Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nna

Ndị Nna

Gịnị bụ ọrụ onye bụ́ nna?

Diut. 6:6, 7; Efe. 6:4; 1 Tim. 5:8; Hib. 12:9, 10

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 22:2; 24:1-4​—Ebreham hụrụ Aịzik n’anya. Ọ bụ ya mere o ji mee ihe niile o nwere ike ime iji nyere ya aka ka ọ chọta nwaanyị na-efe Jehova ọ ga-alụ

    • Mat. 13:55; Mak 6:3​—A kpọrọ Jizọs “nwa ọkwá nkà,” kpọọkwa ya “ọkwá nkà.” Ihe a gosiri na ọ ga-abụ na Josef kụziiri nwa ya nwoke a ọrụ a mmadụ nwere ike iji baara onwe ya uru

Gịnị mere ndị nọ n’ezinụlọ ji kwesị ịhụ ndị nna n’anya ma jiri ọrụ Chineke nyere ha n’ezinụlọ kpọrọ ihe?

Ọpụ. 20:12

I nwekwara ike ịgụ Mat. 6:9

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Hos. 11:1, 4​—Jehova ji otú o si eme ihe ka Nna egosi na ya hụrụ ndị bụ́ nna n’anya ma na-akwanyere ha ùgwù. Ọ na-akụziri ndị ya ihe, na-elekọtakwa ha nke ọma otú nna si elekọta ụmụ ya

    • Luk 15:11-32​—Akụkọ a Jizọs kọrọ bụ ihe o ji gosi na ya ji ndị bụ́ nna kpọrọ ihe ma na-akwanyere ha ùgwù. Akụkọ a na-akụziri anyị otú Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova si emere ndị mmehie chegharịrịnụ ebere