Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 18

Bụrụ enyi Chineke ruo mgbe ebighị ebi!

Bụrụ enyi Chineke ruo mgbe ebighị ebi!

Imeta enyi na-achọ mgbalị; ịnọgide na-enwe enyi na-achọkwa mgbalị. A ga-agọzi nnọọ mgbalị ndị ị na-eme iji ghọọ ma nọgide na-abụ enyi Chineke. Jisọs gwara ndị kwere na ya, sị: “Eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.” (Jọn 8:32) Gịnị ka nke ahụ pụtara?

Ị pụrụ inwere onwe gị ugbu a. Ị pụrụ inwere onwe gị pụọ n’ozizi ụgha na ụgha ndị Setan gbasaworo. Ị pụrụ inwere onwe gị pụọ n’enweghị olileanya nke jupụtara ná ndụ nke ọtụtụ nde mmadụ bụ́ ndị na-amaghị Jehova. (Ndị Rom 8:22) Ndị enyi Chineke nweere onwe ha ọbụna pụọ n’ịtụ “egwu ọnwụ.”—Ndị Hibru 2:14, 15.

Ị pụrụ inwere onwe gị n’ime ụwa ọhụrụ Chineke. Lee nnwere onwe magburu onwe ya ị pụrụ inwe n’ọdịnihu! N’ime ụwa Paradaịs, a ga-enwe nnwere onwe pụọ n’agha, ọrịa, na mpụ. Nnwere onwe pụọ n’ịda ogbenye na agụụ. Nnwere onwe pụọ n’ịka nká na ọnwụ. Nnwere onwe pụọ n’egwu, mmegbu, na ikpe na-ezighị ezi. Bible na-ekwu banyere Chineke, sị: “Ị na-asaghe aka Gị, Ị na-ewerekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.”—Abụ Ọma 145:16.

Ndị enyi Chineke ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ndụ ebighị ebi bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa nke Chineke ga-enye ndị nile na-achọ ịbụ enyi ya. (Ndị Rom 6:23) Cheedị echiche ihe ndụ na-enweghị ngwụsị ga-apụtara gị!

Ị ga-enwe oge iji mee ọtụtụ ihe. Ikekwe ị ga-achọ ịmụta otú e si akpọ ngwá egwú. Ma ọ bụ ikekwe ị chọrọ ịmụta otú e si ese ihe ma ọ bụ ịbụ onye ọkwa nkà. I nwere ike chọọ ịmụ banyere ụmụ anụmanụ ma ọ bụ ihe ọkụkụ. Ma ọ bụ ikekwe ị chọrọ ịga hụ ala na ndị dị iche iche. Ịdị ndụ ebighị ebi ga-eme ka ihe ndị a nile kwe omume!

Ị ga-enwe oge imeta ọtụtụ ndị enyi. Ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi ga-eme ka o kwe mee ịmata ọtụtụ ndị ọzọ ghọworo ndị enyi Chineke. Ị ga-abịa mara ikike na àgwà ọma ndị ha nwere, ha ga-abụkwa ndị enyi gị. Ị ga-ahụ ha n’anya, ha ga-ahụkwa gị n’anya. (1 Ndị Kọrint 13:8) Inwe ndụ na-enweghị ngwụsị ga-eme ka i nwee oge imeta onye ọ bụla nọ n’elu ala enyi! Nke ka nke, ọbụbụenyi gị na Jehova ga-esiwanye ike ka ọtụtụ narị afọ na-agafe. Bụrụ enyi Chineke ruo mgbe ebighị ebi!