Ụkwụ Isi Mmadụ Ike n’Ọgbakọ
Gịnị mere Onye Kraịst ọ bụla ga-eji na-agbasi mbọ ike ka ụkwụ sie ya ike n’ọgbakọ?
Olee otú ịma ihe Baịbụl kwuru ga-esi nyere anyị aka ịbụ Ndị Kraịst ụkwụ siri ike n’ọgbakọ?
Ọ̀ bụ naanị ndị gbagoterela n’afọ ndụ ka ụkwụ ga-esili ike n’ọgbakọ?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Dan. 1:6-20—N’agbanyeghị na Daniel na ndị enyi ya atọ ka na-eto eto, ụkwụ siri ha ike n’ofufe Jehova, ha rubekwaara Jehova isi
-
Ọrụ 16:1-5—Mgbe Timoti dị ihe dị ka afọ iri abụọ, a tụkwasịrị ya obi ma nye ya nnukwu ọrụ n’ọgbakọ
-
Ọ bụrụ na anyị nwere ezigbo ndị enyi n’ọgbakọ, olee uru ọ ga-abara anyị?
Olee ihe na-egosi na ụkwụ siri anyị ike n’ọgbakọ?
Gịnị mere nwanna nwoke ụkwụ siri ike n’ọgbakọ ji kwesị ịdị njikere ịrụ ọrụ n’ọgbakọ?
Olee naanị ihe ga-enyere anyị aka ka anyị bụrụ aka ochie n’izi ozi ọma na ịkụzi ihe nke ọma?
Luk 21:14, 15; 1 Kọr. 2:6, 10-13
I nwekwara ike ịgụ Luk 11:13
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Mat. 10:19, 20—Jizọs kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa na mmụọ nsọ ga-enyere ha aka ịma ihe ha ga-ekwu ma a gbawa ha ajụjụ
-