Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndidi

Ndidi

Olee ihe na-egosi na Jehova na-enwe ndidi?

Rom 2:4; 9:22

I nwekwara ike ịgụ Nehe. 9:30

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jere. 7:23-25​—Jehova kwuru otú o si na-enwere ndị ya bụ́ ndị na-enupụrụ ya isi ndidi

    • 2 Pita 3:3-9, 15​—Pita onyeozi kọwara otú Jehova si na-enwe nnọọ ndidi na ihe mere o ji na-enwe ya. O kwukwara na Jehova agaghị na-enwe ndidi ruo mgbe ebighị ebi

Gịnị mere anyị ji kwesị ịmụta ịna-enwe ndidi?

Ilu 25:15; Efe. 4:1-3; 2 Tim. 2:24, 25; 4:2

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 39:19-21; 40:14, 15, 23; 41:1, 9-14​—N’agbanyeghị na e rere Josef ka ọ gbawa ohu, mechaakwa tụọ ya mkpọrọ ọtụtụ afọ n’Ijipt maka ihe ọ na-emeghị, o nwere ndidi ma nwee okwuwe na Chineke

    • Hib. 6:10-15​—Pọl onyeozi ji akụkọ Ebreham kụziere anyị na ọ dị mkpa ka anyị na-enwe ndidi