Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ukwu na Ndị Nkịtị

Ndị Ukwu na Ndị Nkịtị

Chineke ọ̀ na-ewere na ụfọdụ ndị ka ibe ha n’ihi agbụrụ ha, obodo ha, ma ọ bụ otú ha nweruru ego?

Ọrụ 17:26, 27; Rom 3:23-27; Gal. 2:6; 3:28

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jọn 8:31-40​—Ụfọdụ ndị Juu nọ na-etu ọnụ maka na ha bụ ụmụ Ebreham. Ma, Jizọs baara ha mba maka na ha anaghị eme ka Ebreham

Ànyị kwesịrị ịna-eleda ndị ọzọ anya n’ihi agbụrụ ha ma ọ bụ obodo ha?

Jọn 3:16; Rom 2:11

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jona 4:1-11​—Jehova nwere ndidi ma kụziere Jona onye amụma na o kwesịrị imere ndị Ninive ebere, n’agbanyeghị na ha bụ ndị obodo ọzọ

    • Ọrụ 10:1-8, 24-29, 34, 35​—Pita onyeozi mụtara na Chineke na-anabata ndị na-abụghị ndị Juu. N’ihi ya, o nyeere Kọnịliọs na ndị ezinụlọ ya aka ka ha bụrụ ndị mbụ na-abụghị ndị Juu ghọrọ Ndị Kraịst

Ndị Kraịst bara ọgaranya hà kwesịrị iche na ha ka ndị ọzọ ma ọ bụ na-achọ ka a na-emenyere ha?

Ọ bụrụ na mmadụ bụ onye nlekọta n’ọgbakọ, ọ̀ pụtara na onye ahụ ga na-eche na ya ka ndị ọzọ ma ọ bụ jiri aka ike na-emeso ha?

2 Kọr. 1:24; 1 Pita 5:2, 3

Olee ụdị mmadụ Chineke na-anabata?

Ndị Kraịst hà kwesịrị ịgbawa mbọ ka ha gbanwee iwu ndị ọchịchị, ndị ha chere na ha adịghị mma?

Efe. 6:5-9; 1 Tim. 6:1, 2

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jọn 6:14, 15​—N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị chọrọ ka Jizọs kwụsị nsogbu dị n’obodo ha, Jizọs ekweghị ka ha mee ya eze ha