ndụ n’anya Chineke
-
Jọn 11:5, 6, 11-14—Jizọs ji ọnwụ tụnyere ụra mgbe ezigbo enyi ya bụ́ Lazarọs nwụrụ
-
Hib. 2:14, 15—Pọl onyeozi kwuru na anyị ekwesịghị ikwe ka egwu ọnwụ were anyị mere ohu
-
Olee otú aha mmadụ nwere ike isi dị mma n’oge ọnwụ ya karịa n’oge a mụrụ ya?
Olee otú Baịbụl si kọwaa ọnwụ? Oleekwa ihe Chineke ga-eme ya?
Gịnị mere obi ji sie anyị ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ?
Aịza. 26:19; Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Na Baịbụl, a kọrọ akụkọ mmadụ itoolu a kpọlitere n’ọnwụ. Asatọ n’ime ha biri n’ụwa mgbe a kpọlitechara ha. Nke ọ bụla n’ime akụkọ ndị a a kọrọ banyere ndị a kpọlitere n’ọnwụ ga-akasị ndị mmadụ nwụnahụrụ obi ma mee ka ha nwee olileanya na ndị ha nwụrụ anwụ ga-ebilite n’ọnwụ n’ọdịnihu
-
1 Eze 17:17-24—Ịlaịja onye amụma kpọlitere nwa nwaanyị isi mkpe onye Zarefat n’ọnwụ. Zarefat a dị na Saịdọn
-
2 Eze 4:32-37—Ịlaịsha onye amụma kpọlitere otu nwatakịrị nwoke onye Shunem ma kpọnye ya ndị mụrụ ya
-
2 Eze 13:20, 21—Mgbe ozu otu nwoke na-adịbeghị anya ọ nwụrụ metụrụ ọkpụkpụ Ịlaịsha, nwoke ahụ si n’ọnwụ bilie
-
Luk 7:11-15—N’otu obodo a na-akpọ Nen, Jizọs hụrụ otu nwaanyị isi mkpe na ndị so ya na-aga ili nwa ya nwoke nwụrụ anwụ, ya akpọlite nwa ahụ n’ọnwụ
-
Luk 8:41, 42, 49-56—Jizọs kpọlitere nwa Jaịrọs n’ọnwụ. Jaịrọs bụ onyeisi oche ụlọ nzukọ
-
Jọn 11:38-44—Jizọs kpọlitere enyi ya bụ́ Lazarọs n’ọnwụ, ya na ụmụnne ya bụ́ Mata na Meri ebirikwa
-
Ọrụ 9:36-42—Pita onyeozi kpọlitere Dọkas n’ọnwụ. Nwaanyị a bụ Onye Kraịst e ji obiọma na mmesapụ aka mara
-
Ọrụ 20:7-12—Pọl onyeozi kpọlitere Yutikọs, bụ́ otu nwa okorobịa nwụrụ mgbe o si na windo dapụ
-
-
Jehova kpọlitere Jizọs Kraịst ka ọ malite ịdị ndụ ebighị ebi n’eluigwe, bụ́ ihe na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ga-emezu ihe niile o kwere nkwa imere anyị n’ọdịnihu
-
Jizọs bụ onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ ya agaa ka o biri n’eluigwe ruo mgbe ebighị ebi. Ma, ọ gaghị abụ onye ikpeazụ. A ga-akpọlitekwa ndị e tere mmanụ na-eso ụzọ ya, ndị dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000), ka ha gaa biri n’eluigwe ruo mgbe ebighị ebi
-
Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị na-eru uju maka na mmadụ nwụnahụrụ ha aka?