IHE ỌMỤMỤ NKE 15
Ndị Enyi Chineke Na-Eme Ihe Dị Mma
Mgbe i nwere enyi ihe ya masịrị gị, onye ị na-akwanyekwara ùgwù, ị na-agbalị ịdị ka ya. Bible na-ekwu na “onye dị mma na onye ziri ezi ka Jehova bụ.” (Abụ Ọma 25:8) Iji bụrụ enyi Chineke, anyị aghaghị ịbụ ndị dị mma na ndị ziri ezi. Bible na-ekwu, sị: “Bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya; na-ejegharịkwanụ n’ịhụnanya.” (Ndị Efesọs 5:1, 2) Lee ụzọ ụfọdụ isi mee nke ahụ:
Na-enyere ndị ọzọ aka. “Ka anyị na-arụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ.”—Ndị Galetia 6:10.
Na-arụsi ọrụ ike. “Ka onye na-ezu ohi ghara izukwa ohi ọzọ: kama ka ọ dọgbuo onwe ya n’ọrụ, na-eji aka ya abụọ rụọ ezi ihe.”—Ndị Efesọs 4:28.
Nọgide na-adị ọcha n’anụ ahụ na n’omume. “Ka anyị sachapụ n’onwe anyị mmerụ nile nke ahụ na nke mmụọ, na-emezu ịdị nsọ n’egwu Chineke.”—2 Ndị Kọrint 7:1.
Hụ ndị ọzọ n’anya. “Ka anyị hụrịta onwe anyị n’anya: n’ihi na ịhụnanya bụ ihe si na Chineke pụta.”—1 Jọn 4:7.
Na-erube isi n’iwu obodo. “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru [gọọmenti] . . . Na-akwụghachinụ mmadụ nile ihe nile unu ji ha n’ụgwọ: tụọnụ ụtụ nye onye unu ji ụgwọ ụtụ.”—Ndị Rom 13:1, 7.