Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 3

Ọ Dị Gị Mkpa Ịmụta Banyere Chineke

Ọ Dị Gị Mkpa Ịmụta Banyere Chineke

Iji bụrụ enyi Chineke, ọ dị gị mkpa ịmụta banyere ya. Ndị enyi gị hà maara aha gị ma jiri ya na-eme ihe? Ee. Chineke chọkwara ka ị mara ma jiri aha ya na-eme ihe. Aha Chineke bụ Jehova. (Abụ Ọma 83:18; Matiu 6:9) Ị ghaghịkwa ịmụta ihe ndị na-amasị ya na ihe ndị na-adịghị amasị ya. Ọ dị gị mkpa ịmata ndị bụ́ ndị enyi ya na ndị bụ́ ndị iro ya. Ọ na-ewe oge iji mata mmadụ. Bible na-ekwu na ọ bụ ihe amamihe dị na ya iwepụta oge iji mụọ banyere Jehova.—Ndị Efesọs 5:15, 16.

Ndị enyi Chineke na-eme ihe na-atọ ya ụtọ. Cheedị echiche banyere ndị enyi gị. Ọ bụrụ na i mesoo ha n’ụzọ na-adịghị mma ma mee ihe ndị ha kpọrọ asị, hà ga-anọgide na-abụ ndị enyi gị? Ọ dịghị ma ọlị! N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ enyi Chineke, ọ dị gị mkpa ime ihe na-atọ ya ụtọ.—Jọn 4:24.

Ọ bụghị okpukpe nile na-eduga n’ịbụ enyi Chineke. Jisọs, bụ́ onye kasị bụrụ enyi Chineke, kwuru okwu banyere ụzọ abụọ. Otu ụzọ dị obosara, ndị mmadụ jupụtakwara na ya. Ụzọ ahụ na-eduga ná mbibi. Ụzọ nke ọzọ dị mkpagide, ọ bụkwa mmadụ ole na ole na-agafe na ya. Ụzọ ahụ na-eduga ná ndụ ebighị ebi. Nke a pụtara na ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ enyi Chineke, ị ghaghị ịmụta ụzọ ziri ezi isi na-efe ya ofufe.—Matiu 7:13, 14.