Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọchịchị

Ọchịchị

Olee ọchịchị ezigbo Ndị Kraịst na-erubere isi ma na-akwado?

Mat. 6:9, 10, 33; 10:7; 24:14

I nwekwara ike ịgụ Dan. 7:13, 14

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọma 89:18-29​—E kwuru ihe ụfọdụ gbasara Eze Bụ́ Mezaya. Jehova mekwara ka ọ bụrụ eze kacha eze ndị ọzọ niile

    • Mkpu. 12:7-12​—Ná mmalite oge ikpeazụ, Eze Bụ́ Mezaya malitere ịchị n’Alaeze Chineke. O sikwa n’eluigwe chụpụ Setan

Olee otú Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’ụwa si anọchite anya Alaeze Chineke?

Ndị Kraịst na-erubere ụmụ mmadụ na-achị achị isi

Gịnị mere anyị ji erube isi n’iwu obodo ma na-atụ ụtụ isi?

Rom 13:1-7; Taị. 3:1; 1 Pita 2:13, 14

I nwekwara ike ịgụ Ọrụ 25:8

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Mat. 22:15-22​—Jizọs ji akọ zaa ajụjụ a jụrụ ya ma ndị na-eso ụzọ ya hà kwesịrị ịna-atụ ụtụ isi

Gịnị mere na anyị anaghị emegwara ndị mejọrọ anyị, ọ bụrụgodị na ha na-akpagbu anyị?

Jọn 18:36; 1 Pita 2:21-23

Gụọkwa isiokwu bụ́ “Mkpagbu

Ndị Kraịst anaghị etinye aka n’ọchịchị ụwa a

Ọ bụ eziokwu na anyị na-akwanyere ndị ọchịchị ùgwù, gịnị mere anyị ji ajụ ime ihe ha kwuru ma ha chọọ ka anyị nupụrụ Chineke isi?

Ọrụ 4:18-20; 5:27-29

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Dan. 3:1, 4-18​—Ụmụ okorobịa atọ bụ́ Ndị Hibru jụrụ irube isi n’iwu ndị Babịlọn nyere maka na irube isi na ya ga-eme ka ha mebie iwu Chineke

    • Dan. 6:6-10​—Mgbe Daniel onye amụma mere agadi, o kweghị erube isi n’iwu ndị ọchịchị nyere ka ọ ghara ikpe ekpere

Olee otú Jizọs si gosi na ndị na-eso ụzọ ya ekwesịghị itinye aka n’ọchịchị ụmụ mmadụ?

Olee otú iwu Chineke nyere anyị ka anyị ghara ikpere arụsị ga-esi nyere Onye Kraịst aka ka ọ ghara itinye aka n’ọchịchị ụwa a?

Ọpụ. 20:4, 5; 1 Kọr. 10:14; 1 Jọn 5:21

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Dan. 3:1, 4-18​—Eze Nebukadneza kpụrụ arụsị ọ ga-abụ na e ji efe chi a na-akpọ Maduk. O nyekwara iwu ka ndị niile ọ na-achị kpọọrọ arụsị ahụ isiala

Olee amaokwu Baịbụl ndị nwere ike inyere Ndị Kraịst aka ịma ihe ha ga-eme ma ndị ọchịchị gwa ha ka ha soro lụọ agha?

Aịza. 2:4; Jọn 18:36

I nwekwara ike ịgụ Ọma 11:5

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Mat. 26:50-52​—Jizọs mere ka o doo anya na ndị na-eso ụzọ ya agaghị na-eso alụ agha

    • Jọn 13:34, 35​—Onye Kraịst nwere ike ịjụ onwe ya, sị, ‘Olee otú o si bụrụ na m na-erube isi n’iwu a Jizọs nyere ma ọ bụrụ na m na-eburu ngwá agha gaa lụso ndị nọ na mba ọzọ agha ma ọ bụ gbuo ha, ndị nwere ike ịbụdị ụmụnna m?’

Gịnị mere na Ndị Kraịst anaghị eso ndị ji ngagharị iwe egosi na ihe ndị ọchịchị na-eme adịghị ha mma?

Gịnị mere na o kwesịghị ịtụ anyị n’anya na a na-ebo anyị ebubo na anyị na-agba ọchịchị mgba okpuru ma ọ bụkwanụ na-eme ka ọgba aghara dị n’obodo?

Luk 23:1, 2; Jọn 15:18-21

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọrụ 16:19-23​—Pọl onyeozi na Saịlas tara ahụhụ n’ihi na ha na-ekwusa ozi ọma