Ọrụ
Gịnị jikọrọ ọrụ na obi ụtọ?
Olee uru ọ bara ịmụta ezigbo aka ọrụ?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
1 Sam. 16:16-23—Ihe e ji mara Devid mgbe ọ na-eto eto bụ ịkpọ ụbọ akwara. Ụbọ a ọ na-akpọ baara eze Izrel uru maka na o mere ka obi jụrụ ya mgbe obi na-ezughị ya ike
-
2 Ihe 2:13, 14—Haịram-ebaị bụ omenkà aka siri ike. N’ihi ya, Eze Solomọn kpọrọ ya ka ọ rụọrọ ya ọrụ mgbe a na-arụ ụlọ nsọ
-
Gịnị mere ndị ohu Jehova ji agba mbọ ịna-arụsi ọrụ ike?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Jen. 24:10-21—Ribeka na-arụsi ọrụ ike, na-enyekwara mmadụ aka. Ọ bụ ya mere o ji meere ohu Ebreham ihe ọ rịọrọ ya, meedị karịa
-
Fil. 2:19-23—Pọl nyere nwa okorobịa bụ́ Timoti ọrụ dị ezigbo mkpa maka na Timoti dị umeala n’obi, dịkwa njikere ịrụsi ọrụ ike
-
Gịnị mere na ndị na-efe Chineke anaghị adị umengwụ?
Ilu 13:4; 18:9; 21:25, 26; Ekli. 10:18
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ilu 6:6-11—Eze Solomọn ji ndanda kụzie gbasara ịrụsi ọrụ ike na izere umengwụ
-
Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-arụsi ọrụ ike iji na-egbo mkpa anyị?
Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-agbasi mbọ ike ịna-egboro ndị ezinụlọ anyị mkpa ha?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Rut 1:16, 17; 2:2, 3, 6, 7, 17, 18—Rut bụ́ nwaanyị di ya nwụrụ rụsiri ọrụ ike iji lekọta nne di ya bụ́ Neomi
-
Mat. 15:4-9—Jizọs katọrọ ndị ji maka na ha na-ejere Chineke ozi jụ ịna-elekọta nne na nna ha
-
Gịnị mere Ndị Kraịst ji kwesị iji ihe ha na-arụta na-enyere ndị ọzọ aka?
Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ego anyị na-arụta n’ọrụ anyị anya?
Olee otú anyị si mara na Jehova chọrọ ka anyị na-arụ ọrụ anyị nke ọma ma na-egbo mkpa anyị?
Mat. 6:25, 30-32; Luk 11:2, 3; 2 Kọr. 9:10
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Jen. 31:3-13—Leban mesiri Jekọb, bụ́ ọgọ ya nwoke nakwa onye na-arụrụ ya ọrụ, ike. Ma, Jehova hụrụ na Jekọb na-arụsi ọrụ ike wee gọzie ya
-
Jen. 39:1-6, 20-23—Jehova gọziri ọrụ Josef na-arụ, ma mgbe ọ na-agba ohu n’ụlọ Pọtịfa ma mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ
-
Gịnị mere na ọrụ anyị ji akpa afọ anyị ekwesịghị ịdị anyị mkpa karịa ofufe Chineke?
Ọma 39:5-7; Mat. 6:33; Jọn 6:27
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Luk 12:15-21—Jizọs mere ihe atụ iji gosi na ndị na-eche na ịrụ ọrụ iji kpata ego dị mkpa karịa ịbịaru Chineke nso bụ ndị nzuzu
-
1 Tim. 6:17-19—Pọl onyeozi gwara ụmụnna ndị bara ọgaranya ka ha ghara ileda ndị ọzọ anya, gbaakwa ha ume ka ha “na-arụ ọtụtụ ọrụ ọma”
-
Olee ihe ndị Baịbụl kwuru ndị ga-enyere anyị aka ikpebi ụdị ọrụ anyị kwesịrị ịrụ?
-
Ọpụ. 20:4; Ọrụ 15:29; Efe. 4:28; Mkpu. 21:8—M rụwa ọrụ a ọ̀ ga-eme ka m mee ihe Chineke kpọrọ asị?
-
Ọpụ. 21:22-24; Aịza. 2:4; 1 Kọr. 6:9, 10; 2 Kọr. 7:1—Ọrụ a ọ̀ na-akwado ihe Chineke kpọrọ asị ma ọ bụ na-eme ka ndị mmadụ na-eme ihe Chineke kpọrọ asị, nke ga-emekwa ka m na-akwado ime ihe Chineke kpọrọ asị?
-
Rom 13:1-7; Taị. 3:1, 2—M rụwa ọrụ a ọ̀ ga-eme ka m mebie iwu obodo?
-
2 Kọr. 6:14-16; Mkpu. 18:2, 4—Ọrụ a ọ̀ ga-eme ka m na-akwado okpukpe ụgha ma ọ bụ sonyere ha?
Ịrụrụ Jehova ọrụ
Olee ọrụ kacha mkpa Ndị Kraịst kwesịrị ịna-arụ?
Gịnị mere ime ike anyị niile n’ozi Jehova ji anụ anyị ọkụ n’obi?
Luk 13:24; Rom 12:11; 1 Kọr. 15:58; Hib. 6:10-12
I nwekwara ike ịgụ 1 Tim. 3:1
Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịna-eji ihe ndị ọzọ na-eme n’ozi Jehova atụnyere ihe anyị na-eme n’ozi ya?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Mat. 25:14, 15—Ihe atụ Jizọs mere na-egosi na ọ naghị atụ anya na ndị niile na-eso ụzọ ya ga na-eme otu ihe n’ozi ya
-
Luk 21:2-4—Jizọs kwuru ihe gosiri na o ji obere onyinye nwaanyị di ya nwụrụ, onye dakwara ogbenye, nyere kpọrọ nnukwu ihe
-
Olee ebe anyị si enweta ike anyị ji arụ ọrụ e nyere anyị n’ozi Jehova?
2 Kọr. 4:7; Efe. 3:20, 21; Fil. 4:13
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
2 Tim. 4:17—Pọl onyeozi kwuru na Chineke nyere ya ike ime ihe mgbe ọ na-adịghị ike
-
Gịnị mere anyị ji enwe obi ụtọ ma anyị na-agbasi mbọ ike n’ozi Jehova?
Ọma 40:8; Jọn 13:17; Jems 1:25
I nwekwara ike ịgụ Mat. 25:23