Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Irubere Chineke Isi

Irubere Chineke Isi

Gịnị bụ irubere Chineke isi?

Ọma 18:23-25; 26:1, 2; 101:2-7; 119:1-3, 80

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Lev. 22:17-22​—Jehova chọrọ ka e jiri anụmanụ “ahụ́ dị mma,” nke na-enweghịkwa nkwarụ, chụọrọ ya àjà. Okwu Hibru e si sụgharịta “nke ahụ́ dị mma” na nke e si sụgharịta “irubere Chineke isi” bụ nwanne. Okwu a na-egosi na onye na-erubere Jehova isi ga-edebe iwu ya n’ihe niile

    • Job 1:1, 4, 5, 8; 2:3​—Otú Job si bie ndụ na-egosi na onye chọrọ ịna-erubere Jehova isi kwesịrị ịna-akwanyere ya nnọọ ùgwù, jiri obi ya niile na-efe ya, ma na-ezere ime ihe ọ bụla ọ kpọrọ asị

Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-erubere Jehova isi?

Gịnị nwere ike inyere anyị aka ịna-erubere Jehova isi?

Olee otú anyị nwere ike isi malite ịna-erubere Jehova isi? Oleekwa otú anyị ga-esi nọgide na-erubere ya isi?

Josh. 24:14, 15; Ọma 101:2-4

I nwekwara ike ịgụ Diut. 5:29; Aịza. 48:17, 18

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Job 31:1-11, 16-33​—Job si otú o si na-ebi ndụ kwa ụbọchị gosi na ya na-erubere Jehova isi. Otú o si mee ya bụ na ọ naghị eme omume rụrụ arụ. O nwekwaara ndị ọzọ obiọma ma kwanyere ha ùgwù. O fere naanị Jehova, o feghịkwa arụsị ọ bụla. O ji adịm ná mma ya na Jehova kpọrọ ihe kama iji akụnụba kpọrọ ihe

    • Dan. 1:6-21​—N’agbanyeghị na ndị na-anaghị efe Jehova gbara Daniel na mmadụ atọ bụ́ ndị enyi ya gburugburu, ha rubere isi ma n’iwu Jehova nyere ndị Izrel banyere ihe ndị ha kwesịrị ịna-eri ma n’iwu ndị ọzọ

Ọ bụrụ na mmadụ na-eme mmehie ndị dị oké njọ, ò nwere ike imecha rubewere Jehova isi?

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Eze 9:2-5; Ọma 78:70-72​—Mgbe Eze Devid chegharịrị ná mmehie ndị o mere, Jehova gbaghaara ya ma were ya ka onye na-erubere ya isi

    • Aịza. 1:11-18​—N’agbanyeghị na Jehova kpọrọ ndị ya ndị ihu abụọ na ndị mmehie, o kwere nkwa na ya ga-eme ka ha dị ọcha ma ha chegharịa ma kwụsị ime ihe ọjọọ