Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 14

Ndị Enyi Chineke Na⁠-⁠Ezere Ihe Dị Njọ

Ndị Enyi Chineke Na⁠-⁠Ezere Ihe Dị Njọ

Setan na-anwa ndị mmadụ ime ihe ndị dị njọ. Ọ dị mkpa ka onye chọrọ ịbụ enyi Chineke kpọọ ihe Jehova kpọrọ asị asị. (Abụ Ọma 97:10) Lee ụfọdụ n’ime ihe ndị enyi Chineke na-ezere:

Mmehie mmekọahụ. “Gị akwala iko.” (Ọpụpụ 20:14) Inwe mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye dịkwa njọ.—1 Ndị Kọrint 6:18.

Ịṅụbiga mmanya ókè. “Ndị na-aṅụbiga mmanya ókè . . . agaghị eketa alaeze Chineke.”—1 Ndị Kọrint 6:10.

Igbu Ọchụ, Isikwopụ Afọ Ime. “Gị egbula mmadụ.”—Ọpụpụ 20:13.

Izu ohi. “Gị ezula ohi.”—Ọpụpụ 20:15.

Ịgha ụgha. Jehova kpọrọ “ire okwu ụgha” asị.—Ilu 6:17.

Ime Ihe Ike na Iwe A Na-achịkwaghị Achịkwa. “Onye na-ahụ ihe ike n’anya ka [Jehova] na-akpọ asị.” (Abụ Ọma 11:5) “Ọrụ nile nke anụ ahụ [gụnyere] . . . ọnụma.”—Ndị Galetia 5:19, 20.

Ịgba Chaa Chaa. ‘Ka unu na onye ọ bụla ghara imekọ ihe bụ́ onye anyaukwu.’—1 Ndị Kọrint 5:11.

Ịkpọasị Agbụrụ na nke Ebo. “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwa ekpere nye ndị na-esogbu unu.”—Matiu 5:43, 44.

Ihe ndị Chineke na-agwa anyị bụ maka ọdịmma anyị. Ọ naghị adị mfe mgbe nile izere ime ihe ọjọọ. Site n’enyemaka Jehova na site n’enyemaka nke Ndịàmà ya, ị pụrụ izere ime ihe ndị na-adịghị amasị Chineke.—Aịsaịa 48:17; Ndị Filipaị 4:13; Ndị Hibru 10:24, 25.