NKEBI NKE 2
Onye “Na-ahụ Ikpe Ziri Ezi n’Anya”
Ikpe na-ezighị ezi juru ebe nile n’ime ụwa nke taa, a na-atakwa Chineke ụta dị ukwuu n’ụzọ na-ezighị ezi maka ya. Ma, Bible na-akụzi otu eziokwu nke na-akasi obi—na Jehova “na-ahụ [ikpe ziri ezi] n’anya.” (Abụ Ọma 37:28) Ná nkebi a anyị ga-amụta otú o siworo gosipụta na okwu ndị ahụ bụ eziokwu, na-eme ka ihe nile a kpọrọ mmadụ nwee olileanya.
NÁ NKEBI A
ISI NKE 11
“Ụzọ Ya Nile Bụ Ikpe Ziri Ezi”
Gịnị mere ikpe ziri ezi Chineke ji eme ka anyị bịaruo ya nso?
ISI NKE 12
“Chineke Ọ̀ Na-ekpe Ikpe Na-ezighị Ezi?”
Ọ bụrụ na Jehova kpọrọ ikpe na-ezighị ezi asị, gịnị mere ikpe na-ezighị ezi ji ju ebe niile n’ụwa?
ISI NKE 14
Jehova Enye “Ihe Mgbapụta n’Ọnọdụ Ọtụtụ Mmadụ”
Otu ihe dị mkpa Chineke meere anyị ga-eme ka ị bịarukwuo ya nso.
ISI NKE 15
Jizọs ‘Edoo Ikpe Ziri Ezi n’Ụwa’
Olee otú Jizọs si mee ka e kpee ziri ezi n’oge ochie? Olee otú o si eme ya ugbu a? Olee otú ọ ga-esi eme ya n’ọdịnihu?
ISI NKE 16
‘Na-eme Ihe n’Ikpe Ziri Ezi’ n’Iso Chineke Na-eje Ije
Olee ihe mere Jizọs ji sị “Kwụsịnụ ikpe ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe”?