Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 1

Chineke Na-Akpọ Gị Òkù Ịghọ Enyi Ya

Chineke Na-Akpọ Gị Òkù Ịghọ Enyi Ya

Chineke chọrọ ka ị bụrụ enyi ya. Ì chetụwo echiche na ị pụrụ ịbụ enyi nke Onye kasị elu n’eluigwe na ala? A kpọrọ Abraham, bụ́ onye biri ndụ ogologo oge gara aga, enyi Chineke. (Jemes 2:23) Ndị ọzọ e kwuru maka ha n’ime Bible bụkwa ndị enyi Chineke, a gọzikwara ha nke ukwuu. Taa, ndị sitere n’akụkụ nile nke ụwa aghọwo ndị enyi Chineke. Gị onwe gị kwa pụrụ ịbụ enyi Chineke.

Ịbụ enyi Chineke dị mma karịa ịbụ enyi mmadụ ọ bụla. O nweghị mgbe Chineke na-emechu ndị enyi ya na-eguzosi ike n’ihe ihu. (Abụ Ọma 18:25) Ịbụ enyi Chineke dị mma karịa inwe akụ̀ na ụba. Mgbe onye bara ọgaranya nwụrụ, ego ya na-agara ndị ọzọ. Otú ọ dị, ndị ha na Chineke bụ enyi nwere akụ̀ nke mmadụ ọ bụla na-apụghị iweghara eweghara.—Matiu 6:19.

Ụfọdụ ndị pụrụ ịnwa ime ka ị kwụsị ịmụ banyere Chineke. Ọbụna ụfọdụ n’ime ndị enyi gị na ndị ezinụlọ gị pụrụ ime nke a. (Matiu 10:36, 37) Ọ bụrụ na ndị ọzọ achịa gị ọchị ma ọ bụ yie gị egwu, jụọ onwe gị sị, ‘Ònye ka m chọrọ ime ihe ga-atọ ya ụtọ—ọ̀ bụ Chineke ka ọ̀ bụ mmadụ?’ Cheedị echiche banyere nke a: Ọ bụrụ na mmadụ agwa gị ka ị kwụsị iri ihe, ị̀ ga-aṅa ya ntị? Ọ dịghị ma ọlị! Ihe oriri dị gị mkpa iji dịrị ndụ. Ma Chineke pụrụ ime ka ị dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi! Ya mere ekwela ka onye ọ bụla mee ka ị kwụsị ịmụ otú ị pụrụ isi bụrụ enyi Chineke.—Jọn 17:3.