Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 7

Ịdọ Aka Ná Ntị Site N’ihe Ndị Mere N’oge Gara Aga

Ịdọ Aka Ná Ntị Site N’ihe Ndị Mere N’oge Gara Aga

Jehova agaghị ekwe ka ndị ọjọọ mebie Paradaịs. Ọ bụ nanị ndị enyi ya ga-ebi n’ebe ahụ. Gịnị ga-eme ndị ọjọọ? Iji mata azịza ya, tụlee akụkọ mere eme banyere Noa. Noa biri ndụ ọtụtụ puku afọ gara aga. Ọ bụ ezi mmadụ, onye na-agbalịsi ike ime uche Jehova mgbe nile. Ma ndị nke ọzọ nọ n’ụwa na-eme ihe ọjọọ. Ya mere Jehova gwara Noa na Ya gaje ime ka e nwee iju mmiri iji bibie ndị ajọ omume ahụ nile. Ọ gwara Noa ka o wuo ụgbọ ka ya na ezinụlọ ya wee ghara ịnwụ mgbe Iju Mmiri ahụ bịara.—Jenesis 6:9-18.

Noa na ezinụlọ ya wuru ụgbọ ahụ. Noa dọrọ ndị mmadụ aka ná ntị na Iju Mmiri ahụ na-abịa, ma ha egeghị ya ntị. Ha nọgidere na-eme ihe ọjọọ. Mgbe e wusịrị ụgbọ ahụ, Noa kpọbara ụmụ anụmanụ n’ime ụgbọ ahụ, ya na ezinụlọ ya banyekwara n’ime ya. Mgbe ahụ Jehova mere ka e nwee oké mmiri ozuzo. Mmiri zogidere ruo ụbọchị 40 ehihie na abalị. Mmiri ahụ tochiri ụwa nile.—Jenesis 7:7-12.

Ndị ajọ omume nwụrụ, ma a zọpụtara Noa na ezinụlọ ya. Jehova chebere ha gabiga Iju Mmiri ahụ baa n’ime ụwa nke ajọ omume na-adịghị na ya. (Jenesis 7:22, 23) Bible na-ekwu na oge na-abịa ọzọ mgbe Jehova ga-ebibi ndị jụrụ ime ihe ziri ezi. A gaghị ebibi ndị ezi mmadụ. Ha ga-ebi n’ime ụwa Paradaịs ruo mgbe ebighị ebi.—2 Pita 2:5, 6, 9.

Taa ọtụtụ ndị na-eme ihe ọjọọ. Ụwa jupụtara ná nsogbu. Jehova na-ezipụ Ndịàmà ya ugboro ugboro ịga dọọ ndị mmadụ aka ná ntị, ma ihe ka n’ọnụ ọgụgụ achọghị ige ntị n’ihe Jehova na-ekwu. Ha achọghị ịgbanwe ụzọ ha. Ha achọghị ịnakwere ihe Chineke na-ekwu banyere ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. Gịnị ga-eme ndị a? Ọ̀ dị mgbe ha ga-agbanwe? Ọtụtụ agaghị agbanwe agbanwe. Oge na-abịa mgbe a ga-ebibi ndị ajọ omume, ha agaghị adịkwa ndụ ọzọ.—Abụ Ọma 92:7.

A gaghị ebibi ụwa; a ga-eme ka ọ ghọọ paradaịs. Ndị ghọrọ ndị enyi Chineke ga-adị ndụ n’ime ụwa Paradaịs ruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 37:29.