Ịtachi Obi
Ndị ohu Jehova hà kwesịrị ịna-atachi obi?
Olee otú anyị si mara na ụfọdụ ndị agaghị enwe mmasị n’ozi ọma anyị ma ọ bụkwanụ na ha ga-akpagbu anyị maka ozi ọma anyị na-ezi?
Mat. 10:22; Jọn 15:18, 19; 2 Kọr. 6:4, 5
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
2 Pita 2:5; Jen. 7:23; Mat. 24:37-39—N’agbanyeghị na Noa “nọ na-ekwusa ihe bụ́ ezi omume,” ndị mmadụ egeghị ya ntị. Ọ bụ naanị ya na ezinụlọ ya ka Iju Mmiri na-egbughị
-
2 Tim. 3:10-14—Pọl onyeozi gwara Timoti na ya diri ahụhụ na ihe mgbu dị iche iche, gbaakwa ya ume ka o mee ka ya
-
Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-atụ anya na ndị ezinụlọ anyị nwere ike ịkpagbu anyị?
Mat. 10:22, 36-38; Luk 21:16-19
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Jen. 4:3-11; 1 Jọn 3:11, 12—Ken bụ onye ọjọọ. Ọ bụ ya mere o ji gbuo Ebel nwanne ya, bụ́ onye ezi omume
-
Jen. 37:5-8, 18-28—Otu n’ime ihe mere ụmụnne Josef ji tụba ya n’olulu ma mechaa ree ya ka ọ bụrụ ohu bụ maka na ọ gwara ha na Jehova mere ka ọ rọọ nrọ pụrụ iche
-
Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịtụ egwu ọnwụ mgbe a na-akpagbu anyị?
I nwekwara ike ịgụ Mkpu. 2:10
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Dan. 3:1-6, 13-18—Shedrak, Mishak, na Abednego jụwapụrụ isi na ha agaghị efe arụsị n’agbanyeghị na eze kwuru na ya ga-egbu ha ma ọ bụrụ na ha efeghị arụsị ya
-
Ọrụ 5:27-29, 33, 40-42—Ndịozi Jizọs akwụsịghị ịna-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na a gwara ha na a ga-egbu ha ma ọ bụrụ na ha akwụsịghị
-
Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-erubere Jehova isi ọ bụrụgodị na a dọrọ anyị aka ná ntị?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ọnụ Ọgụ. 20:9-12; Diut. 3:23-28; 31:7, 8—Aka ná ntị Jehova dọrọ Mosis mere ka ọ ghara inweta ihe ọ tụrụ anya ya. N’agbanyeghị ya, ọ nọ na-ejere Jehova ozi ruo ọnwụ
-
2 Eze 20:12-18; 2 Ihe 32:24-26—A baara Eze Hezekaya mba mgbe o mere mmehie, ya ewetuo onwe ya ala nabata mba ahụ ma nọgide na-efe Jehova
-
Gịnị mere o nwere ike iji siere anyị ike ịnọgide na-efe Jehova ma ndị ọzọ kwụsị ife ya?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ọma 73:2-24—Mgbe otu ọbụ abụ hụrụ otú ihe si na-agaziri ndị ajọ omume, ya echewe na ife Jehova abaghị uru
-
Jọn 6:60-62, 66-68—N’agbanyeghị na ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs kwụsịrị iso ya, Pita onyeozi ji okwukwe nọgide na-eso ụzọ ya
-
Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-atachi obi?
Ịnọ Jehova nso
Ịmụ Okwu Chineke na ịtụgharị uche na ya
Isi n’ala ala obi anyị na-akpọku Jehova n’ekpere mgbe niile
Rom 12:12; Kọl. 4:2; 1 Pita 4:7
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Dan. 6:4-11—Daniel onye amụma akwụsịghị ịna-ekpe ekpere mgbe niile n’agbanyeghị nkata a kpara igbu ya maka ekpere ọ na-ekpe
-
Mat. 26:36-46; Hib. 5:7—N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, o kpere ekpere n’esepụghị aka ma gwa ndị ọzọ ka ha na-ekpekwa ekpere mgbe niile
-
Ịgachi ọmụmụ ihe anya ma soro ụmụnna anyị na-efe Jehova
Uche anyị ịdị n’ihe dị iche iche Jehova kwere nkwa na ọ ga-emere anyị n’ọdịnihu
Ịhụkwu Jehova, ụmụnna anyị, na ezi omume n’anya
Ime ka okwukwe anyị sikwuo ike
Ile ịta ahụhụ anya otú kwesịrị ekwesị
Olee uru anyị ga-erite ma anyị nọgide na-atachi obi?
Ọ na-eme ka a sọpụrụ Jehova Chineke
Ilu 27:11; Jọn 15:7, 8; 1 Pita 1:6, 7
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Job 1:6-12; 2:3-5—Setan kwuru na ihe mere Job ji efe Jehova bụ maka na Jehova gọziri Job. Naanị ihe ga-egosi na ihe Setan kwuru abụghị eziokwu bụ ma Job tachie obi n’ọnwụnwa bịaara ya
-
Rom 5:19; 1 Pita 1:20, 21—Jizọs rubeere Chineke isi ruo mgbe ọ nwụrụ. O nupụrụghị Jehova isi otú Adam nupụrụ. Jizọs si otú a gosi na onye zuru okè nwere ike irubere Chineke isi n’agbanyeghị ọnwụnwa na-enweghị atụ
-
Anyị na-agba ndị ọzọ ume ka ha na-atachi obi
Ịtachi obi na-enye aka eme ka ozi anyị na-aga nke ọma
Obi ga-adị Jehova mma. Ọ ga-agọzikwa anyị
Mat. 24:13; Luk 21:19; 1 Kọr. 15:58; Hib. 10:36
I nwekwara ike ịgụ Rom 2:6, 7; Jems 1:12