Ndị Nne na Nna
Gịnị mere Jehova ji malite alụmdi na nwunye?
Olee otú ndị nne na nna kwesịrị isi were ụmụ ha?
Gụọkwa isiokwu bụ́ “Ụmụaka; Ndị Na-eto Eto”
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Jen. 33:4, 5—Jekọb weere ụmụ ya ka onyinye Jehova nyere ya
-
Ọpụ. 1:15, 16, 22; 2:1-4; 6:20—Amram na Jokebed mụtara Mosis. Ha mekwara ihe gaara ata isi ha iji chebe ya
-
Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị imere ụmụ ha?
Diut. 6:6, 7; 11:18, 19; Ilu 22:6; 2 Kọr. 12:14; 1 Tim. 5:8
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
1 Sam. 1:1-4—Elkena na-akpọ ndị ezinụlọ ya aga ememme a na-eme na Shaịlo. Ọ na-ahụkwa na nwa ya ọ bụla so na-efe Jehova
-
Luk 2:39, 41—Josef na Meri na-akpọkarị ụmụ ha esi Nazaret aga Jeruselem maka Ememme Ngabiga
-
Olee uru ịzụ ụmụaka ka ha na-erubere Jehova isi bara?
I nwekwara ike ịgụ 2 Tim. 3:14, 15
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
1 Sam. 2:18-21, 26; 3:19—Nne na nna Samuel kpọgara ya n’ụlọ nsọ ka ọ na-eje ozi ebe ahụ. Ma, ha na-aga eleta ya, na-ewegakwara ya ihe ndị dị ya mkpa. Mgbe o toro, ọ hụrụ Jehova n’anya, jirikwa obi ya niile na-efe ya
-
Luk 2:51, 52—Jizọs nọ na-erubere nne na nna ya isi n’agbanyeghị na ha ezughị okè
-
Ebee ka ndị nne na nna ga-esi nweta ihe ga-enyere ha aka ịzụ ụmụ ha?
Diut. 6:4-9; Efe. 6:4; 2 Tim. 3:14-17
I nwekwara ike ịgụ Ọma 127:1; Ilu 16:3
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ikpe 13:2-8—Mgbe otu mmụọ ozi gwara Manoa na nwunye ya ga-amụ nwa nwoke, ọ jụrụ ya otú ọ ga-esi azụ nwa ahụ a ga-amụ
-
Ọma 78:3-8—Jehova chọrọ ka ndị nne na nna kụziere ụmụ ha ihe ha mụtara na Baịbụl
-
Olee ihe nwere ike ime ka mmadụ kpebie na ya agaghị efe Jehova n’agbanyeghị na ndị mụrụ ya na-efe ya?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Jen. 6:1-5; Jud 6—N’agbanyeghị na ndị mmụọ ozi na Jehova nọ n’eluigwe kemgbe ọtụtụ afọ, ụfọdụ n’ime ha kpebiri inupụrụ Jehova isi
-
1 Sam. 8:1-3—N’agbanyeghị na Samuel bụ ezigbo onye amụma ji obi ya niile na-efe Jehova, ụmụ ya nọ na-eme ihe ọjọọ
-
Olee mgbe ndị nne na nna kwesịrị ịmalite kụziwere ụmụ ha ihe Chineke chọrọ ka ha na-eme?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Diut. 29:10-12, 29; 31:12; Ezra 10:1—Mgbe ndị Izrel gbakọtara ka ha mụta banyere Jehova, ha kpọtara ụmụ ha ka ha soro mụta banyere Jehova
-
Luk 2:41-52—Kwa afọ, Josef na Meri na-akpọ ụmụ ha, ma Jizọs, aga Ememme Ngabiga n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem
-
N’aka onye ka ndị nne na nna kwesịrị isi mụta ichebe ụmụ ha ka ndị ọzọ ghara imerụ ha ahụ́ ma ọ bụ imebi ha?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ọpụ. 19:4; Diut. 32:11, 12—Jehova ji onwe ya tụnyere ugo nke na-ebu ụmụ ya na nku ya, na-echebe ha, ma na-elekọta ha
-
Aịza. 49:15—Jehova kwere nkwa na ọ ga-elekọta ndị na-efe ya ma na-echebe ha karịadị otú nwaanyị na-enye nwa ara na-eme
-
Mat. 2:1-16—Setan gbara mbọ ka o gbuo Jizọs mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ. Otú o si mee ya bụ na o dugara ndị ji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu na nke Eze Herọd. Ma, Jehova gwara Josef ka ọ kpọrọ ndị ezinụlọ ya gawa Ijipt si otú ahụ chebe nwa ya
-
Mat. 23:37—Jizọs ji otú o si agụsi ya agụụ ike inyere ndị obodo ha aka tụnyere otú nnekwu ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya ma na-echebe ha
-
Gịnị mere ndị nne na nna ji kwesị ịkụziri ụmụ ha banyere mmekọahụ?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Lev. 15:2, 3, 16, 18, 19; Diut. 31:10-13—N’Iwu Mosis, ihe Jehova kwuru gbasara mmekọahụ doro nnọọ anya. Jehova nyekwara iwu ka ụmụaka nọrọ ya mgbe a na-agụpụta ha
-
Ọma 139:13-16—Ọbụ abụ bụ́ Devid toro Jehova maka otú dị ịtụnanya o si kee ahụ́ mmadụ nakwa otú o si kee anyị ka anyị na-amụ nwa
-
Ilu 2:10-15—Amamihe si n’aka Jehova ga-echebeli anyị ka ndị na-eme ihe ọjọọ na ndị aghụghọ ghara inweta anyị
-
Gịnị mere ndị nne na nna ji kwesị ịna-adọ ụmụ ha aka ná ntị otú gosiri na ha hụrụ ha n’anya?
Ilu 13:24; 29:17; Jere. 30:11; Efe. 6:4
I nwekwara ike ịgụ Ọma 25:8; 145:9; Kọl. 3:21
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ọma 32:1-5—Jehova tara Eze Devid ahụhụ maka mmehie ya, ma obi jụụrụ ya mgbe ọ matara na Jehova na-agbaghara ndị ji obi ha niile chegharịa
-
Jona 4:1-11—Jona ji iwe gwa Jehova okwu, ọ kwanyeghịkwara ya ùgwù. Ma, Jehova weturu obi kụziere ya na ya na-eme ebere
-
Gịnị mere anyị ga-eji kwuo na ndị nne na nna ịdọ ụmụ ha aka ná ntị so n’otú ha si egosi na ha hụrụ ha n’anya?
I nwekwara ike ịgụ Ilu 15:32; Mkpu. 3:19