Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ndị Kraịst Si Ebi Ndụ

Otú Ndị Kraịst Si Ebi Ndụ

Gịnị mere Ndị Kraịst ji kwesị ịna-ebi ndụ otú na-egosi na ha na-efe Chineke?

Ole ndị ka Ndị Kraịst kwesịrị ịna-ebi ndụ otú ha si bie?

Olee uru Ndị Kraịst ịna-ebi ndụ otú Chineke chọrọ nwere ike ịba?

Olee otú amaokwu Baịbụl ndị a nwere ike isi nyere Ndị Kraịst aka ịgbara omume ọjọọ ọsọ?

Ilu 4:23-27; Jems 1:14, 15

I nwekwara ike ịgụ Mat. 5:28; 15:19; Rom 1:26, 27; Efe. 2:2, 3

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 3:1-6​—Iv emerighị ọnwụnwa bịaara ya, kama, o mebiri iwu Chineke

    • Josh. 7:1, 4, 5, 20-25​—Mgbe Ekan nupụụrụ Jehova isi, ọtụtụ ndị tara ahụhụ maka ya

Olee otú amaokwu Baịbụl ndị a nwere ike isi nyere Ndị Kraịst aka ịna-eme ihe dị mma?

Rom 12:2; Efe. 4:22-24; Fil. 4:8; Kọl. 3:9, 10

I nwekwara ike ịgụ Ilu 1:10-19; 2:10-15; 1 Pita 1:14-16

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 39:7-12​—Nwunye Pọtịfa chọrọ ka ya na Josef kwaa iko, ma Josef ekweghị

    • Job 31:1, 9-11​—Job kpebiri na ya agaghị ele nwaanyị na-abụghị nwunye ya anya otú na-ekwesịghị ekwesị

    • Mat. 4:1-11​—Jizọs ekweghị ka Setan nwata ya ime ihe na-adịghị mma

Olee àgwà ndị na-adịghị mma Ndị Kraịst kwesịrị ịgbara ọsọ?

Gụọ isiokwu bụ́ “Àgwà Ndị Na-adịghị Mma

Olee omume ndị na-adịghị mma Ndị Kraịst kwesịrị ịgbara ọsọ?

Gụọ isiokwu bụ́ “Omume Ndị Na-adịghị Mma

Olee àgwà ọma Ndị Kraịst kwesịrị ịna-akpa?

Ndụ dị ọcha

2 Kọr. 11:3; 1 Tim. 4:12; 5:1, 2, 22; 1 Pita 3:1, 2

I nwekwara ike ịgụ Fil. 4:8; Taị. 2:3-5

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 39:4-12​—Josef akwụsịghị ibi ndụ dị ọcha n’agbanyeghị nsogbu nwunye Pọtịfa nọ na-enye ya ka ha kwaa iko

    • Abụ Solo. 4:12; 8:6​—Nwa agbọghọ Shulem ahapụghị onye ọ hụrụ n’anya, ọ chụghịkwa nwoke; ọ dị ka ubi a kpọchiri akpọchi

Ịtụkwasị Jehova obi

Gụọ isiokwu bụ́ “Ịtụkwasị Jehova Obi

Iwere na ndị ọzọ ka anyị

Gụọ isiokwu bụ́ “Ịdị Umeala n’Obi

Ihe mmadụ nwere iju ya afọ

Gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Mmadụ Nwere Iju Ya Afọ

Mmadụ na ndị ọzọ ịna-emekọ ihe

Ekli. 4:9, 10; 1 Kọr. 16:16; Efe. 4:15, 16

I nwekwara ike ịgụ Ọma 110:3; Fil. 1:27, 28; Hib. 13:17

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Ihe 25:1-8​—Eze Devid haziri ka ndị na-abụ abụ na ndị na-eti egwú rụkọọ ọrụ iji hụ na ozi dị nsọ ha na-ejere Jehova na-aga nke ọma

    • Nehe. 3:1, 2, 8, 9, 12; 4:6-8, 14-18, 22, 23; 5:16; 6:15​—Jehova gọziri ndị ya maka otú ha si gbakọọ aka na-ejere ya ozi, n’ihi ya, ha rụchara mgbidi Jeruselem naanị n’ụbọchị iri ise na abụọ

Obi ike

Gụọ isiokwu bụ́ “Obi Ike

Ịgba ndị ọzọ ume; ime ka ndị ọzọ dị ike

Aịza. 35:3, 4; Rom 1:11, 12; Hib. 10:24, 25

I nwekwara ike ịgụ Rom 15:2; 1 Tesa. 5:11

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Sam. 23:15-18​—Jonatan gbara Devid ume maka na Eze Sọl nọ na-achọ igbu ya

    • Ọrụ 15:22-31​—N’oge ndịozi, òtù na-achị isi si n’aka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị zigara ọgbakọ dị iche iche akwụkwọ ozi gbara ha ume

Ntachi obi; ịnọgidesi ike n’ihe; ịkwụsi ike n’ihe

Mat. 24:13; Luk 21:19; 1 Kọr. 15:58; Gal. 6:9; Hib. 10:36

I nwekwara ike ịgụ Rom 12:12; 1 Tim. 4:16; Mkpu. 2:2, 3

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Hib. 12:1-3​—Pọl onyeozi chetaara Ndị Kraịst otú Jizọs si tachie obi ma gbaa ha ume ka ha na-atachi obi ka ya

    • Jems 5:10, 11​—Jems kwuru otú Job si tachie obi nakwa otú Jehova si gọzie ya maka ya

