Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ODIDE NTỤKWASỊ

Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị—Ihe Omume nke Na-ewetara Chineke Nsọpụrụ

Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị—Ihe Omume nke Na-ewetara Chineke Nsọpụrụ

E NYERE Ndị Kraịst iwu icheta ọnwụ Kraịst. A na-akpọkwa ihe omume a “nri anyasị nke Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 11:20) Gịnị mere o ji bụrụ nnọọ ihe omume dị mkpa? Olee mgbe e kwesịrị ime ya, oleekwa otú e kwesịrị isi mee ya?

Jizọs Kraịst malitere ihe omume a n’abalị Ememe Ngabiga nke ndị Juu n’afọ 33 O.A. Ememe Ngabiga bụ ememe a na-eme nanị otu ugbo n’afọ, n’ụbọchị nke 14 nke ọnwa ndị Juu bụ́ Naịsan. Iji gbakọta ụbọchị ahụ, ihe àmà na-egosi na ndị Juu na-echere ruo ụbọchị a ga-enwe ihe dị ka awa 12 nke ìhè na awa 12 nke ọchịchịrị n’oge opupu ihe ubi. A na-eji ọnwa ọhụrụ mbụ a pụrụ ịhụ anya, bụ́ nke na-apụta nwa obere oge tupu ụbọchị a, amata mmalite nke Naịsan. Ememe Ngabiga na-ewere ọnọdụ n’ụbọchị nke 14 ka e mesịrị, mgbe anyanwụ dasịrị.

Jizọs na ndịozi ya mere Ememe Ngabiga, ya enye Judas Iskarịọt ohere ịpụ, wee malitezie Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. E ji Nri a dochie anya Ememe Ngabiga ndị Juu, n’ihi ya kwa, e kwesịrị ịdị na-eme ya nanị otu ugbo n’afọ.

Oziọma Matiu na-akọ, sị: “Jizọs weere otu ogbe achịcha, mgbe ọ gọzisịworo ya, ọ nyawara ya, ka ọ na-enye ya ndị na-eso ụzọ ya, ọ sịkwara: ‘Naranụ, rie. Nke a pụtara ahụ́ m.’ Ọzọ, o buuru iko, mgbe o nyesịworo ekele, o bunyekwara ha ya, na-asị: ‘Ṅụọnụ, unu nile; n’ihi na nke a pụtara “ọbara m nke ọgbụgba ndụ ahụ,” bụ́ nke a gaje ịwụpụ n’ihi ọtụtụ mmadụ maka mgbaghara mmehie.’”—Matiu 26:26-28.

Ụfọdụ ndị kweere na Jizọs mere ka achịcha ahụ ghọọ anụ ahụ́ ya nakwa na o mere ka mmanya ahụ ghọọ ọbara ya. Otú ọ dị, anụ ahụ́ Jizọs dịkwa otú ọ dị mgbe o nyere ha achịcha a. Ndịozi Jizọs hà riri anụ ahụ́ ya ma ṅụọ ọbara ya n’ụzọ nkịtị? Ee e, n’ihi na nke ahụ gaara abụ iri anụ mmadụ nakwa imebi iwu Chineke. (Jenesis 9:3, 4; Levitikọs 17:10) Dị ka Luk 22:20 na-egosi, Jizọs kwuru, sị: “Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke na-adabere n’ọbara m, bụ́ nke a gaje ịwụpụ n’ihi unu.” Iko ahụ ọ̀ ghọrọ “ọgbụgba ndụ ọhụrụ” n’ụzọ nkịtị? Nke ahụ agaghị ekwe omume, ebe ọ bụ na ọgbụgba ndụ bụ nkwekọrịta, ọ bụghị ihe a na-ahụ anya.

N’ihi ya, achịcha na mmanya ahụ bụcha nanị ihe nnọchianya. Achịcha ahụ na-anọchi anya ahụ́ zuru okè nke Kraịst. Jizọs jiri ogbe achịcha fọdụrụ mgbe e risịrị Oriri Ngabiga ahụ mee ihe. E tinyeghị ogbe achịcha ahụ ihe na-eko achịcha, ma ọ bụ yist. (Ọpụpụ 12:8) Bible jiri ihe na-eko achịcha mee ihe dị ka ihe na-anọchi anya mmehie ma ọ bụ mmerụ. Ya mere, achịcha ahụ na-anọchi anya ahụ́ zuru okè nke Jizọs chụrụ n’àjà. O nweghị mmehie.—Matiu 16:11, 12; 1 Ndị Kọrint 5:6, 7; 1 Pita 2:22; 1 Jọn 2:1, 2.

Mmanya ahụ na-acha ọbara ọbara na-anọchi anya ọbara Jizọs. Ọbara ahụ mere ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ malite ịdị irè. Jizọs sịrị na a wụsịrị ọbara ya “maka mgbaghara mmehie.” N’ihi ya, ndị mmadụ pụrụ ịdị ọcha n’anya Chineke, ha pụkwara iso Jehova banye n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ. (Ndị Hibru 9:14; 10:16, 17) Ọgbụgba ndụ a, ma ọ bụ nkwekọrịta a, mere ka Ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi dị 144,000 nwee ike ịga eluigwe. Ha ga-eje ozi n’ebe ahụ dị ka ndị eze na ndị nchụàjà iji gọzie ihe a kpọrọ mmadụ.—Jenesis 22:18; Jeremaịa 31:31-33; 1 Pita 2:9; Mkpughe 5:9, 10; 14:1-3.

Ole ndị kwesịrị iri achicha ahụ na ịnụ mmanya ahụ e ji eme ihe n’icheta ọnwụ Jizọs? N’ụzọ ezi uche dị na ya, ọ bụ nanị ndị nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ—ya bụ, ndị nwere olileanya ịga eluigwe—kwesịrị iri achịcha ahụ nakwa ịṅụ mmanya ahụ. Mmụọ nsọ Chineke na-eme ka ndị dị otú ahụ kwenye na a họrọwo ha ịbụ ndị eze n’eluigwe. (Ndị Rom 8:16) Ha na Jizọs banyekwara n’ọgbụgba ndụ Alaeze.—Luk 22:29.

Gịnịkwanụ banyere ndị nwere olileanya nke ibi na Paradaịs elu ala ruo mgbe ebighị ebi? Ha na-erube isi n’iwu Jizọs ma na-anọ ya n’oge Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, ma ha na-aga dị ka ndị ji nkwanye ùgwù na-ekiri ihe a na-eme, ọ bụghị dị ka ndị na-eri ma na-aṅụ ihe nnọchianya ndị ahụ. Otu ugbo n’afọ, mgbe anyanwụ dasịrị na Naịsan 14, Ndịàmà Jehova na-ezukọ maka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Ọ bụ ezie na gburugburu ụwa, ọ bụ nanị puku mmadụ ole na ole n’ime ha na-ekwu na ha nwere olileanya ịga eluigwe, Ndị Kraịst nile na-eji ihe omume a akpọrọ ihe. Ọ bụ oge mmadụ nile pụrụ iji chebara ịhụnanya na-enweghị atụ nke Jehova Chineke na nke Jizọs Kraịst echiche.—Jọn 3:16.