Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmadụ Inyefe Chineke Onwe Ya

Mmadụ Inyefe Chineke Onwe Ya

Olee ihe anyị kwesịrị iji maka ya nyefee Jehova Chineke onwe anyị?

Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele Baịbụl anya ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ife Chineke?

Gịnị ka anyị kwesịrị ịma gbasara otú Chineke si anapụta anyị ná mmehie?

Gịnị ka anyị ichegharị ná mmehie anyị mere n’oge gara aga pụtara?

Ọrụ 3:19; 26:20

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Luk 19:1-10​—Zakịọs, onyeisi ndị ọnaụtụ, na-apụnara ndị mmadụ ihe, ma o mechara chegharịa, nyeghachikwa ndị mmadụ ihe ọ pụnaara ha

    • 1 Tim. 1:12-16​—Pọl onyeozi kọọrọ anyị otú Chineke si meere ya ebere ma gbaghara ya mgbe ọ kwụsịrị ime ihe ọjọọ ndị ọ na-emebu

Anyị kwụsịchaa ime ihe ọjọọ, oleekwa ihe ọzọ anyị kwesịrị ime?

Olee iwu ndị anyị ga-edebe ma anyị chọọ ka Chineke nabata ofufe anyị?

1 Kọr. 6:9-11; Kọl. 3:5-9; 1 Pita 1:14, 15; 4:3, 4

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Kọr. 5:1-13​—Pọl onyeozi gwara ndị nọ n’ọgbakọ dị na Kọrịnt ka ha si n’ọgbakọ chụpụ otu nwoke na-akwa iko

    • 2 Tim. 2:16-19​—Pọl onyeozi gwara Timoti ka ọ ghara ige ihe ndị si n’ọgbakọ pụọ na-ekwu, bụ́ ihe ndị na-agbasa ka ọnyá na-aba aba

Gịnị mere na ndị na-efe Chineke ekwesịghị ịkwado ndị ọchịchị ụwa a?

Aịza. 2:3, 4; Jọn 15:19

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jọn 6:10-15​—Mgbe Jizọs rụchara ọrụ ebube o ji nye ìgwè mmadụ nri, ndị mmadụ chọwara ime ya eze, ma Jizọs si ebe ahụ pụọ

    • Jọn 18:33-36​—Jizọs mere ka o doo anya na e nweghị ihe jikọrọ Alaeze ya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa a

Olee otú mmụọ nsọ si enyere anyị aka ife Chineke?

Jọn 16:13; Gal. 5:22, 23

I nwekwara ike ịgụ Ọrụ 20:28; Efe. 5:18

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọrụ 15:28, 29​—Mmụọ nsọ duziri òtù na-achị isi nọ na Jeruselem ha ekpebie otu ihe gbara ọkpụrụkpụ gbasara ibi úgwù

Olee otú anyị ga-esi na-ejere Chineke ozi otú Jizọs Kraịst si jeere ya?

Gịnị mere Ndị Kraịst nyefere Chineke onwe ha kwesịrị iji mee baptizim?

Mat. 28:19, 20; Ọrụ 2:40, 41; 8:12; 1 Pita 3:21

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Mat. 3:13-17​—Ihe kacha Jizọs mkpa bụ ime uche Nna ya, o mekwara baptizim iji gosi na ọ bụ ya bụ ihe kacha ya mkpa

    • Ọrụ 8:26-39​—Otu nwoke na-eje ozi n’obí eze ndị Etiopia, onye na-ekpe okpukpe ndị Juu, kwuru ka e mee ya baptizim mgbe ọ matara eziokwu gbasara Jizọs