Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nchegbu

Nchegbu

Ị̀ na-echegbu onwe gị maka na ị bụ ogbenye, maka na agụụ na-anyụ gị ịkpakwụ, ma ọ bụ maka na i nweghị ebe obibi?

Ilu 10:15; 19:7; 30:8

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ákwá 3:19​—Jeremaya onye amụma na ọtụtụ ndị Juu ndị ọzọ enweghịzi ebe obibi mgbe e bibichara Jeruselem

    • 2 Kọr. 8:1, 2; 11:27​—O nwere oge Ndị Kraịst nọ na Masedonia na-ahụghị tụrụ rachaa. O nwekwara mgbe Pọl onyeozi na-anaghị enwe nri, ákwà, na ebe obibi

  • Amaokwu Baịbụl ndị na-akasi obi:

Ị̀ na-echegbu onwe gị maka na i nweghị enyi, ị nọ naanị gị, ma ọ bụkwanụ na i chere na e nweghị onye hụrụ gị n’anya?

Job 19:19; Ekli. 4:10, 12

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Eze 18:22; 19:9, 10​—Ịlaịja onye amụma chere na ọ bụ naanị ya fọdụrụ ná ndị na-efe Jehova ezigbo ofufe

    • Jere. 15:16-21​—Owu nọ na-ama Jeremaya onye amụma maka na ndị ọ na-ezi ozi anaghị ege ya ntị, kama ihe bụ́ mkpa ha bụ oriri na ọṅụṅụ

  • Amaokwu Baịbụl ndị na-akasi obi:

  • Ihe e kwuru na Baịbụl nke na-akasi obi:

    • 1 Eze 19:1-19​—Jehova nyeere Ịlaịja onye amụma aka, gee ya ntị nke ọma ka ọ na-ekwu ihe na-echegbu ya. O mekwara ka obi sie Ịlaịja ike mgbe o chetaara ya ụdị ike ọ na-akpa

    • Jọn 16:32, 33​—N’agbanyeghị na Jizọs ma na ndị na-eso ụzọ ya ga-ahapụ ya gbaa ọsọ, o doro ya anya na ọ nọghị naanị ya