Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 2

Chineke Bụ Enyi Kasị Mma Ị Pụrụ Inwe

Chineke Bụ Enyi Kasị Mma Ị Pụrụ Inwe

Ịghọ enyi Chineke bụ ihe ọma kasịnụ nke pụrụ imere gị. Chineke ga-akụziri gị ụzọ isi nwee obi ụtọ ma nọrọ ná nchebe; ọ ga-eme ka i nwere onwe gị pụọ n’ọtụtụ nkwenkwe na-ezighị ezi na omume ndị na-emerụ ahụ. Ọ ga-aṅa ntị n’ekpere gị. Ọ ga-enyere gị aka inwe udo nke uche na obi ike. (Abụ Ọma 71:5; 73:28) Chineke ga-enyere gị aka n’oge nsogbu. (Abụ Ọma 18:18) Chineke na-ekwekwa nkwa inye gị onyinye ya nke bụ́ ndụ ebighị ebi.—Ndị Rom 6:23.

Ka ị na-abịaru Chineke nso, ị ga na-abịaru ndị enyi Chineke nso. Ha ga-aghọkwa ndị enyi gị. N’ezie, ha ga-adị gị ka ụmụnne gị ndị nwoke na ndị nwanyị. Ha ga-enwe obi ụtọ ịkụziri gị banyere Chineke, ha ga-enyekwara gị aka ma gbaa gị ume.

Anyị na Chineke ahaghị nhata. Ka ị na-achọ ka gị na Chineke bụrụ enyi, ị ghaghị ịghọta otu eziokwu dị mkpa. Mmadụ na Chineke ịbụ enyi abụghị mmadụ na onye ya na ya ha ịbụ enyi. Ọ tọkachara anyị ahụ, marakwa ihe ma dị nnọọ ike karịa anyị. Ọ bụ Onye Ọchịchị ziri ezi anyị nwere. Ya mere ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ enyi ya, anyị aghaghị ịṅa ya ntị ma mee ihe ọ na-agwa anyị mee. Nke a ga na-arụpụtara anyị ihe ọma mgbe nile.—Aịsaịa 48:18.