Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 16

Gosi Ịhụnanya I Nwere N’ebe Chineke Nọ

Gosi Ịhụnanya I Nwere N’ebe Chineke Nọ

Iji mee ka mmadụ nọgide na-abụ enyi gị, ọ dị gị mkpa iso ya na-ekwurịta okwu. Ị na-ege ya ntị, ọ na-egekwa gị ntị. Ị na-akọkwara ndị ọzọ ihe ọma banyere enyi gị. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ịbụ enyi Chineke. Tụlee ihe Bible na-ekwu banyere nke a:

Na-agwa Jehova okwu mgbe nile n’ekpere. “N’akụkụ ekpere unu, na-anọgidesinụ ike.”—Ndị Rom 12:12.

Na-agụ Okwu Chineke, bụ́ Bible. “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie.”—2 Timoti 3:16.

Kụziere ndị ọzọ banyere Chineke. “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu.”—Matiu 28:19, 20.

Na-akpa ndị enyi Chineke nso. “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe.”—Ilu 13:20.

Na-aga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. “Ka anyị na-atụgharịtakwa uche n’ahụ ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche; . . . na-adụsi ndị ọzọ ọdụ ike.”—Ndị Hibru 10:24, 25.

Nye aka kwadoo ọrụ Alaeze ahụ. “Ka onye ọ bụla n’etiti unu nye dị ka o buru ụzọ họpụta n’obi ya; ọ bụghị site ná mwute, ma ọ bụ site ná mkpa: n’ihi na Chineke hụrụ onye weere obi ụtọ na-enye n’anya.”—2 Ndị Kọrint 9:7.