Ikwesị ntụkwasị obi n’ihe niile

Luk 16:10

I nwekwara ike ịgụ Jen. 6:22; Ọpụ. 40:16

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Dan. 1:3-5, 8-20​—Daniel onye amụma na ndị enyi ya atọ jụrụ na ha agaghị eri nri Iwu Mosis kwuru ka a ghara iri

    • Luk 21:1-4​—Jizọs hụrụ na obere onyinye otu nwaanyị isi mkpe nyere gosiri na nwaanyị ahụ nwere ezigbo okwukwe

Ịtụ egwu Jehova

Job 28:28; Ọma 33:8; Ilu 1:7

I nwekwara ike ịgụ Ọma 111:10

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Nehe. 5:14-19​—Gọvanọ Nehemaya na-atụ egwu Jehova, ọ bụ ya mere na o rigbughị ndị Izrel otú ndị bu ya ụzọ bụrụ gọvanọ mere

    • Hib. 5:7, 8​—Jizọs gosiri anyị otú e si atụ egwu Chineke

Mkpụrụ nke mmụọ nsọ

Gụọ isiokwu bụ́ “Mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ

Imesapụ aka

Gụọ isiokwu bụ́ “Imesapụ Aka

Ife Chineke

1 Tim. 6:6; 2 Pita 2:9; 3:11

I nwekwara ike ịgụ 1 Tim. 5:4; 2 Tim. 3:12

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọrụ 10:1-7​—N’agbanyeghị na Kọnịliọs abụghị onye Juu, Jehova hụrụ na o jighị ekpere egwu egwu, na ọ na-efe ya, na-atụ egwu ya, ma na-emesapụ aka

    • 1 Tim. 3:16​—Jizọs gosiri anyị otú kacha mma isi na-efe Chineke

Okwu na-atọ ụtọ, okwu dị mma

Ilu 12:18; 16:24; Kọl. 4:6; Taị. 2:6-8

I nwekwara ike ịgụ Ilu 10:11; 25:11; Kọl. 3:8

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọma 45:2​—E buru amụma na onye ga-abụ Mezaya, ya bụ, onye Jehova họọrọ ka ọ bụrụ Eze, ga na-ekwu okwu dị mma

    • Luk 4:22​—Okwu ọma Jizọs na-ekwu mere ka ihe ya masịwa ndị mmadụ

Ịkwụwa aka ọtọ

Gụọ isiokwu bụ́ “Ịkwụwa Aka Ọtọ

Ile ọbịa

Gụọ isiokwu bụ́ “Ile Ọbịa

Ịdị umeala n’obi; mmadụ ịma ebe ike ya ruru

Gụọ isiokwu bụ́ “Ịdị Umeala n’Obi

Eleghị mmadụ anya n’ihu

Gụọ isiokwu bụ́ “Eleghị Mmadụ Anya n’Ihu”

Ịrụsi ọrụ ike; mmadụ iji obi ya niile eme ihe

Gụọ isiokwu bụ́ “Ọrụ

Irubere Chineke isi

Gụọ isiokwu bụ́ “Irubere Chineke Isi

Ihe gbasara ndị ọzọ ịna-emetụ mmadụ n’obi

Ijisi Chineke aka ike

Gụọ isiokwu bụ́ “Ijisi Chineke Aka Ike

Ebere

Gụọ isiokwu bụ́ “Ebere

Imeru ihe n’ókè

Irube isi

Gụọ isiokwu bụ́ “Irube Isi

Ime ihe n’usoro

Gal. 5:25; 1 Tim. 3:2

I nwekwara ike ịgụ Fil. 3:16

Ikpe ekpere mgbe niile

Ịgbaghara ndị ọzọ

Gụọ isiokwu bụ́ “Ịgbaghara Mmehie

Nkwanye ùgwù

Fil. 2:3, 4; 1 Pita 3:15

I nwekwara ike ịgụ Efe. 5:33; 1 Pita 3:1, 2, 7

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọnụ Ọgụ. 14:1-4, 11​—Mgbe ndị Izrel na-akwanyereghị Mosis na Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Erọn ùgwù, Jehova weere ya na ọ bụ ya ka ha na-akwanyereghị ùgwù

    • Mat. 21:33-41​—Jizọs mere ihe atụ gosiri ihe ga-eme ndị na-anaghị akwanyere ndị amụma Jehova na Ọkpara ya ùgwù

Iji ife Chineke kpọrọ ihe; ibute ihe gbasara ofufe Jehova ụzọ ná ndụ

Mat. 6:33; Rom 8:5; 1 Kọr. 2:14-16

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Hib. 11:8-10​—Ebreham gara bụrụ onye mbịarambịa ná mba ọzọ, birikwa n’ụlọikwuu ebe ahụ n’ihi na obi siri ya ike na Alaeze Chineke ga-abịa

    • Hib. 11:24-27​—Mosis biri ndụ ya ka à ga-asị na ọ na-ahụ Jehova anya

Mmadụ ido onwe ya n’okpuru onye ọzọ

Efe. 5:21; Hib. 13:17

I nwekwara ike ịgụ Jọn 6:38; Efe. 5:22-24; Kọl. 3:18

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Luk 22:40-43​—Jizọs doro onwe ya n’okpuru Nna ya ma mee ihe ọ chọrọ ma mgbe o siiri ya ezigbo ike, si otú ahụ gosi anyị ihe anyị kwesịrị ịna-eme

    • 1 Pita 3:1-6​—Pita onyeozi gwara ndị nwunye bụ́ Ndị Kraịst ka ha na-eme ka Sera n’otú o si doo onwe ya n’okpuru di ya

Obi ebere

Gụọ isiokwu bụ́ “Obi Ebere

Ikwu eziokwu

Gụọ isiokwu bụ́ “Ịkwụwa Aka Ọtọ