Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụmụaka; Ndị Na-eto Eto

Ụmụaka; Ndị Na-eto Eto

Otú Chineke si were ụmụaka

Olee otú Jehova si gosi na ya anaghị eji ụmụaka na ndị na-eto eto egwu egwu?

Diut. 6:6, 7; 14:28, 29; Ọma 110:3; 127:3-5; 128:3, 4; Jems 1:27

I nwekwara ike ịgụ Job 29:12; Ọma 27:10; Ilu 17:6

Gụọkwa isiokwu bụ́ “Ezinụlọ

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 1:27, 28​—Jehova chọrọ ka ụmụ mmadụ mụọ ụmụ ma ju n’ụwa

    • Jen. 9:1​—Mgbe iju mmiri ahụ gachara, Chineke gwara Noa na ụmụ ya nwoke ka ha mụọ ụmụ ma ju n’ụwa

    • Jen. 33:5​—Jekọb, bụ́ ohu Jehova n’oge ochie, weere ụmụ ya ka onyinye Chineke nyere ya

    • Mak 10:13-16​—Jizọs hụrụ ụmụaka n’anya otú ahụ Nna ya si hụ ha n’anya

Olee otú obi na-adị Jehova ma ọ hụ ndị na-akpaso ụmụaka àgwà ọjọọ?

Olee ihe Baịbụl kwuru iji gosi na anyị ekwesịghị ịna-atụ anya ka ụmụaka na-akpa àgwà ka ndị okenye?

Ọnụ Ọgụ. 1:3; 1 Kọr. 13:11

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 33:12-14​—Jekọb ji nwayọọ nwayọọ gaa njem otú ọ ga-adịrị ụmụaka ya mfe

Ànyị kwesịrị ịta Chineke ụta mgbe ụmụaka na-ata ahụhụ?

Job 34:10; Jems 1:13; 1 Jọn 5:19

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Luk 5:18, 20, 23-25​—Jizọs mere ka o doo anya na ọ bụ mmehie mere anyị ji arịa ọrịa

    • Rom 5:12​—Pọl onyeozi kwuru ihe mere anyị ji eme mmehie, na-anwụkwa anwụ

Olee otú Jehova si eme ka obi sie anyị ike na ahụhụ niile ma ụmụaka ma ndị katarala ahụ́ na-ata ga-akwụsị?

Ọ bụrụ na ndị mụrụ anyị mere ihe na-adịghị mma ma ọ bụ na ha kpasoro anyị àgwà ọjọọ, ọ̀ pụtara na anyịnwa abaghị uru ma ọ bụkwanụ na anyị ga na-akpakwa àgwà ka ha?

Diut. 24:16; Ezik. 18:1-3, 14-18

I nwekwara ike ịgụ Diut. 30:15, 16

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Eze 18:1-7; 2 Ihe 28:1-4​—Nna Hezekaya abụghị ezigbo mmadụ. O gbukwara ụfọdụ n’ime ụmụ ya, n’agbanyeghị ya, Hezekaya rubeere Jehova isi ma bụrụ ezigbo eze

    • 2 Eze 21:19-26; 22:1, 2​—N’agbanyeghị na nna Josaya aha ya bụ Emọn bụ onye ọjọọ, eze Josaya bụ ezigbo mmadụ

    • 1 Kọr. 10:11, 12​—Pọl onyeozi kwuru na anyị kwesịrị isi n’ihe ndị ọzọ mejọrọ mụta ihe ma kpebie ịna-akpa àgwà ọma

    • Fil. 2:12, 13​—Pọl onyeozi gwara anyị na ọ bụrụ na anyị ana-erubere Chineke isi, a ga-azọpụta anyị

Ọrụ ụmụaka na ndị na-eto eto

Olee otú Jehova si were ụmụaka ha na ndị mụrụ ha na-efe Chineke ka bi?

1 Kọr. 7:14

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Jen. 19:12, 15​—Otu n’ime ihe mere ndị mmụọ ozi ji chebe ụmụ Lọt bụ maka na nna ha na-efe Chineke

Ọ bụrụ na ndị nne na nna na Chineke dị ná mma, ọ̀ pụtara na ụmụ ha na Chineke adịla ná mma?

Ilu 20:11; Ezik. 18:5, 10-13

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Lev. 10:1-3, 8, 9​—Ọ ga-abụ na ihe mere Jehova ji gbuo ụmụ Erọn bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà, bụ maka na mmanya nọ na-egbu ha

    • 1 Sam. 8:1-5​—N’agbanyeghị na Samuel onye amụma na-efe Chineke, ụmụ ya ndị nwoke nọ na-akpa àgwà ọjọọ

Olee ihe ụmụaka ga na-eme ma ha chọọ ịna-eme Chineke obi ụtọ?

Gịnị mere ndị na-eto eto ji kwesị ịna-aga ọmụmụ ihe?

Diut. 31:12, 13; Hib. 10:24, 25

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Mat. 15:32-38​—Ụmụaka so n’ìgwè mmadụ Jizọs gwara okwu

Olee otú anyị si mara na Jehova chọrọ ka ụmụaka fee ya?

Ọma 8:2; 148:12, 13

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Sam. 17:4, 8-10, 41, 42, 45-51​—Mgbe Devid bụ nwata, Jehova ji ya merie nwoke gbara ajọ dimkpa. Jehova si otú ahụ mee ka a ghara ịna-akọcha aha ya

    • 2 Eze 5:1-15​—Jehova ji otu nwatakịrị nwaanyị bụ́ onye Izrel, nyere otu nwoke bụ́ onyeisi ndị agha na-abụghị onye Izrel aka, ya amata gbasara ezi Chineke

    • Mat. 21:15, 16​—Obi tọrọ Jizọs ezigbo ụtọ mgbe ụmụaka kwanyeere ya ùgwù

Olee otú Chineke si were ụmụaka ndị mụrụ ha na-anaghị efe ya?

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

Olee ihe mere ndị na-eto eto ji kwesị ịsa anya na mmiri tupu ha ahọrọ ndị ha na ha ga na-akpa?

Ilu 13:20; 1 Kọr. 15:33

I nwekwara ike ịgụ 2 Tim. 3:1-5

Olee ụdị ndị Onye Kraịst na-eto eto kwesịrị imete enyi?

2 Tim. 2:22

Gụọkwa isiokwu bụ́ “Mkpakọrịta