Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jizọs Kraịst

Jizọs Kraịst

Olee otú dị mkpa Jehova si eji Jizọs eme ihe ndị o zubere?

Ọrụ 4:12; 10:43; 2 Kọr. 1:20; Fil. 2:9, 10

I nwekwara ike ịgụ Ilu 8:22, 23, 30, 31; Jọn 1:10; Mkpu. 3:14

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Mat. 16:13-17​—Pita onyeozi kwuru na Jizọs bụ Kraịst na Ọkpara Chineke

    • Mat. 17:1-9​—Mgbe Jizọs nwoghara, mmadụ atọ bụ́ ndịozi ya nọ ebe ahụ. Ha nụrụ mgbe Jehova si n’eluigwe kwuo na Jizọs bụ Ọkpara ya

Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, olee ihe ndị mere ka ọ dị iche n’ụmụ mmadụ ndị ọzọ?

Jọn 8:58; 14:9, 10; Kọl. 1:15-17; 1 Pita 2:22

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Mat. 21:1-9​—Mgbe Jizọs gbaara jakị bata Jeruselem, o mezuru amụma e buru banyere onye Jehova họọrọ ka ọ bụrụ Eze Bụ́ Mezaya

    • Hib. 7:26-28​—Pọl onyeozi kwuru otú Jizọs, bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà ka ibe ya, si dị iche ná nnukwu ndị nchụàjà ndị ọzọ

Gịnị ka ọrụ ebube dị iche iche Jizọs rụrụ na-akụziri anyị banyere ya na Nna ya?

Jọn 3:1, 2; 5:36

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Mat. 4:23, 24​—Jizọs gwọrọ ụdị ọrịa dị iche iche, gosikwa na ya ka ndị mmụọ ọjọọ ike

    • Mat. 14:15-21​—Jizọs rụrụ ọrụ ebube mgbe o ji ogbe achịcha ise na azụ̀ abụọ nyejuo ọtụtụ puku ndị agụụ na-agụ afọ

    • Mat. 17:24-27​—Jizọs rụrụ ọru ebube wee nye Pita ego o ji tụọ ụtụ isi, ka ndị mmadụ ghara ilewe Jizọs na ndịozi ya anya ọjọọ

    • Mak 1:40, 41​—Jizọs meteere otu onye ekpenta ebere ma gwọọ ya. Ihe a o mere gosiri na o nwere mmasị ịgwọ ndị mmadụ ọrịa

    • Mak 4:36-41​—Jizọs mere ka oké ifufe kwụsị ife. Ihe a gosiri na Nna ya nyere ya ikike ịkwụsị ọdachi ndị na-emere onwe ha

    • Jọn 11:11-15, 31-45​—Anya mmiri gbara Jizọs n’ihi na Lazarọs enyi ya nwụrụ. Ọ kpọlitekwara ya n’ọnwụ. Ihe a na-egosi na ma ọnwụ ma ihe ọnwụ na-eme ụmụ mmadụ adịghị Jizọs mma

Gịnị bụ isi ihe Jizọs nọ na-akụziri ndị mmadụ mgbe ọ nọ n’ụwa?

Gịnị bụ àgwà ndị magburu onwe ha e ji mara Jizọs mgbe ọ nọ n’ụwa? Chọpụta otú dị iche iche o si gosi na . . .

O mere ka ịbịakwute ya dịrị ndị mmadụ mfe​—Mat. 13:2; Mak 10:13-16; Luk 7:36-50

Ọ na-enwere ndị ọzọ ọmịiko; ọ na-emere ndị ọzọ ebere​—Mak 5:25-34; Luk 7:11-15

O nwere obi ike​—Mat. 4:2-11; Jọn 2:13-17; 18:1-6

Ọ dị umeala n’obi​—Mat. 11:29; 20:28; Jọn 13:1-5; Fil. 2:7, 8

Ọ hụrụ ndị ọzọ n’anya​—Jọn 13:1; 14:31; 15:13; 1 Jọn 3:16

Ọ na-erube isi​—Luk 2:40, 51, 52; Hib. 5:8

O nwere amamihe​—Mat. 12:42; 13:54; Kọl. 2:3

Gịnị mere Jizọs ji jiri ndụ ya chụọ àjà? Olee uru àjà a ọ chụrụ baara anyị?

Olee ihe anyị ji kwesị ịna-enwe aṅụrị na Jizọs Kraịst achịwala n’eluigwe?

Ọma 72:12-14; Dan. 2:44; 7:13, 14; Mkpu. 12:9, 10

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọma 45:2-7, 16, 17​—Ihe dị n’amaokwu ndị a na-egosi na Eze Chineke họpụtara ga-emeri ndị iro ya niile nakwa na ọ ga-eji eziokwu, ịdị umeala n’obi, na ezi omume na-achị

    • Aịza. 11:1-10​—Jizọs chịwa ụwa, ọ ga-abụ paradaịs nke udo dị na ya

Gịnị ka Jizọs ga-eme n’oge na-adịghị anya?