Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ODIDE NTỤKWASỊ

Ònye Bụ Maịkel Onyeisi Ndị Mmụọ Ozi?

Ònye Bụ Maịkel Onyeisi Ndị Mmụọ Ozi?

A KPỌTỤGHỊ mmụọ ahụ e kere eke, bụ́ Maịkel, aha ọtụtụ ugboro n’ime Bible. Otú ọ dị, n’ebe ndị a kpọtụrụ ya aha, ọ nọ nnọọ n’ọrụ. N’akwụkwọ Daniel, Maịkel na-alụso ndị ajọ mmụọ ozi ọgụ; n’akwụkwọ ozi Jud, ya na Setan na-ese okwu; ná Mkpughe kwa, ọ na-alụso Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya agha. Site n’ịgbachitere ọchịchị Jehova na ịlụso ndị iro Chineke ọgụ, Maịkel na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe aha ya pụtara—“Ònye Dị Ka Chineke?” Ma, ònye bụ Maịkel?

Mgbe ụfọdụ, a na-eji ihe karịrị otu aha ama mmadụ. Dị ka ihe atụ, aha ọzọ a na-akpọ nna ochie ahụ bụ́ Jekọb bụ Izrel, aha ọzọ a na-akpọkwa Pita onyeozi bụ Saịmọn. (Jenesis 49:1, 2; Matiu 10:2) N’otu aka ahụ, Bible na-egosi na Maịkel bụ aha ọzọ a na-akpọ Jizọs Kraịst, tupu na mgbe ọ bịasịrị n’ụwa. Ka anyị tụlee ihe ndị Akwụkwọ Nsọ kwuru mere anyị ji ruo ná nkwubi okwu ahụ.

Onye Isi Ndị Mmụọ Ozi. Okwu Chineke kwuru banyere Maịkel “onyeisi ndị mmụọ ozi.” (Jud 9) Rịba ama na a kpọrọ Maịkel onyeisi ndị mmụọ ozi. Nke a na-enye echiche bụ́ na e nwere nanị otu mmụọ ozi dị otú ahụ. N’ezie, n’ebe ọ bụla okwu ahụ pụtara n’ime Bible, ọ na-apụta n’ụdị na-egosi otu onye, bụ́ “onyeisi ndị mmụọ ozi,” ọ bụghị n’ụdị na-egosi ọtụtụ ndị. Ọzọkwa, a na-ezo aka n’ebe Jizọs nọ dị ka onyeisi ndị mmụọ ozi. Banyere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst a kpọlitere n’ọnwụ, 1 Ndị Tesalonaịka 4:16 na-ekwu, sị: “Onyenwe anyị n’onwe ya ga-esite n’eluigwe rịdata na-eji ọkpụkpọ òkù na-ada ụda, na-eji olu onyeisi ndị mmụọ ozi.” N’ụzọ dị otú a, a kọwara olu Jizọs dị ka nke onyeisi ndị mmụọ ozi. Ya mere, akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na-enye echiche bụ́ na Jizọs n’onwe ya bụ onyeisi ndị mmụọ ozi ahụ, bụ́ Maịkel.

Onyeisi Usuu Ndị Agha. Bible na-ekwu na ‘Maịkel na ndị mmụọ ozi ya busoro dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya agha.’ (Mkpughe 12:7) N’ihi ya, Maịkel bụ Onye Ndú nke usuu ndị mmụọ ozi na-ekwesị ntụkwasị obi. Mkpughe na-akọwakwa Jizọs dị ka Onye Ndú nke usuu ndị mmụọ ozi na-ekwesị ntụkwasị obi. (Mkpughe 19:14-16) Pọl onyeozi kwukwara okwu kpọmkwem banyere “Onyenwe anyị Jizọs” na “ndị mmụọ ozi ya dị ike.” (2 Ndị Tesalonaịka 1:7; Matiu 16:27; 24:31; 1 Pita 3:22) Ya mere, Bible kwuru okwu banyere Maịkel na “ndị mmụọ ozi ya” nakwa Jizọs na “ndị mmụọ ozi ya.” (Matiu 13:41) Ebe ọ bụ na ọ dịghị ebe ọ bụla e kwuru n’ime Bible na e nwere usuu ndị mmụọ ozi abụọ na-ekwesị ntụkwasị obi n’eluigwe—otu nke Maịkel bụ onyeisi ya na ọzọ nke Jizọs bụ onyeisi ya—ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwubi na Maịkel abụghị onye ọzọ ma e wezụga Jizọs Kraịst ka ọ nọ n’ọrụ n’eluigwe. *

^ par. 6 Ị ga-enwetakwu ihe ọmụma na-egosi na Maịkel bụ aha Ọkpara Chineke n’Ụlọ Nche nke February 1, 1991, peeji nke 17, paragraf nke 9 na nke 10, bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara.