Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 13

Ime Anwansi na Ịta Amoosu Dị Njọ

Ime Anwansi na Ịta Amoosu Dị Njọ

Setan chọrọ ka ị na-eme anwansi. Ọtụtụ ndị na-achụrụ ndị nna nna ha ma ọ bụ ndị mmụọ àjà iji chebe onwe ha pụọ ná mmerụ ahụ. Ha na-eme nke a n’ihi na ha na-atụ ike nke ndị mmụọ egwu. Ha na-eyi mgbaaka ma ọ bụ ọla aka ndị nwere ike karịrị nke mmadụ. Ha na-aṅụ ma ọ bụ na-ete “ọgwụ” ndị e chere na ha nwere ike karịrị nke mmadụ. N’ebe obibi ha ma ọ bụ n’ime ala, ụfọdụ ndị na-ezochi ihe ndị e kwenyere na ha nwere ike ichebe mmadụ. Ndị ọzọ na-eji “ọgwụ” ndị nwere ike karịrị nke mmadụ eme ihe n’ihi na ha kwenyere na ọ ga-eme ka ha nwee ihe ịga nke ọma n’achụmnta ego, n’ule ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ n’ime mbedo.

Ihe nchebe kasịnụ i nwere megide Setan bụ imeta Jehova enyi. Jehova Chineke na ndị mmụọ ozi ya dị nnọọ ike karịa Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. (Jemes 2:19; Mkpughe 12:9) Jehova nwere oké mmasị iji ike ya mee ihe n’ihi ndị enyi ya—ndị na-eguzosi ike n’ihe nile nye ya.—2 Ihe E Mere 16:9.

Okwu Chineke na-ekwu, sị: “Unu [emela anwansi, NW].” Jehova katọrọ ime anwansi na ịta amoosu n’ihi na omume ndị ahụ pụrụ ime ka Setan bụ́ Ekwensu nwee ike kpọmkwem n’ahụ mmadụ.—Levitikọs 19:26.